2021 Prophecies: Ndị mere na ndị emeghị n'amụma Mbaka, Adeboye na ndị ụkọchukwu ndị ọzọ

Ebe foto si, AMEN,Ayodele,RCCG
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
Na mbido afọ, ọtụtụ ndị ụkọchukwu na ndị amuma a na-anụ aha ha kwụpụtara ihe ha sị Chineke gwara ha ga-eme n'afọ 2021.
Dịka afọ 2021 na-apịakọ ọnụ, anyị lere anya n'ihe ụfọdụ ha kwuru ga-eme iji mata ndị mezuru na ndị bụ okwu e jiri mejuo okwu.
Lee ụfọdụ n'ime ha ma were ire gị gụọ eze gị ọnụ:
Amụma Fada Ejike Mbaka

Ebe foto si, Fada Mbaka Facebook Page
N'ozi afọ ọhụrụ na mbido afọ, Ụkọchukwu Ụka Katọlik a ma ama bụ Fada Ejike Mbaka kwuru na ala Naijiria ga-aba n' ihe isi ike kacha n'afọ 2021.
Nke bụ eziokwu: E jighị igbo agwa ya onye ọcha n'ụdị ihe isi ike ụmụ Naijiria gabigara n'afọ 2021 dịka ọnụahịa ihe rịrị n'elu ọjị.
N'okwu Coronavirus, Fada Mbaka buuru amụma na coronavirus ga-ala n'afọ 2021. Dịka o siri kwuo, n'ụka afọ ọhụrụ, Mbaka sịrị, "A ga-esite n'afọ coronavirus juru ga n'afọ a zachapụrụ coronavirus."
Nke bụ eziokwu: Nke e mezughị . Kama mzachapụ coronavirus, nje Omicron bụ ụdị nje coronavirus a hụbeghị mbụ ma na-akpa ike karịa nke mbụ pụtara .
Amuma Pastọ Enoch Adeboye :

Ebe foto si, Screen Grab
"Ka ọgwụ mgbochi covid-19 na-apụta, ka ụdị nje ka njọ na-apụta"
N'amụma o buru n'emume ịbanye afọ ọhụrụ, onyeisi ụlọụka Redeemed Christian Church of God bụ Pastọ Adeboye kwuru na ọrịa covid-19 agaghị ala fịam dịka ndị sayensi na-ekwe nakwa na ọgwụ mgbochi ga-ekpocha ya..
Ọ sịrị, " Ka a na-ewepụta ọgwụ mgbọchị maka covid-19, ka ụdị nje covid-19 ọzọ na-agbakapụta"
Oge Adeboye kwuru na ọnọdụ ahụ ga-adị otua " ruo oge onye ọbụla ga-enweta na nchekwa si n'aka Chineke."
Nke bụ eziokwu: Oge Adeboye wepụtara ozi a n'onwa Jenụwarị, ọgwụ mgbọchị covid-19 nje Omicron nke na-eyi mpaghara ụwa dị iche iche egwu apụtabeghị.
Amụma Primate Elijah Ayodele

Ebe foto si, Primate Elijah Ayodele Facebook
Primate Babatunde Elijah Ayodele nke ụka Inri Evangelical Spiritual Church so na ndị ụkọchukwu a ma ama na Naijiria so na ndị wepụtara mgbaama ihe ndị o kwuru ga-eme n' afọ 2021.
N' ọnwa Disemba afọ 2020, Primate Ayodele kwuru na na-agbanyeghị ọgwụ mgbochi coronavirus, na ọrịa ahụ ga-aga n'ihu na akpa ike n'Afrika, Yurop nakwa Amerịka.
Nke bụ eziokwu: Na-agbanyeghị na e nweela ọgwụ mgbochi ọrịa malite n'ọnwa Maachị afọ 2021, ọrịa coronavirus nke nọ n'agba nke anọ ya n'ọtụtụ mba ka na-akpa ike.
Ayodele kwuru na "Ụlọakụ ụfọdụ ga-ada" n'ihi ihe isi ike.
Nke bụ eziokwu: O nweghị ụlọakụ dara n'afọ 2021 o were anya.
Mwakpo ụgbọala nsonso Gọvanọ
Primate Ayodele mara amụma na n'afọ 2021, na a ga-awakpo ụgbọala nsonso onye gọvanọ, ebe a ga-agbali igbu onye gọvanọ.
Nke bụ eziokwu: N'ọnwa Ọktọba afọ 2021, ndị omekome a na-eche na ha bụ ndị Boko Haram wakporo ụgbọala nsonso gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum. Dịka akwụkwọ akụkọ siri kwuo, ndị agha na ndị omekome ahụ wụrụ mgbọ ihe ruru otu awa. Nke a bụ ugboro abụọ a na-awakpo Zulum bụ onye a wakpoburu n'afọ 2020.
Amụma Pastọ Ebonyi

Ebe foto si, Apostle Theophilus Ebonyi Facebook
" A ga- enwe mweghara ọchịchị na emeghi ntuliaka, onye nke abụọ ga-abụ onye mbu"
N'ọnwa Jenụwarị afọ 2021, ụkọchukwu ụka Faith on the Rock Ministry International bụ Apostle Theophilus Ebonyi, gwara ndị ntaakụkọ na Nasarawa steeti na 'a ga-enwe mgbanwe ọchịchị na-enweghị ntuliaka ọbụla, na onye nke abụọ ga-abụ onye nke mbụ."
"Chukwu gosiri m oge m nọ n'ekpere na Naijiria ga-enwe mgbanwe etu ihe si aga na onye nke abụọ ga-abụ onye nke mbụ dịka onyenweanyị si kwuo."
Nke bụ eziokwu: Onyeisala Muhammadu Buhari ka bụ onyeisiala, Osote ya bụ Yemi Osinbajo ka bụ onye nke abụọ. E nweghị mgbanwe ọbụla n'ọchịchị.
Amụma Apọstụl Paul Okikijesu

Ebe foto si, Paul Okikijesu/Facebook
Apostle Paul Okikijesu, ụkọchukwu na-edu ụka 'Christ Apostolic Miracle Ministry' buru amụma na mbido afọ 2021 na "Onye gọvanọ nwoke ga-anwụ, ebe osote ya bụ nwaanyị ga-eweghara ọchịchị dịka gọvanọ dịka o siri mee n'oge Jonathan na Ya'Adua."
Nke bụ Eziokwu: Ogun, Kaduna, Rivas na Enugwu Steeti bụ steeti nwere nwaanyị dịka Osote gọvanọ.
O nweghị gọvanọ na-achị steeti ọbụla nwụrụ ma ya fọdụ osote ya nwaanyị iweghara ọchịchị.
Amụma Johnson Suleiman

Ebe foto si, Johnson Suleiman-Facebook
Apọstụl Johnson Suleman bụ ụkọchukwu na-edu ụka Omega Fire Ministries International, dị n' Auchi, Edo Steeti.
N'amụma o buru n' abalị Disemba 30, afọ 2020 maka 2021, Apọstụl Suleman kwuru na Chukwu gwara ya na Osote Onyeisiala bụ Yemi Osibanjo ga-abụ onyeisiala.
" Onyenwe m gwara m, m nụ ya na ntị na 'Onye nke abụọ ga-abụ onye nke mbụ'."
Suleiman gara n'ihu buo amụma na Naijiria ga-ama jiji mana ọgaghị ekewa, nke a na-enwe agha.
Nke bụ eziokwu: Buhari ka bụ onyeisiala, Osinbajo kabụkwa osote ya.
E nwere ngagharịiwe na tigbuo-zogbuo ndị na-achọ nnwere onwe, mana Naijiria ekewaghị nke a na-enwe agha.








