IVF: Gịnị ka omenala Igbo na ndị ụka kwuru gbasara usoro IVF?
IVF bụ usoro ịmụ nwa nke mkpọzu ya pụtara In Vitro Fertilization.
Ọ bụ usoro pụrụ iche nke sayensị ji enyere ụmụnwaanyị ime na-ara ahụ aka ka ha tụrụ ime ma mụọ nwa.
Mana ụka, ọ kachasị ụka Katọlik, akwadoghị usoro ọmụmụ nwa a.
Ụfọdụ omenala akwadoghịkwa ya, nke mere ka ọtụtụ mmadụ ji usoro a mụọ nwa anaghị achọ ime ka ndị mmadụ mata na ọ bụ ya ka ha ji mụọ nwa.
Gịnị kpatara ụka ji agbarụ ihu nye usoro IVF?
Kirie akụkọ a nke si n'aka Chris Okereke na Chiemela Mgbeahuru.





