Hard drugs: Ndị na-arụ ọgwụ ike agbarụọla mmiri ala n'Enugwu
A na-asị na "mmiri bụ ndụ" mana ọtụtụ mmadu n'Enugwu ahụghị nke ha ga-aṅụ ka ndị na-akụ ọgwụ ike akpọrọ "Methamphetamine" ji mgbọrọgwụ gbarụọ ala.
Agbanyeghị na ndị si ngalaba na-ahụ maka ọgwụ ike bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) anwụchịela ndị a ma gbachie ebe ha nọ na-arụ arụ a, mmiri ala dị na mpaghara Trans-Ekulu emebiela.
Calista Udomma Meka gwara BBC na ọ bụ otu onye aka kpara ebe o bu akpa ọgwụ ike efedrin gbara ama eji nwụchie ndị a na-akpa ike a, ma chọpụta ebe nsogbu mmiri ndị bi na Trans-Ekulu na-agabiga.
NDLEA sị na onye nọ n'isi ndị na-akpa ike a bụ otu nwoke bi Saụt Afịrịka aha ya bụ Christian Chibuzor.
Calista kwuru sị; "Christian anọghị mgbe anyị gara ọrụ n'ụlọ ahụ, mana a hụrụ na ọ bụ ebe a na-akpọsa ụgbọala ka a nọ na-aku ọgwụ ike a."
ADD PHOTO
Ndị e jidere n'ụlọ a bụ Christopher Eze, Ikechukwu Umahi na Paul Eze.
Otu nwoke bi na mpaghara Phase 2 na Trans-Ekulu aha ya bụ Ogunedo Emeruole, gwara ndị ntaakụkọ Vanguard na ha "bidoro hụwa mgbanwe n'ime mmiri ha na-ekute n'ọmị mmiri, mana tupu nke ahụ emee, anyi na-anụ ajọ isi si be agbataobi anyị."
Ọ sị: "Anyị che na onye kwatara ọhụrụ gbara ọgwụ anwụ mana ya bụ ajọ isi akwụsịghị.
"O ruru mgbe anyị bidoro ịhụ mmanụ n'ime mmiri anyị na-ekute. Mmiri a na-esi ajọ isi. Ya mere anyị ji kpọọ ndị na-egwu ọmị, mana isi ahụ ka ha ike.
"Ọ tụrụ anyị n'anya mgbe ndị NDLEA bịara gwa anyị na o si n'aka agbataobi anyị."
ADD ANOTHER PHOTO
Maazị Emeruole gara n'ihu kwuo na ha amaghị onye agbataobi ha a, makana ọ naghị apụta n'ime ụgbọala ya ma ọ bịa.
Meka gwara BBC Igbo na a na-ere ọgwụ ike a na-arụpụta n'ụlọ a na mba ofesi.
Agbanyeghi na ọ gwara BBC Igbo na gọọmentị Enugwu steeti nakwa nke etiti ma maka ihe mere, onweghi onye gọọmentị a kpọrọ zara ekwentị ya iji tinye ọnụ n'akụkọ a.










