Sam Obiagọ: Ihe ndị ị maghị maka onye ejije Nollywood a larala mmụọ

Sam Obiago

Ebe foto si, Sam Obiago/Instagram

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Sam Obiago, onye ejije Nollywood a ma ama anwụọla taa bụ Tọzde n'Asaba, Delta steeti ka ọ rịachara ahụ nwa oge.

Onyeisi otu jikọrọ ndị na-eme ihe ejije Bekee kpọrọ, 'Actors Guild of Nigeria' bụ Emeka Rollas gwara BBC Igbo na ya bụ ọdachi mere n'ezie.

N'otu aka ahụ, onye Nollywood ọzọ bụ Holychild Okorie kọwara Obiago dịka 'onye anaghị achọ nsogbu."

Okorie, onye kwuru na ha abụọ arụkọbuola n'ihe ejije ole na ole kwukwara sị, "Ọ bụ ezigbo mmadụ. Mụ na ya arụkọgo ọrụ. Ọ naghị agharịpụ dịka ndị ejije ndị ọzọ a ma ama. Ọ sị gị na ọ na-abịa, ọ ga abịa."

" Ọ naghị enye nsogbu na ọ bịa n'ọnọdụ ebe a na-emem ihe ejije."

Obiago, onye a ma dịka 'Daddy Sam' bụ onye ihe ejije mabụrụkwa onye na-emepụta ihe ejije.

Ihe ndị ị maghị maka Sam Obiago

Sam Obiago

Ebe foto si, Sam Obiago/Instagram

  • Sam Obiago si n'ezinaụlọ nwere agba n'Asaba dị na Delta steeti.
  • Sam Obiago na-arụbụ n'ụlọakụ Ecobank bụ ebe ọ gbalitere n'ọkwa dịka onyeisi na ngalaba ha dị na mba Cote d'voire tupu ọ banye Nollywood.
  • Obiago, onye na-emekarị agwa Eze n'ihe onyonyo, esonyela n'ihe ejije karịrị otu narị.
  • Ihe ejije o merela gụnyere; 'Osinachi,''Ancient Love', 'Pregnant Palace', 'Tears Of A King', 'Woman Of Fire', 'Ghana Island', 'Royal Turning Point', 'Royal Appointment', 'Bargain', 'Combined Forces' na 'Altar Of Love'.
  • Tupu ọ nwụọ, ọ bụ onyeisioche otu jikọrọ ndị na-ede ejije Bekee kpọrọ ' Screen Writers Guild of Nigeria (SWGN)'.
  • O ritela nturuugo dị iche iche gụnyere; 'The Most Reliable Veteran' nke afọ 2020.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: