Vaginal dryness: Ihe asaa nwaanyị kwesiri ịma maka ọtụ ya ịgba mmiri

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
Ọ na-abụ ihe ịtụ n'anya maọbụrụ na ọtụ nwaanyị agbaghị mmiri mgbe nwoke kpatụru ya aka.
Ya bụ mmiri Bekee kpọrọ 'estrogen' na-arịtụ elu iji hụ na aramara gara siriri-werere ma mee ka di na nwaanyị gwọrịa ndụ.
Mana oge ụfọdụ, ahụ nwoke nwereike ị dị njikere mana ahụ nwaanyị akwadobeghị maka ahụ ya kpọrọ nkụ nke nwereike ibute ịda mba n'aramara.
Dịka dọkịta ahụike ụmụnwaanyị bụ Dkta Jospeh Akinde siri kọwaa, ihe ndị nwere ike ibute ọtụ nwaanyị ịkpọ nkụ gụnyere: Ọrịa, maọbụ ọgwụ e ji agwọ ụfọdụ ọrịa; obi erughị ala; obi adịghị mma, ike ọgwụgwụ, enweghị 'ovulation' wdg.
Lee ihe asaa nwereike ibute ọtụ nwaanyị ịkpọnkụ
1. Ọrịa, maọbụ ọgwụ e ji agwọ ụfọdụ ọrịa
Dkta Akinde bụ onye nwe ụlọọgwụ Livingspring Hospital, Ejigbo ,Lagọs, kwuru na o nwere ike o nwee ọrịa metụtara ọtụ ya dịka ọrịa a na-ebute na mmekọrịta nwoke na nwaanyị nke Bekee kpọrọ 'sexually transmitted infections'.
O kwukwara na ịṅụ ụfọdụ ọgwụ dịka ọgwụ e ji agwọ ọrịa isi maọbụ ọgwụ e ji agwọ kansa maọbụ 'fibrọd' nwere ike ime ahụnwaanyị kpọọ nkụ.
2. O nwere ihe ike ọ gabigara?
Nwaanyị e dinara n'ike maọbụ nke e biri ugwu nwere ike inwe nsogbu ọtụ ịkpọ nkụ oge aramara.
Dr Akinde kọwara sị, "Ọ bụrụ o nwere ihe ike ọ gabigara dịka onye e dinara n'ike maọbụ nwaanyị e biri ugwu, o nwere ike ime ka ọtụ ghara ị na-ede mmiri oge mmekọrịta."
3. Obi adịghị mma

Ebe foto si, Getty Images
"Obi nwere ike ọdịghị nwaanyị mma nke na ọ chọghị mmekọ mana o kwenyere ka ya na di ya meekọ n'ihi na ọ bụ ọrụ dịị ya dịka nwaanyị nọ na di"
3. Ike Ọgwụgwọ
N'etu ike ọgwụgwụ si akpata ya, Dkta Akinde sị, "O nwere ike gwụrụ ya, o si ọrụ lọta , ọ nọla na kpachikpachi okporoụzọ ọtụtụ awa ezuola ime ka mmụọ aramara agaghị adị ya n'ahụ."
4. Enweghị 'Ovulation'
Ovulation bụ oge age nwaanyị na esi na akpa agwa nwaanyị bụta maka ịnata uzi nke nwoke nke na-eme abalị iri na-anọ tupu nwaanyị ahụ nsọ ya.
Mana oge ụfọdụ ụfọdụ ụmụnwaanyị anaghị ahụ 'ovulation ha nke Dta Akinde kwuru nwere ike ime ka ọtụ ka kpọọ nkụ oge mmekọrịta.
Ọrịa dịka ọrịa 'polycystic ovary syndrome' (PCOS) nwere ike ime nwaanyị ka ọ ghara inwe 'ovulation'.
5. 'Menopause'

Ebe foto si, Getty Images
Websait na-ekwu maka okwu ahụike bụ Webmd kọwara na nwaanyị ịba'menopause nwere ike ibute ahụnwaanyị ịkpọnkụ dịka mmiriahụ nwaanyị na-agbda na nwaanyị kawa nka.
"Ọtụ nwaanyị ịkpọ nkụ so na njirimara 'menopaụse- ihe ruru otu n'ime ụmụnwaanyị na-agabiga mgbanwe" nke na-aga n'ihu na ha ma afọ ha na-agbali.
6. Amaghị akpa aka n'ụbọ
Ndị ọkachamara na-ekwu n'oge ụfọdụ, ọtụtụ ụmụnwoke anaghị akpa ṅwaanyị ha aka ọfụma tupu aramara n'ihi na ọ na-ahụha ahụ maọbụ ha amaghị akụkụ ahụ nwaanyị ha na-akpalite ha.
7. Ịmụ nwa maọbụ iye nwa ara

Ebe foto si, Getty Images
Nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ maọbụ nke na-enye nwa ara nwekwara ike inwe nsogbu ahụnwwanyị ya ịkpọ nkụ oge arama.
Inye nwa ara na-adị nwaanyị n-ahụ dịka onye barala 'menopause' .
Nke a bụ n'ihi na mmiri ahụ na-eme ka mmiri ara gbaa nwaanyị na-egbochi mmepụta 'estrogen'.
Ụzọ mgbapụ

Ebe foto si, Dr Joseph Akinde
Dịka ndị ọkachamara n'okwu ahụike ụmụnwaanyị siri kwuo, ọ dị mkpa inyocha ihe butere nsogbu nwaanyị tupu a mata ụzọ aga esi egbo ya.
" Ọ bụrụ na ọ bụ ọrịa ka o butere, ọ dị mkpa ịgwọ ya bụ ọrịa,"
"Ọ bụrụ ihe ike mere ya kpatara nke a, ọ dị mkpa ịhụ ndị na-ahụ maka ahụike uche(psychologist) maka nleta"
"Ọ bụrụ na onye e biri ugwu, ọ o nweghị ihe ọ ga-eme karịa ịzụụ mmiri ahụ Bekee kpọrọ 'lubricant' oge ọ chọọ ime aramara."
O kwuru na nwaanyị e biri ugwu nwekwara ike iji 'lubricant' gboo ya bụ ọgụ.
Ọzọ, ndị ọkachamara na-adụ ndị di ọdụ ka ha tinye tụ oge oge ha na nwaanyị ha na-egwu egwu tupu ararama iji nye ohere ka ahụnwaanyị dee mmiri n'ihi na onye mara sụọ, ọ sụọ n'ikwe.










