What is surrogacy : Lee ụzọ ị ga-esi buru afọ ime na-atụghị ime

Nwaanyị dị ime

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Jessica Nwankwo
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos

Kemgbe omeihe onyonyo bụ Ini Edo pụtara kwuo na ọ mụrụ nwa site n'atụmatụ a kpọrọ 'Surrogacy', ndị mmadụ kpụrụ ya bụ okwu n'ọnụ.

Ha na-ajụ ajụjụ na-asị "gịnị bụ surrogacy?". Ya bụ ajụjụ na ihe ndị so ya ka akụkọ a ga-akọwa.

Aha onyonyo, "Echere m na m dị ime ejima anọ, mana ejima isii ka m mụrụ" - Thelma Chiaka

Dịka dọkịta Obinna Obuka sị kọwa, atụmatụ a bụ usoro ime ka nwaanyị ọzọ buoro gị afọ ime ma mụọrọ gị nwa.

Ọ kọwara na ọ bụ nwaanyị ọzọ itinye akwa ya na uhie dị ya n'ime ahụ nwaanyị ọzọ nke ga-ebuzi afọ ime si na ya ma mụọ nwa ahụ.

"Ọ bụ ndị achọghị ịbu afọ ime maọbụ ndị enweghi ike ịbu afọ ime na-eme nke a" ka o kwuru.

A na-enwe nkwekọrịta n'etiti ndị chọrọ nwa nakwa onye ga-ebu afọ ime ịkwụ ya ụgwọ nakwa ịlekọta ya rue mgbe ọ ga-amụ nwa.

Mgbe atụmatụ a ji bido

Ọ bụ n'afọ 1985 na mba Briten ka e bu ụzọ dekọọ na nwaanyị buuru onye ọzọ afọ ime ma mụọ nwa.

Kemgbe ahụ ọnụọgụgụ ndị na-eso usoro ịmụ nwa arịala elu ugboro anọ.

Mana iwu mba Briten kwuru na ọ bụ nwaanyị mụrụ nwa nwe nwa n'agbanyeghi nkwekọrịta ọbụla ya na nne na nna nwa ahụ nwere.

A bịa n'ala Naịjirịa nakwa ọtụtụ mba Afrịka ndị ọzọ, usoro a abụghị nke na-ewu ewu.

Ọ bụghịkwa nke anabatara anabata ebe niile maka ọtụtụ iwu gbadoro ụkwụ n'omenala nakwa okpukperechi.

N'agbanyeghi ya e nweela ọtụtụ ụlọọrụ, ụlọọgwụ nakwa otu dị icheiche na-enyere ezinaụlọ aka e ji ụsoro a amụ nwa ha.

'Surrogacy' e megidere iwu ala Naịjirịa?

Ụmụaka a mụrụ ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Images

O nweghi ebe enyere n'iwu ala Naịjirịa kwuru maka 'Surrogacy' nke pụtara na o megideghi iwu.

Mana ụfọdụ oge, a na-emecha nwaanyị buru afọ ime apụta ịzọ nwa ahụ m'afọ ole na ole gachaa.

Mana ọkaiwu Precious Nwankwo kọwara na o nwereike ibute nsogbu.

Ọ sị "ọ bụrụ na mgbe e mere nkwekọrịta na nwaanyị buru afọ ime kwetara ịnyefe ikike dịrị ya dịka nne, o nweghi ebe ọ gbadoro ụkwụ ịzọ nwa ahụ"

N'aka nke ọzọ, ọ bụrụ na nwaanyị enyefeghị ikike ruuru ya dị ka nne, o nwereike ịkpọrọ nwa ahụ n'ọdịnịhu.

"Ọ dochaghị anya etu ndị mmadụ si chee maka na ọ bụ okwu ụlọikpe ga na-ele anya n'iche n'iche, ihe dị mkpa bụ ihe dịịrị nwata ahụ mma" ka ọkaiwu Nwankwo kwuru.

Gịnị ka Omenala Igbo kwuru maka atụmatụ 'Surrogacy' a?

Nwa ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Images

Duruagwu Duke Olueze Ukaeje bụ otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara omenala Igbo tụpenyere azụ gbasara etu atụmatụ a na omenala Igbo si jekọọ.

N'otu aka, ọ kọwara na ọ bụrụ na di na nwunye enweghi ike ịmụta nwa, na nwoke ahụ ga-aga nụrụ nwaanyị ọzọ dịka omenala Igbo sị dị.

O kwukwara na usoro 'Surrogacy' n'onwe ya bụ nsọ ala n'ihi ụgwọ a ga-akwụ nwaanyị ahụ ga-eburu di na nwunye afọ ime.

N'aka ọzọ, o kwuru na nwa ọbụla e si n'usoro a mụ enweghi oke ọbụla furu ya n'ihi na ọ bụ ọbara nna ya ka o bu.

"O nweghi Dike ọbara ya adịghị na mba, n'ebe ọ bụ ọbara nwoke ahụ, ọ bụ nwa ya, o nwere nketa (oke)" ka o kwukwara.

Duruagwu kọwakwara na ebe Igbo nọ gbarụ ihu bụ maka ụgwọ a na-akwụ nwaanyị buru afọ ime. Ọ sị "ọ ga-adịzị ka nwaanyị a na-eresi ha nwa"

Mana ọghọm dị na ya bụ na nwata e si etu ahụ mụ agaghị enweike iche 'Nze' maọbụ 'Ozo' n'ihi na anụghị nne ha anụ.

Kedụ ihe ndị ụka chere maka nke a?

Nwa a mụrụ na mmiri

Ebe foto si, Getty Images

Otu ụka pụtara na-ekwusi ike na ha akwadoghi atụmatụ a bụ ụka Katọlik.

Fada Simon Eseni kọwara na ihe mere ha ejighi kwado ya bụ na nwoke ga-ezuteriri nwunye ya tupu ha amụọ nwa.

Usoro ọbụla agabasoghi nke a bụ nke ha jụrụ ajụ n'etiti ha.

Ihe ọzọ mere ha ji jụ nke a bụ na iwu kpuchiri ụka ha akwadoghi ịgbọ ncha nke bụ ụzọ e si ewepụta ahụ nwoke iji mezuo 'surrogacy' a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị