Marriage Secrets: Ihe ise nwaanyị ekwesịghị ịgwa di ya na-agbanyeghị ụdị ịhụnanya o nwere n'ebe ọ nọ

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Adedayo Owolabi
- Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist
Alụmdi na nwunye bụ ihe dị oke mkpa nye ndị Igbo, otu ihe e jiri mara ndị Igbo bụ na ha na-akwanyere alụm dị na nwunye ugwu.
Mana ihe a na-ahụ ugbu a bụ na ọtụtụ alụm di na nwunye na-agbasakaarị maka ọtụtụ ihe, gụnyere esemokwu na-enweghi isi.
Eeh! E kwesịghị inwe okwu zoro ezo n'etiti di na nwunye, mana e nwere ihe nwaanyị na-ekwesịghị ịgwa di ya n'agbanyeghị ka o si hụ di ya n'anya.
Ọ bụrụ na nwaanyị achọghị mmechu ihu, e nwere ọtụtụ ihe o kwesịrị ime. Ha bụ:
1. Mmadụ ole ya na ha dinara tupu ya na di ya amara onwe ha.
I kwesighi ịgwa di gị mmadụ ole gị na ha dinara tupu unu amata onwe unu.
Nke a bụ maka na unu nwee nsogbu ọbụla n'etiti unu, o nwereike ji maka ya kọọ gị ọnụ.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ jụọ gị mmadụ ole gị na ha yiri, jiri ọchị chịtuo akụkọ ahụ ma lefere anya ma sị ya "O nwere ihe ọ ga-emere anyị n'ije ihunanya anyị".
2. Ihe nzuzo ị ma maka di maọbụ onye gị na ya yiri na mbụ:
Agwachala ya ihe niile ị ma maka di gị maọbụ ọyị gị nwoke gị na ha kpaburu tupu ị mata ya.
Emekwala eme gwa di gị ihe ga-eme ka obi dị ya ka ọ bụ onye njọ maọbụ otozughị ịbụrụ di gị ma ọbụ enyi gị nwoke.
Ekwukwala maka ụdị ego ị chọrọ ka o nwe maọbụ ikikere ya n'elu akwa.
3. Agwakwala di gị maka ụdị ihunanya i nwere ebe enyi ya nwoke maọbụ nwanne ya nọ.
Ọ bụrụ na nwunye hụ nwanne di ya maọbụ enyi di ya n'anya, ọ baghị ya uru ka ọ gwa di ya.
Nke a bụ ihe ọzọ o kwesighị ịgwa di ya, o kwesịrị i kwanyere onwe ya ugwu, wepụ anya ebe ha nọ, tinye obi ya na ihunanya niile ebe di ya nọ. Na-emeghị etu a nwereike ibute nsogbu n'etiti di na nwunye.
4. Agwakwala di gị na ị kpọrọ nne ya maọbụ ezinụlọ ya asị na-agbanyegi ihe ị gabigara n'aka ha.
Na-agbanyegị ka nne di gị kpasuoro gị agwa, emekatala eme gwa di gị na ị kpọrọ ya asị. Etu a ka i ga-emekwa ụmụ nne ya na-agbanyeghị ihe ị hụrụ n'aka ha, maọbụ etu iwe si juo gị n'obi. Ị ga-akwanyere ha ugwu dịịrị ha.
Esemokwu dapụta n'etiti gị na ndị be di gị, jiri nwaayọọ kọwara di gị, ọ ga-aghọta mwute gị n'esemokwu ahụ.
Di gị ga-enyekwa gị aka ị gbomkpaa.
5. Ejikwala ọnụ gị kwuo maka ịgbara di gị alụkwaghịm

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ndị ọkachamara n'ihe gbasara alụmdi na nwunye kwuru, ụbọchị ọbụla i kwuru maka mgbasa n'etiti gị na di gị bụ ụbọchị i jiri aka gị tọọ ntọala mgbasa unu. Alụmdi unu ga-esi ụbọchị ahụ gbawa ụka.
Ikwupụta maka mgbasa unu pụtara na obi gị apụọla n'alụmdi unu. Ọ bụrụ na ọ bụ alụmdi ọgụ na mgba, biko emekwala eme chere. Mana ọ bụghị etu a, gbaa mbọ lee ka unu naabọ nwereike iji kpee ezi udo n'etiti onwe unu.













