Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Onye ntọọ ṅụrụ Tramadol arahụọla ụra abalị isii
Akụkọ ndị kachasị mkpa n'ụtụtụ a
Onye ntọọ na-arahụ ụra Tramadol n'ụra ka na-eme

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii n'ondo steeti ekwuola na onye ha na-enyo enyo dịka onye ntọọ ha nwuchiri ebe ọ na-arụhụ ụra n'ihi Tramadol ọ nwụrụ ka nọ n'ụra abali isii aka jiri kparacha ya.
Nwoke amabeghị aha ya na ndị otu ya gara ịtọrọ mmadụ n'ụlọahịa ọgwụ, onye ha wakporo gbalahụrụ ha, ma ụra buru nwoke ahụ n'ebe ihe ahụ mere.
Ndị uweojii kwuru na e nwetara tramadol dara ram narị anọ(400gm) in ime akpa ya.
Na nke dịka ibe ya, ndị ji egbe tọrọ mmadụ iri na asatọ n'okporoụzọ sị Owere gawa Pọthakọt ụnyaahụ.
Ohaneze sị na ha akwadoghị mmachi Ipob

Onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo ekwuola na aka Ohanaeze adịghị na mmachi gọọmenti etiti machiri Ipob.
Nwodo kwuru nke a dịka otu Ipob gụpụrụ onwe ha na mbọ ikpe udo n'etiti otu abụọ ahụ.
Ọnụ ego mba Tọki ejirila pasent iri na anọ gbadata

Ebe foto si, Getty Images
Nke a mere oge onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump tinyechara ego n'ụgwọ ha na-ana n'igwe e siri mba Tọki bubata Amerịka.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Onye nchịkọta otu egwu bọọlụ Manchester United bụ Jose Mourinho etoola Paul Pogba maka idu otu ahụ na mmeri ha meriri Leicester Csity na asompi ha mere ụnyaahụ.
Man.U ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie Leicester an asompị mbụ na Premier league n'afọ a.
Lee ihe nkiri kirie maka ọdịmma ahụike gị na ezinaụlọ gị:

Akụkọ ga-amasị gị










