Imo Elections: Anyị ga-anabata Uche Nwosu ma ọ lọghachite - APC Imo

Ebe foto si, Facebook/Uche Nwosu
Ngalaba All Progressives Congress (APC) nke Imo steeti ekwuola na ha chere aka ịghọrọ Uche Nwosu nke pati Action Alliance (AA) ma ọ bụrụ na o chegharịa chọrọ ịlọghachite.
Marcon Nlemigbo bụ onye isioche otu ngalaba kewapụtara n'ime pati APC nke steeti a, gwara BBC Igbo na ọ bụrụ na Nwosu tụgharịa uche ya, na ya bụ Nwosu ma ihe o kwesịrị ime tupu ọ bịa.
O kwuru sị na Nwosu ga-alaghachị na wọọdụ ya gaa gbata akwụkwọ mbata ọzọ, tupu ọ malite usoro nlọghachite.
Nlemigbo kwukwara sị na ebe pati ha nwere onye ha wepụtara ife ọkọlọtọ ha bụ Hope Uzodimma, na ọ bụrụ na Nwosu bata, na ọ ga-ebido ụwa n'isi dịka onye nkịtị enweghi agba.
N'otu aka ahụ, Dan Nwafor bụ onyeisi ngalaba APC nke ọzọ kewapụtara n'Imo steeti, kwuru sị na ha ga-anabata Nwosu "ma ọ bụrụ na o nwee mmụọ ịbata" na pati ha.
Nwafor kwuru na pati ha anaghị achụpụ ndị mmadụ, kama na ọ bụ ọdịmma ndị mmadụ ka ha chọrọ.
Gịnị butere okwu a?
N'ụbọchị abụọ nke ọnwa Epreelụ 2019, Uche Nwosu gwara BBC Igbo na ọ ga-agbaghara APC mmehie ha megidere ya na ntuliaka 2019.
Nwosu gwara BBC sị na oge eruola mgbe ya na otu APC ga-edozi, mana ọ gaghị ahapụ pati ya.
Ọ ga-eme ka ọ gaghị eme?
Nwafor kwuru sị na Nwosu agaghị ahapụ ụlọikpe ntuliaka ọ gara maka mmeri onye PDP mere, bịa chọwa ịlọghachịta APC.
O kwuru sị na ọ bụrụ na Nwosu chọrọgodu ịlọghachị, na ọ ga-abụ mgbe e kpebichara ikpe bụ nke ọ nọ n'okpuru pati AA gbaa akwụkwọ ya.
Akụkọ ga-amasị gị:









