Nnamdi Kanu update: Ihe ndị Nnamdi Kanu gwara m gwa ndị na-eso ya dịka m gara zute ya na Dec 30 - Ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor

Ifeanyi Ejiofor

Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor agbaala ama na obi adịghị onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu mma n'ihi tigbuo zọgbuo na-akpọtụ n'ala Igbo.

N'ozi o wepụtara dịka ọ gachara hụ Kanu ụbọchị Tọzde, abalị 30 nke ọnwa Disemba afọ 2021, o kwuru na Kanu rịọrọ ndị na-eso ya ka ha chọọ udo ma na-eme ihe iwu kwuru, ghara inye otu udo ha aha ọjọọ.

O kwuru na Kanu rụtụrụ aka ihe mere n'Imo steeti na nsonso a, na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị omekome ka aka ha dị n'ihe na-akpọtụ n'ala Igbo, ma kwuo na ya abụọla ndị na-eme ihe ndị a ọnụ.

"Obi adịghị Onyendu mma maka mkpamkpa otu ndị omekome na-akpa n'ala nna anyị."

"Ndị otu ọjọọ bụ ndị arụrụala chọrọ inye otu udo anyị aha ọjọọ.

"O nwere ndị otu ọjọọ na-arụrụ ọrụ. Onyendu kwuru na ya abụọla ha ọnụ."

Ejiofor kwukwara na Kanu dọrọ ndị otu ya aka na ntị ka ha kwụsị ịgbasa akụkọ ụgha.

"Ha esila n'ịgbasa akụkọ ụgha, na-abanyere ndị iro aja n'ukwu."

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya

O kwuru na ọ "hụrụ etu akụkọ ụgha a ma ama agbasa si edughie ndị amaghị, wee na-ebute ọgbaghara."

O kwuru na Kanu gara n'ihu kelee ndị na-eso ya maka nkwado ha na-enye ya ma kwuo na afọ ọhụrụ ga-eweta ihe ọma.

Cheta na nsonso a Ejofor gara zute Kanu, okwu ebubo na ndị DSS na-emekpa Nnamdi Kanu, na agụgọ ndị uweojii nzuzo bụ isi okwu.

DSS na-agọ na ha anaghị emekpa Nnamdi Kanu ahụ nke Ejiofor kwuru na ọ bụ okwu bụ meremere n'ihu, gwọmpịtị n'azụ.

Ejiofor kwuru na ewezuga ndị ọkaiwu ya na ndị garala hụ ya, na ndị DSS anaghị ekwe Kanu hụ mmadụ.

Ejiofor kwuru na ha anaghị ekwe ka o nwee mgbanwe akwa.

Nke a bụ n'agbanyeghị na ọnụ na-ekwuru ndị DSS bụ Peter Afunanya kwuru na Kanu enweghị mmekpa ahụ ọbụla na mkpọrọ ha, na ọ na-agbanwe akwa ya kwa ụbọchị.

O kwuru na "nnukwu ụkọchukwu Bishop Sunday Onuoha ga-agba akaebe na ugboro abụọ ọ bịara hụ Nnamdi Kanu n'ogige DSS, ọ bụ otu akwa o yi kemgbe ọnwa Juun ka ọ ka yi ruo taa."

Ọ bụ naanị akwa Fendi o yi mgbe a tọọrọ ya na Kenya bụ akwa o yiri bịa n'ụlọikpe, nke ọha ndị mmadụ ga-agba akaebe nke a n'agbanyeghị arịrịọ niile anyị rịọla ndị ọdị n'aka."

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu Umahia: Etu ikpe ya si ga n'ụlọikpe taa