Menstrual cycle: Ụzọ ise ị ga-esi nyere nwaanyị nọ na nsọ ya aka

Nwaanyị nọ na nsọ ya

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Nsọ nwaanyị nke Bekee kpọrọ 'menstruation' na-abịakarị kwa ọnwa, mana ọ bụghị nwaanyị niile ka ọ na-agara sịrịrị werere.

Nye ụfọdụ ụmụnwaanyị, mkpụrụ ụbọchị atọ ruo ise ahụ ha na-ahụ nsọ ha na-adị ka ọkụmmụọ n'ihi ihe ha na-eji anya ha ahụ.

Ụfọdụ na-anọ na mgbakasị ahụ nke bụ na ị gwa ya ofu okwu ọ bakasịara gị ahị (ihe ọ naghị emekarị), ebe ụfọdụ anaghị enweta onwe ha n'ihi ụdịrị ahụ ụfụ ha na-anọ n'ime ya.

Mana dịka ikwu na ibe, enyi, onye ọrụ nakwa onye ya na nwaanyị na-ahụ nsọ ya nwere mmekọ n'ụzọ dị iche iche, kedụ ihe ndị ị ga-emere ya iji nyere ọnọdụ ya aka?

Lee ụzọ ise ị ga-esinwu nyere nwaanyị nọ na nsọ ya aka

1) Hapụ ya aka:

Ọ sị gị hapụ ya aka, nwanne biko sere aka gị ozugbo tupu ọ pụta okwu.

Ị na-ajụ "maka gịnị?" Ọ bụ makana o nwereike ịbụ na ọ nọ na mgbu na mgbakasị ahụ nke na-esokarị nsọ ụfọdụ ụmụnwaanyị, mana ọ chọghị ịgwa gị.

Ọzọ bụ na o nwereike ịnọ na mgbagwojuanya maka ihe ahụ ya na-agabiga, n'ihi na ọ bụghị mgbe niile ka nwaanyị ma ihe ahụ ya na-agabiga ọkachasị ma ọ nọrọ na nsọ ya.

Mmiri ọgwụ ahụ ya (Hormone) na-ezigara ya ozi dị iche iche n'oge ahụ, nke bụ na o nwereike inwe isi ọwụwa, ike ọgwụgwụ, agụụ agaghị na-agụ ya, ike okwu adịghị ya maọbụ ọ na-atakarị mmadụ.

2) Maa ya mmiri ọkụ

Hot Water Bottle

Ebe foto si, Getty Images

Ị ma na mmiri ọkụ na-enyere ụfọdụ ndị nsọ ha na-enye nsogbu aka ikutetu ume ma ọ na-egbu ha mgbu?

Nwaanyị nsọ ya na-egbu mgbu na-achọ ihe ga-ebelatatụ ụfụ na-afụ ya, ebe ahụ ka mmiri ọkụ ga-abata dịka onye nzọpụta.

Ndị ọcha wepụtara nke a na-akpọ "hot water bottle", nke bụ mmiri ọkụ gbọrọ agbọ a gbara na mkpọ rọba, nke onye ahụ ga-atụkwasị n'ebe ahụ na-egbu ya mgbu.

Ntụkwasị a nakwa ụzọ ọzọ bụ iji akwa maa onye ahụ mmiri ọkụ n'afọ, ukwu ma n'azụ, na-eme ka ọbara gbakọrọ ebe ahụ gbazee ma nyetu onye ahụ ohere ikurutu ume.

A na-ejikwa mgbatị ahụ ebelata mgbu n'oge nsọ nwaanyị, mana mmiri ọkụ ga-enyere onye ike adịghị ịgbatị ya bụ ahụ, ya na ụfọdụ ọgwụ nke dọkịta na-enye n'ụlọogwụ.

3) Zụtara ya 'sanitary pad'

Ị nụkwara ego ole a na-erezi 'sanitary pad' ugbua?

Pad dịzị ọnụ ugbua, mere ka ego e jiri zụta ya dị ka 'a kpata a tụfuo'.

Ya mere, otu ihe ọma ị ga-emenwuru nwaanyị nọ na nsọ ya bụ inyere ya aka zụta ụfọdụ, ọ na-eji 'pad' o, nke a na-akpọ tampon, maọbụ iko, gbaa mbọ hụ na ị zụnyere ya.

Ọ ga-ekele gị maka ihe ọma a.

Tampon na iko

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Iko e ji ahụ nsọ (dị n'aka ekpe na aka nri) na 'tampon nke a na-arụnye arụnye (dị n'etiti)

4) Nye ya nri:

Nri ụtụtụ

Ebe foto si, Getty Images

A na-ekwu na ụmụnwaanyị hụbigara nri n'anya oke, mana ị ma na nye ụfọdụ ụmụnwaanyị, ọ bụ mgbe ha nọ na nsọ ha ka ha na-aka achọ nri.

Nye ya nri ọbụla ọ chọrọ, mana mee ka ọ mara na ọ bụ nri na-edozi ahụ ga-akara ya mma iri n'oge ahụ.

Nri ndị dị ka mkpụrụosisi, osikapa nchara (brown rice), ube, akwụkwọ nri ndị nwere faịba na-aka mma iri n'oge nsọ nwaanyị.

Na-adụ ya ọdụ ka o nwee ike ịṅụ mmiri n'ihi na ọ na-enyere aka ibelata mgbu ọ na-agabiga.

Gbaa mbọ hụ na mmiri akọghị ya ebe ọbụla ọ nọ.

5) Gee ya ntị, gbaa ya ume:

Enyi nwoke na nwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-eme ka ndị a 'gbara ọgwụ anwụ n'isi' ma ha nọrọ na nsọ ha, n'ihi ihe anyị kwuru maka ya n'elu (hormone).

Mana ị gee ya ntị ma tinye uche ịhụ na ọ nọghị na mgbu, dibe ihe ọbụla o mere gị n'ihi na ọ machaghị ụma eme.

Ihe ọzọ ị ga-emere ya bụ ịnọ nso nke ga-abụ na ọ chọọ enyemaka gị, ị gaghị anọ ebe tere aka.

Ihe ndị ọzọ ị ga-emenwuru ya:

  • Nyere ya aka n'ịga ozi
  • Jaa ya mma, ọkachasị ma ọ na-ahụta onwe ya na ọ maghị mma maọbụ na o buru ibu
  • Ewela iwe ma o mee ihe kwesịrị iwe gị iwe, n'ihi na o jighi anya ya.

E nwekwara ụzọ dị iche iche i nwereike iji nyere ya aka, mana gaa mee ka, ka ọ ka fọdụ n'ihu.