Nnamdi Kanu: Ndị DSS gbara isi akwara na ọ gaghị agbanwe uwe ya - Ifeanyi Ejiofor

Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor

Ọkaiwu Nnamdi Kanu etiela mkpu ọzọ na-akọrọ ụwa na ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa, bụ 'Department of State Services' ekweghị na Kanu ga-agbanwa uwe ya.

Ejiofor kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Tọzde, dịka ha gachara leta Kanu ebe ọ nọ n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS n'ụbọchị Tọzde, abali iri nke Febrụwarị 2022.

Cheta na Ọkaikpe Binta Nyako nyere ndị DSS iwu ka ha gbanweere Nnamdi Kanu uwe ya dịka ọ na-eyi otu uwe kamgbe a nwụchiri ya n'ọnwa June afọ 2021.

Mana Ejiofor kwuru na oge ha gara inye Nnamdi Kanu uwe ọhụrụ, ndị DSS ekweghị.

"Ndị DSS agwaghị anyị ihe mere ha jiri jụ uwe ọhụrụ anyị chịtara ka Nnamdi Kanu ji gbaanwee uwe ya," Ejiofor kwuru.

"Ụdị ihe a emeela ugboro ugboro ugbua."

"Anyị kwụdosiri ike ma kwuo na DSS ga-eruberịrị isi n'iwu ụlọikpe nyere, nke a mere anyị ji chọọ onyeisi ngalaba okwu ahụ gbasara ka anyị mee mkpesa anyị."

"Mana onye ndu (Nnamdi Kanu) dụrụ anyị ndụmọdụ ka anyị hapụ ya, kama ka anyị kwulite ya n'ebe o kwesịrị ma kwuo hoohaa na mkpebi ụlọikpe nyere ndị DSS ejighi ya kpọrọ ihe."

Ihe ndị ọzọ anyị na Nnamdi Kanu kpara

Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya

Ifeanyi Ejiofor gara n'ihu kwuo na ọ gbakwara ha gharịị etu ndị DSS si ahapụ ụfọdụ ndị mmadụ ka ha gaa hụ Nnamdi Kanu, n'agbanyeghị na ụlọikpe enyeghị ha ikike ime nke a.

O kwuru na Nnamdi Kanu gwara ha ka ha welitekwa okwu a n'ụlọikpe maka na ọ bụ inupu isi n'iwu ụlọikpe nyere.

Lee ihe ndị ọzọ Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya kpara, dịka Ifeanyi Ejiofor si depụta ya:

  • Etu ikpe nke na-abịa n'ụbọchị 16 nke Febrụwarị ga-esi gaa nke ọma
  • Etu ikpe nke ọzọ gbasatara ọtụtụ ndị ntorobịa Igbo bụ ndị e ji eji n'ụlọ mkpọrọ dị icheiche, ndị a na-akpụpụtabeghị n'ụlọikpe
  • Nnamdi Kanu gwara ndị nkwado ya ka obi sie ha ike, ka ha kwudosie ike ma ghapụ ịda mba
  • Kanu gwakwara ndị nkwado ya ka ghara ikwe ka ndị iro mesasịa ha uche, dịka ọtụtụ ndị iro na-abịakwute ha dịka ndị enyi
  • Kanu gwakwara ndị na-eso ya ka ha bụrụ ndị udo, ma na-ekpesi ekpere ike n'ihi na mmeri erutewela nso

"Onye ndu dị nnọọ nkwadebe maka ikpe nke ụbọchị iri na isii nke ọnwa Febrụwarị. Ụnụ ga-ahụ ya na ndụ na ume," Ejiofor kwuru.

Etu ikpe Nnamdi Kanu si aga

Nnamdi Kanu n'ụlọikpe
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu n'ụlọikpe

Cheta na ikpe Nnamdi Kanu malitere n'afọ 2015 oge gọọmentị Naịjirịa nwụchiburu ya ma bo ya ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịchọ ịkwatu ọchịchị Naịjirịa.

N'oge ahụ e nwekwara mmadụ anọ ndị ọzọ a kpụpụrụ ha na Nnamdi Kanu ụlọikpe, aha ha bụ Bright Chimezie, Chidiebere Onwudike, Benjamin Maduagwu and David Nwaurusi.

N'afọ 2017, ụlọikpe tọhapụrụ Nnamdi Kanu na ndị otu ya ka ha si n'ụlọ na-abịa ụlọikpe.

Mana ka ọnwa olemole gachara, ndị agha Naịjirịa wakporo ụlọ Mazi Kanu dị n'Umuahia, Abia steeti, nke mere ka ọ gbaa ọsọ gbaga ebe onweghị onye ma.

N'afọ 2018, a hụrụ Mazi Kanu na mba Israel ebe ọ na-ekpe ekpere n'obodo Jerusalem.

Ọ malitekwara gbasawa ozi n'ụlọọrụ mgbasaozi ya bụ 'Radio Biafra', ma na-akpọ oku ka Naịjirịa kewaa.

N'ọnwa June 2020, akụkọ pụtara na a nwụchiela Kanu ọzọ na mba Kenya.

E mechara kpụlata ya Naịjirịa ma kpụgakwa ya ụlọikpe ebe gọọmentị Naịjirịa nọrọ tinyekwuo ebubo ndị ọzọ n'elu ebubo ha boburu Kanu n'afọ 2015.

Ọ bụ ikpe ahụ na-aga n'ihu ugbua n'ihu Ọkaikpe Binta Nyako n'Abuja.

Ikpe nke ndị otu Kanu mmadụ anọ ndị ọzọ ahụ ka na-agakwa n'ihu n'ụlọikpe dị n'Abuja.