Codeine: Ndị ntorobia na aṅụ ọgwụ ike ka na-azụ ọgwụ a n'ahịa

Ogologo aka iwu ejidela Chukwunonye Madubuike bụ nwoke ahụ putara n'ihe nkiri nke BBC dịka onye na-atụ mgbere ọgwụ Kodin.
Madubuike gbara ọsọọ̀ ụkwụ eru ala kamgbe ihe nkiri a pụtara ebe ọ gwara onye ntaakuko BBC na ọ ga-eresị ya ọtụtụ ọgwụ kodin na-anataghị akwụkwọ nke a kpọrọ 'doctors prescription' na Bekee.
Mana n'ime nyocha ọhụrụ BBC Igbo mere, onye ntaakụkọ anyị chọpụtara na ọtụtụ ụmụntorobia ka na-aṅụ ọgwụike a, a kpọrọ Kodin agbanyeghị na gọọmenti amachiela ọgwụ a.
"Anyi chọrọ ibi ndụ anyị"

Tony bụ otu ntorobia na-aṅụ ọgụ ike a nke ọma, gwara BBC Igbo na o kweteghị na ọgụ a na-aba n'anya dịka akụkọ BBC siri kwuo.
N'ọnụ okwu ya: "Ekweteghị m n'ozi a makana o teela m na-aṅụ Codeine, nakwa na ọ naghị aba m n'anya site mgbe ahụ ruo ugbua"
"Ebumnuche anyị bụ na ozi a bụ usoro gọọmentị chọrọ ị kwụsị anyị ị nụ ọgwụ a"
Ego ya eriala elu
Tony gwara BBC na akụkọ BBC mụpụtara gbasara Codien emebiela ọtụtụ ihe.

O kwuru na: "Tupu BBC tinyere anya na Codeine anyị na azụ ya puku naira 1,000 maọbu 1,500, ugbua anyị na-azụ ya 3000 maọbụ 3,500"
Mana Chidi kwuru na ọnụdụ ya ka njọ makana ya nwa na-azụ ya puku naira 4,000 maọbụ 5,000.
Egwu ka dị
Ha abụọ kọwara na egwu na-eji ha mgbe ọbụla a na-aga ịzụ codiene.
Tony kwuru na "Mmu nwa na-aga ụlọorire ọgwụ ndị mara m nke ọma."
"Ọ bụrụ na ịga ebe amaghị nke ọma, ha nwere ike ị kpọrọ gị ndị uweojii"

Onye bụ Chukwunonye Madubuike?
Ogologo aka iwu ejidela Chukwunonye Madubuike gbara ọsọ ụkwụ eru ala kamgbe ndị BBC nyochapụtara etu o si ere ọgwụ ụkwara nwere codeine n'ụzọ na-ezighi ezi.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs bụ Chike Oti gwara BBC na ha nwụchiri Madubuike n'ụzọ Idi-Iroko dị n'Ogun steeti, ka ọ na-achọ isi ebe ahụ gbaga Cotonou dị na mba Benin Repọblik.
Oti kwukwara na ugbua aka kparala ya, na ihe ga-eso ya bụ ịkpụpụ ya ụlọikpe.
Onyeisi ndị uweojii na Legọs steeti bụ Edgal Imohimi gwara ndị ntaakụkọ na Madubuike gwara ha na o rere ọgwụ ndị ahụ iji hụ na o mezuru oke ọrụ oriri na ọzụzụ e nyere ya.
O kwuru na ndị ụlọọrụ Emzor Pharmaceutical Industries Limited bịara kpesara ndị uweojii maka etu Madubuike si na-atụ mgbere ọgwụ megidere iwu ọgwụ Naịjirịa.
Cheta na BBC wepụtara ihe nkiri gosiri ka Madubuike na-akpa etu ọ ga-esi resị onye ntaakụkọ BBC zoro ezo, ọgwụ ọtọmegbum.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị









