Uche Nwosu: Ebumnobi ndị nwụchiri m bụ igbu m

Uche Nwosu

Ebe foto si, Facebook/Nwosu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Uche Nwosu onye zọrọ ọkwa Gọvanọ Imo steei n'afọ 2019 ataala ụkwa jara ọha eze maka ihe ọ gabigara n'aka ndị nwụchịrị ya n'ụbọchị 26 Disemba, 2021.

Maazị Nwosu gwara ndị ntaakụkọ n'Imo steeti taa bụ ụbọchị 28 Disemba etu ihe a mere si malite.

Ka o si kwuo, o kwuru na dịka ọ nọ n'ụlọ ụka enye ekele maka etu akwamozu nne ya n'ụbọchị 22 nke Disemba si gaa, ndị dị ka ndị nchekwa amaghi ndị ha bụ bịara nwụchịe ya.

Lee ihe 10 dị mkpa o kwuru maka mwụchị ya

1. Maazị Nwosu kwuru na ndị wụchịrị ya kpuchiri ihu, kwukwa na ha eyighi uwe ndị agha maọbụ nke ndị uweojii. O kwukwara na ha egosighi njirimara ndị nchekwa ọbụla dịka ha bịara nwụchịe ya.

2. Maazị Nwosu kwuru na ndị ahụ gbara egbe n'ihu ụka ahụ nke kpalitere ọgbaghara ma mee ka ụka a na-aka gbasaa n'ike dịka ndị mmadụ malitere gbawa ọsọ aghara aghara. O kwukwara na ndị ahụ ekweghi zaa ihe ọ mere tupu a kpụgaa ya n'ime ụgbọala ha n'ike, si ya dịnara ala ma tụọ ya egbe n'ihu.

3. O kwuru na ndị nchekwa nke ya gbara ama na ụgbọala ndị ahụ bu bịa bụ nke si na obi gọọmentị Imo steeti nke mere o ji si na ndị ahụ si obi gọọmentị Imo steeti bịa.

4. Ozi ya kwuru na ndị ahụ kere ịgaaka, gwaa ya yipu akwa ya mgbe ha ruru Enugu steeti ebe ha sere ya foto ya dịka oyi naani ọbante ma zigara otu onye o si na ya na ha na-akpa n'ekwentị nke o kwuru na aha ya bụ "Shaba".

5. O kwuru na ndị ahụ ma ụma menye ya ihere; dịka akpụgara ya ọdọ ụgbọelu nke Enugu steeti ebe ha nọrọ otu awa tupu akpụrụ ya dịka oyi naani ọbante gawa Abuja.

Aha onyonyo, Ihe mere Uche Nwosu taa - Rochas Okorocha

6. O kwuru na mgbe ha ruru Abuja, ọ bụ mgbe ahụ ka onyeisi ndị uweojii bụ Usman Alkali Baba ji tinye aka n'okwu ahụ ma kwụsị atụmatụ ndị ahụ nwụchịrị ya.

7. Ozi ya kwuru na n'uche ya, na ebumnobi ndị nwụchịrị ya bụ igbu ya nke mere ha ji kpasa ya agwa etu e si kpasa ya nke gụnyere igba egbe aghara aghara n'ime ụlọụka ebe ndị nkiti na-ejighi ngwa agha nọ

8. Maazị Nwosu kwuru na ndị ahụ tụrụ asi n'ihu onyeisi ndị uweojii kwuo na ha kpọrọ ya oku ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ebubo ha na-ebo ya ugboro atọ mana ọ zaghị. Ozi ya kwuru na enweghi mgbe ndị uweojii maọbụ ndị nchekwa ọbụla ji kpọọ yua

9. Ozi ya kwuru na ọ bụ mgbe ha ruru Abuja ka ndị ahụ ji malite bowa ya ebubo so ihe onyonyo na-efeghari na soshal midia nke kwuru na ya bụ Maazị Nwosu na-akpa nkata ọgbaghara na-ada n'Imo steeti dịka ọ na-eresi ndị omekome egbe na ngwa agha

10. Ozi ya kwuru na usoro na etu e si nwụchịe ya ezighi ezi mancha ma megidi iwu ala Naijịrịa nke mere o ga eji chere ka mpụtara nnyocha onyeisi ndị uweojii Naijịrịa gachaa tupu ọ mara ma ọ ga eburu ikpe ihe mere gaa ụlọikpe.

Aha onyonyo, Uche Nwosu ekwuputala ndụmọdụ o nyere Hope Uzodinma maka ọchịchị

Etu e si nwụchị Uche Nwosu egosila na aka anyị dị ọcha - Ipob

Getty Images/Uche Nwosu

Ebe foto si, Getty Images/Uche Nwosu

Ndị otu Indigenous People of Biafra akatọla ihe ha kpọrọ ntọrọ Uche Nwosu n'ụlọụka n'ụbọchị December 26, 2021.

Ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful depụtara n'akwụkwọ ozi o ziputere taa bụ December 27, na etu e si nwụchi Nwosu gosiri na aka ndị otu ha dị ọcha maka ebubo mwakpo nakwa ịtọrọ mmadụ na-eme n'Imo steeti gọọmenti Hope Uzodimma na-ebo ha.

Powerful kwuru na ewezuga etu ndị bee Uche Nwosu si sochie nwuchi ya, "akarị boo ya otu Ipob nakwa Esn."

"Ọ gaghị eju m anya maọbụrụ na gọvanọ Hope Uzodimma tụọ Rochas Okorocha chiburu Imo steeti nakwa ọgọ ya nwoke , Nwosu na ọ bụ ha na-akwado Ipob na Esn."dịka Powerful si depụta.

"A na m ekwusi ya ike na onweghị onye nwerike ịkwado Ipob makana anyị bụ ngalaba ama ama na mba ụwa niile, o nweghị ihe anyị ji ego ndị ndọrọndọrọ ọchịchị aka ha dị na mpụ na aghụghọ.

Etu ndị bee Uche Nwosu si nabata ya ka o sicha n'aka ndị uweojii pụta

Uche Nwosu

Ebe foto si, Screen Grab

Onyonyo gosiri ebe ndị bee Uche Nwosu(Zọrọ ọkwa gọvanọ n'okpuru pati Action Alliance) ji oke ọṅụ nabata ya dịka o si na nwụchị ndị uweojii nwụchịrị ya ụbọchị Sọnde, December 26, 2021.

N'ime onyonyo ahụ, Rochas Okorocha bụbụ aka chiburu Imo steeti nakwa nwunye ya bụ Nkechi Okorocha nakwa ọtụtụ mmadụ na-agụ egwu ọṅụ iji nabata Uche Nwosu.

Ebe ụfọdụ nọ na soshal midia na-egosi obi ụtọ ha maka etu Uche Nwosu jiri si n'aka ndị uweojii pụta, ụfọdụ na-ewe iwe ma na-ekwu na ọ bụ makana Nwosu bụ nnukwu mmadụ mere e ji tọghapụ ya ọsịsọ.

Akụkọ pụtara na-atọrọ Uche Nwosu ụnyahụ bụ December 26,2021 n'ụlọụka St. Peter's Anglican church Nkwerre dị n'Imo steeti mana ndị uweojii pụtakwara ozigbo ahụ kwuo na ọ bụ ha nwụchiri Nwosu.

Ha ekweghị ekwu ihe mere ha ji nwụchie ya.

Uche Nwosu

Ebe foto si, Screen Grab

Ụka Anglịkan dị n'Owerri agbarụọla ihu

Isi ụlọ Anglịcan dị n'Owerri Imo steeti ekwuola na ha na ndị uweojii ga-enwe mparịtaụka ka ha mata ihe mere ha ji bia merụọ ụlọụka St Peter's Anglican Church, Eziama Obieri ebe ha na-achọ ịṅwụchi Uche Nwosu.

Ha kwuru na agwa ahụ jọgbụrụ onwe ya bụ nke ha anabataghị.

"Anyị amaghị maka ntọghapụ Uche Nwosu"- Uweojii Imo Steeti

Ndị uweojii nọ n'Imo steeti gwara BBC Igbo n'ekwenti ụnayahụ bụ December 27,2021 na ha amaghị maka akụkọ na-efegharịnụ na-atọghapụla Uche Nwosu ha nwụchiri ụnyahụ bụ Sọnde dịka ọ na-aka ụka ekele akwamozu nne ya.

Mike Abbatam bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti kwuru na ihe ọ madebere bụ na ha nwụchịrị Uche Nwosu na December 26, 2021.

Mana ọnụ na-ekwuru Rochas Okorocha bụ Ebere Nzewuji gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na atọghapụla Nwosu n'abalị Sọnde ahụ anwụchiri ya.

Ihe gọọmentị Imo steeti kwuru maka nwuchi Uche Nwosu

Góvanó hope Uzodimma

Ebe foto si, Imo State new media/Screenshot

Gọọmentị Imo steeti apụtala kwuo okwu gbasara ihe mere nwuchi anwụchiri Uche Nwosu.

Ha sị na ọ bụ Abuja ka iwu ịnwụchi Nwosu si bịa ma kwuo na o nweghi onye nwereike ịgwa ndị uweojii etu ha ga-esi rụ orụ ha.

Aha onyonyo, Ihe mere Uche Nwosu taa - Rochas Okorocha

O kwuru na gọọmentị ya anụla okwu nile Okorocha kwuru gbasara ihe mere taa ma kwuo na o gosiri na Okorocha nọ na gbagharịa.

"Omume Rochas Okorocha mere n'okwu Uche Nwosu gosiri na ikpe mara ya, ewezuga ya, gịnị mere o ji eti mkpu?"

Ọ bụ ihe mwute na Okorocha na-ekwu ihe ọjọo dị icheiche megide Uzodimma.

Na mbụ ha bu ụzọ kesaa akụkọ na ọ bụ ndị omekome tooro Uche Nwosu ma tụgharịa kwuo na aka gọọmentị Imo steeti dị na ya.

"Ọ bụrụ na ọ bụ n'obodo ebe ihe na-aga nke ọma, Okorocha ekwesighi ị nwere onwe ya na-agagharị" ka ọ gara n'ihu kwuo.

Gee ihe o kwuru n'uju

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Uche Nwosu

Ebe foto si, Facebook/Nwosu

Rochas Okorocha bụ aka chiburu Imo steeti ekwuola na ọ bụ ndị uweojii nọ n'ụlọọrụ gọọmenti Imo steeti bia kpụrụ Uche Nwosu n'ike mgbe ọ na-aka ụka ekele akwamozu nne ya na St. Peter's Anglican church Nkwerre ụbọchị Sọnde , December 26, 2021.

Okorocha gwara BBC Igbo na nwunye ya nọ n'ụlọụka ahụ mgbe ndị uweojii o kwuru kpuchiri ihu ha wuchiri gbaliwe egbe elu, nke mere ka ndị mmadụ gbawa ọsọ.

O kwuru na mgbe o nwetere ozi a na ọ gbaliri ịnụta n'ọnụ onyeisi ndị uweojii, ọnụ na-ekwuru gọọmenti Imo steeti mana ekwenti ha agabeghị.

Okorocha kwuru na o doro ya anya na nwuchi a bụ nke gbadoro ụkwụ na ndọrọndọrọ ọchịchị.

O kwuru na ihe mere ndị uweojii na-echekwa Nwosu ejighị mee ihe ọbụla mgbe a na-anwụchị ya n'ike bụ na ha enweghị ike ibuso ndị uweojii gọọmenti agha.

N'ọnụ ya, "ihe anyị chọrọ ugbua bụ imata ebe akpọgara Nwosu nakwa ọ dị ndụ."

Uche Nwosu ji ọkọlọtọ Alliance Action zọọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti n'afọ 2019 mabụrụkwa ọgọ nwoke Rochas Okorocha.

Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta n'aka gọọmenti Imo steeti kpụrụ n'ala dịka ọnụ na-ekwuru gọọmenti Imo steeti ebughị ekwenti ya nke o ji aza ozi e zigara ya.

Aha onyonyo, Uche Nwosu ekwuputala ndụmọdụ o nyere Hope Uzodinma maka ọchịchị

Ihe ndị uweojii kwuru maka nwụchị Uche Nwosu

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Michael Abattam depụtara akwụkwọ ozi na ụlọọrụ ha ma maka ya bụ nwụchị.

O depụtara na Uche Nwosu nọ n'aka ha na ọ bụghị nwụchị ka anwụchịrị ya.

Mana ozi ahụ ekwughị ihe mere ha ji nwụchie Nwosu maọbụ ihe ga-emezi ugbụa anwụchirila ya.

Etu e si tọrọ Uche Nwosu mgbe ọ gara ịka ụka taa- Ebere Nzewuji

Ọnụ na-ekwuru Rochas Okorocha bụ Ebere Nzewuji ekwuola na ọ bụ ezie na-atọrọ Uche Nwosu onye ji ọkọlọtọ Alliance Action zọọ ọkwa gọvanọ Imo steeti n'afọ 2019.

Nzewuji kwuru na ọ bụ mgbe Uche Nwosu na-aka ụka na St. Peter's Anglicab church Nkwerre dị n'Imo steeti.

Lekwa ihe onyonyo o zitere BBC Igbo gosiri

N'ọnụ ya, "ndị a na-amaghị ndị ha bụ batara n'ụlọụka St. Peter's Anglican church kpụrụ Uche Nwosu."

"Ha gbaniri egbe elu ọtụtụ mgbe, tie Nwosu ezigbo ihe tupu ha buru ya pụwa."

Nzewuji kwukwara na ụgbọala ndị ahụ na-emepeghị ihu ha bu, bu njirimara ụgbọala gọọmenti.

O kwuru na ha kpesarala ndị uweojii ihe a merenụ mana ha amabeghi ebe bu Uche Nwosu gawa.

O zitekwara ihe onyonyo gosiri ka ndị mmadụ na-agba ọsọ ndụ ha maka oke egbe ndị ahụ kpụrụ Nwosu na-agba.

Aha onyonyo, Rochas Okorocha: Etu ndị uweojii Imo ateeti si memina mụ na ndị otu m

Ihe ọzọ dị n'ime onyonyo ahụ gosiri ka ya bụ nwuchi si eme

Ndị uweojii nọ na-echekwa Uche Nwosu emeghị ihe ọbụla mgbe ndị ahụ akpọro ndụ uweojii gọọmenti biara nwụchi Uche Nwosu dịka anyị si n'onyonyo ahụ na-efegharị.