Fr Raymond Arazu: Fada Katọlik a bụkwa Dibịa anwụọla

Fada Raymond Arazu

Ebe foto si, Fr. Arazu Youth Development Organization

Otu Fada ụlọụka Katọlik aha ya bụ Raymond Arazu anwụola n'ụlọọgwụ dị n'Enugwu.

Onye ọdeakwụkwọ ụlọụka ahụ wepụtara ozi a kwuru na e bugara ya ụlọọgwụ dịka ike na-agwụ ya n'ụbọchị ole na ole gara aga.

Ozi ahụ kwuru na ọ na-arịabu ọrịa akpụ nke ngada nakwa Dayabitis tupu ọ nwụọ.

Ha kwukwara na a ga-ewepụta ozi ma ahazicha usoro akwamozu ya.

Tupu ọ nwụọ, ọ bụ onyeisioche otu ndị mgbọrọgwụ akpọrọ "Anambra Traditional Medicine Board".

Onye bụ Fr, Arazu?

Fr Raymond Arazu

Ebe foto si, Fr. Arazu Youth Development Organization

Fr. Arazu bụ otu onye ya na ụka ya na-akwata isi maka ọtụtụ ihe gbadoro ụkwụ n'omenala Igbo.

Ọ kpọrọ onwe ya "Dibia" ma na-emekwa ihe gbasara mgbọrọgwụ Igbo.

Ọ bụkwa onye akpọrọ "Holy Ghost Father".

E kwukwara na ọ na-achụpụ ajọ mmụọ bi n'ime mmadụ nke Bekee kpọrọ "Exorcist".