Cubana Chief Priest vs Maria BBNaija: Etu ebubo o boro Maria si akụkọta isi ọtụtụ mmadụ

Chiefpriest, Maria na Paulo

Ebe foto si, Instagram/screenshot

Ebubo a Cubana Chiefpriest boro Maria nke ọ sị na ọ na-ayị di nwanne ya nwaanyị apụọla n'egwu dịka ọ kụkọtala isi ụtụtụ mmadụ ọnụ.

Site n'ihe Chiefpriest dere n'Instagram, ọ kpọrọ aha otu onye a na-akpọ Paul Okoye e ji 'Paulo' maara ma sị na ọ bụ ya mere Maria ji mata onye Paulo bụ.

Na nzaghachị Paul gwara Chiefpriest ka ọ na-ekwu ihe doro ya anya tupu ọ na-ebo mmadụ ebubo.

Nke a were Chiefpriest iwe mere o jiri bipụta akwụkwọ alụkwaghịm nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ gụnyere akara ekwentị Maria.

Paulo gara n'ihu bipụtakwa akara ekwentị Chiefpriest n'Instagram ma sị ka ndị mmadụ kpọọ ya n'ekwentị.

Achọghị m itinye ọnụ n'ebubo Cubana Chief Priest na-ebo m - Maria BBNaija

Chief Priest na-ebo Maria ebubo na ọ na-apụrụ nwanne ya nwaanyị di ya.

Ebe foto si, cubana_chiefpriest/mariachikebenjamin/Instagram

Nwada a ma ama so bụ n'emume Big Brother Naija bụ Maria Nkechinyere Chike ekwuola na ọ chọghị itinye ọnụ n'ebubo Cubana Chief Priest na-ebo ya.

Maria kwuru nke a mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ndị nnọchite anya ya ka o zara ọnụ n'ebubo sị na ọ na-apụrụ otu nwaanyị di ya ma na-eyi nwaanyị ahụ egwu n'elu ya.

Kedụ ebubo e boro Cubana Chief Priest boro Maria?

Aha onyonyo, Maria Chike Benjamin

Pascal Okechukwu bụ onye e ji Cubana Chief Priest maara depụtara n'Instagram ya Maria nwere obi siri ike maka etu o si na-apụ nwanne ya nwaanyị di ya ma gaa n'ihu sị na ọ ga-egbu ya.

Ọ sị na ọ gaghị ekwe ka okwu ahụ laa n'ụkpọrọ na ọ ga-achọrọ Maria na di nwanne ya nwaanyị a kpọrọ Kelvin gaa na Dubai.

Okwu a mere ka ọtụtụ malite ịkatọ Maria ebe ọ dị ukwuu, ebe ụfọdụ ndị sị ka ChiefPriest gosi ihe akaebe tupu ọ na-ebo mmadụ ebubo.

Akwụkwọ alụkwaghịm

Ebe foto si, Cubana Chiefpriest/screen shot

ChiefPriest gara n'ihu gosi akwụkwọ alụkwaghịm nwanne ya nwaanyị gbara n'ụlọikpe dị n'Aba n'ọnwa Sepụtemba.

O gosikwara nzirita ozi n'ekwentị nke mere n'etiti Maria na nwanne ya nwaanyịma sị na Maria nwere obi na-enye ya ndụmọdụ na-agbanyeghi ihe niile o mere ya.

Akwụkwọ alụkwaghịm

Ebe foto si, Cubana Chiefpriest/screen shot

Mana ihe ndị a e dere n'ozi ahụ bụ ebe Maria na-arịọ nwaanyị ahụ ka ya na di ya kpee udo n'alụmdinanwunye ha.

Tupu akụkọ a na-apụta BBC Igbo kpọtụrụ Cubana ChiefPriest ka ọ kọwaa ebubo ndị a mana ọ zabeghi oku anyị kpọrọ ya.

Kedụ ihe ezinaụlọ Kelvin Kwuru?

Nwanne nwoke Kelvin onye a sị ya na Maria na-ayị pụtara n'Instagram ma zaa Chiefpriest okwu maka ebubo ọ na-ebo Maria na nwanne ya nwoke.

Nwamadị a sị na nwanne ya Kelvin na nwunye agbasaala tupu ọ malite ịyị Maria.

Ọ sị na ihe butere nsogbu n'ezinaụlọ ha bụ na nwunye Kelvin na-akatọ ma na-emechu ya ihe nke ukwuu nke mere Kelvin ji sị na ike agwụla ya.

Ọ gaara n'ihu kwuo na nwunye Kelvin chụpụrụ ha niile (ma nne Kelvin) n'ụlọ nwanne ya nwoke rụrụ.