Period Sex: Ihe ndị na-eme n'ezie ma ị mee mmekọ na nsọ nwaanyị

Ebe foto si, Raphaelle Martin
O nwere ọtụtụ akụkọ na-efegharị gbasara ihe na-eme n'ime ahụ mmadụ ma e nwee mmekọrịta mgbe nwaanyị nọ na nsọ ya.
Ọ bụghị naanị na Naịjirịa ka e nwere ụdịrị echiche a kama ọ dị ebe niile n'ụwa niile.
O nwere akụkọ ndị na-atọ ọchị, nwee ndị na-ewu ewu nwekwaa ndị nwereike ịtinye mmadụ na nsogbu maọbụrụ na akpachaghị anya.
Lee ihe na-eme n'ezie ma nwaanyị nọrọ n'oge nsọ ya:
Nwoke a ga-anwụ ma o zute nwaanyị na nsọ ya?
O nwere ndị chere na nwoke ọbụla zutere nwaanyị n'oge nsọ ya ga-anwụrịrị
Mana o nweghi ihe nnyocha sayensị gosiri na nke a bụ eziokwu.
O nwereike ịbụ nkwenye okpukpere mmadụ dị icheiche ka echiche si pụta mana sayensị akwadoghi ya chaachaa.
Nwoke a ga-ebute ọrịa ma o zute nwaanyị na nsọ ya?
Dịka echiche na nwoke ga-anwụ ma o zute nwaanyị n'oge nsọ ya, nke a enwekwaghị mgbado ebe ọbụla.
Echiche a malitere site n'etu ndị mmadụ sị asọ ọbara si na nsọ nwaanyị nakwa etu ha sị ahụ ya.
Ha cheere na o nwere atịtị na nje dị icheiche n'ime ya nke mere na ọ metụta nwoke, ọ bunye ya ọrịa.
Gịnị na-eme n'ahụ nwaanyị kwanụ?

Ebe foto si, Getty Images
N'otu aka ahụ kwa o nwere ndị kwenyere na nso nwaanyị ga-egbochi ndị mmadụ ịbute nje HIV/AIDS.
Otu Dọkịta aha ya Dr Nkolika Nwankwo kwuru na nke a bụ asị ọcha.
"Mgbe ọbụla ịzutere onye ọbụla bu nje HIV/AIDS n'ụzọ mmekọrịta ị ga-ebute ọrịa ahụ."
Ihe ọzọ Dọkịta Nwankwo kwuru bụ na ọbara nsọ nwaanyị ezughi ichekwa mmadụ n'ebe ọrịa ahụ dị.
N'ihe ọzọ gbasara nsọ nwaanyị ụfọdụ mmadụ na-eche na akwa nsọ pụrụiche akpọrọ 'Tampon' na Bekee ga-efu n'ime ahụ nwaanyị.
O nwekwara ndị kwenyere na ọ ga-eme ka ime ahụ nwaanyị amabeghị nwoke dịrị ka ọ marala nwoke.
Mana o nweghi ihe aka ebe si na nnyocha sayensị nakwa ahụike gosiri na nke a bụ eziokwu.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị














