Desmond Tutu burial: Etu akwamozu Archbishop a ma ama maka ikpe udo si aga

Akpati ozu Tutu ka a na-ebuba ya na St George Cathedral

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ụkọchukwu ise bubara akpati ozu Tutu n'ime ụlọụka ochie ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị mmadụ na-eruru ya uju gbakọrọ taa n'ụlọọụka St George's Cathedral dị na Cape Town, Saụt-Afrịka, iji kwanyere Archbishop Desmond Tutu ugwu ikpeazụ taa bụ Tọzde.

Tutu, onye ritere nzere ọkaibe 'Nobel Peace Prize' ma soro na ndị nyere aka ka a kwụsị ịkpa oke agbụrụ Bekee kpọrọ 'apartheid' na Saụt Afrịka, nwụrụ n'abalị 26 nke ọnwa Disemba ka ọ gbachara afọ 90.

Ndị ụkọchukwu mụnyere ịnsensị dịka e bubatara igwe ozu ya na nnukwu ụlọụka ahụ.

Ndị mmadụ na-abịa na nnukwu ụlọụka St Georges Cathedral ịkwanyere Achịbishọp Desmond Tutu dugwu ikpeazụ taa bụ Disemba 30, 2021

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Nnụkwu ụlọụka 'St George's Cathedral dị na Saut- Afrika

Ada Tutu bụ Thankeka Tutu-Gxashe, na ndị okenye ndị ọzọ si n'ezinaụlọ ha sokwa igbe ozu ya bata n'ụlọụka maka ịkara ya ụka.

E jibu oche ịnyịnya igwe kwọbatabuo nwunye ya karala nka bụ Leah n'ụlọụka.

A na-atụ anya na a ga-agbatị oge e nyere ka ndị mmadụ hụ ozu ya anya ikpeazụ rue abalị abụọ, ka ndị ghara ị na-azọ ụzọ.

Ihe ị kwesịrị ịma maka Archbishop Desmond Tutu lara mụọ

Desmond Tutu

Ebe foto si, Reuters

Desmond Tutu bụ Achịbishọp ma bụrụ kwa onye ritere ntụruugo Nobel Prize maka udo anwụọla n'afọ iri itoolu.

Tutu bụ onye mba Saụt Afrịka lụrụ ọgụ ebe ọ di ukwu were megide ịkpa oke akpasoro ndị isi ojii na ndị agbụrụ ọzọ na mba Saụt Afrịka.

Ọ bụ onyeisiala mba ahụ bụ Cyril Ramaphosa kwuputara maka ọnwụ ya n'akwụkwọ ozi ya.

Tutu so na ndị soro zọọ nwereonwe mba Saụt Afrịka n'aka ndị ọcha na-akpagbu ndị isi ojii ha na ndị agbụrụ ndị ọzọ na mba Saụt Afrịka.

Ihe ị kwesịrị ịma maka Desmond Tutu

  • A mụrụ Desmond Tutu n'afọ 1931 n'obodo Klerksdorp.
  • Tutu lụrụ nwunye ya bụ Nomalizo Leah Shenxane n'afọ 1955.
  • Ọ kwụsịrị ị ga-akwụkswo n'ihi na okwenyeghị n'ọzụzụ na-akpa oke ebe ndị isii ojii nọ.
  • E chiri Desmond Tutu echichi dịka ụko chukwu n'afọ 1960.
  • Ọ bụ n'afọ 1962 ka ọ gara mba Britain ịgụ Theology.
  • O rụrụ dịka Bishop mpaghara Lesotho site n'afọ 1976 ruo afọ 1978.
  • Goọmentị mba Saụt Afrịka n'afọ 1980 napụrụ Desmond Tutu akwụkwọ njem ya mgbe ọ gara gwa PW Botha bụ onye na-achị Saụt Afrịka oge ahụ ka ọkwụsi ọchịchị ikpa oke ndị isi ojii.
  • Tutu ritere ntụrụugo Nobel Peace n'afọ 1984.
Aha onyonyo, Johanesburg: "A chụrụm n'ọrụ mana a bụzịm onye na-enye ọrụ na South Africa"
  • E mere ya Bishop Johannesburg n'afọ 1985 ma bụrụ kwa onye mbụ bu onyeisi ojii emere Archbishop na Cape Town.
  • Ọ bụ ya bụ onye mbụ kpọrọ mba Saụt Afrika 'Rainbow Nation' oge Nelson Mandela meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala.
  • N'afọ 1996 ka Tutu kwụsịrị ọrụ dịka ụkọchukwu.
  • A chọpụtara na ọ nwere ọrịa kansa n'afọ 1997.
  • O ji ọkwa ya dịka ụkọ chukwu ekwu okwu megide mkpagbu ndị isi ojii na Saụt Afrịka.
  • Ọ na-ekwu oge niile na ọchụchọ ya ehibeghị isi na ndọrọndọrọ ọchịchị kama na ọ bụ n'okpukperechi.
Desmond Tutu na Nelson Mandela

Ebe foto si, Getty Images

A na-akpọ aha Tutu na Nelson Mandela ma akpọwa ndị zọrọ nwereonwe ndị isi ojii mba Saụt Afrịka.

Onyeisiala Ramaphosa kpọrọ Desmond Tutu, " Onye ndu ime mụọ bụ okaibe, onye lusoro oke agbụrụ ndị ọcha ma bụrụ kwa onye na-alụ ọgụ maka nwereonwe mmadụ niile n'ụwa ".

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ ya?

Bobi Wine

Robert Kyagulanyi Sentamu eji Bobi Wine mara kwuru na ọnwụ Desmond Tutu metụrụ ya ebe ọ dị ukwu.

O kwuru na oke osisi adago ma kwuo kwa na Tutu biri ndụ ya maka ọdịmma ndị ọzọ.

Richard Branson

Richard Branson bụ onyeisiụloọrụ Virgin kwuru na oke mmadụ ahapụla ụwa.

O kwuru sị, " Ọ bụ onye kara obi, onye obi ụtọ, ọ na-eche uche nke ọma, ọ bụ kwa ezigbo enyi m".

Piers Morgan

Onye ntaakụkọ ọkaibe bụ Piers Morgan depụtara mwute ya.

O ji otu okwu eji mara Tutu mechie okwu ya, nke sịrị " Ị chọọ udo, ọbụghị gị na ndị enyi gị ga-akpa. Ọ bụ gịnị ndị iro gị".

Cyril Ramaphosa

Onyeisiala mba Saụt Afrịka kwuru na ọnwụ Desmond Tutu bụ ihe nwute riri mba Saụt Afrịka ọnụ dịka ha na-asị otu onye ọzọ soro zọpụta Saụt Afrika, "laa n'udo".