Kidnapping in Imo state: A tọhapụla otu n'ime igwe abụọ a tọrọla n'Imo steeti na Sọnde

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na a tọhapụla Eze Acho Ndukwe nke Amagu, Ihube, dị n'okpuruọchịchị Ọkigwe dị n'Imo steeti.
Michael Abatam bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti gwara BBC Igbo na Eze Ndukwe so na ndị a tọhapụrụ mgbe ụfọdụ ndị ọrụ nchekwa gara mwakpo ọgbọ ndị omekome dị n'okpuruọchịchị Orsu nakwa Uli dị n'okpuruọchịchị Ihiala dị n'Anambra steeti.
Eze Ndukwe bụ otu n'ime eze abụọ ndị ojiegbe tọrọla n'Okigwe ụbọchị Sọnde, 12 nke ọnwa Disemba, 2021.
Ndị ojiegbe atọrọla igwe abụọ n'Imo steeti, gbaa obi ha ọkụ

Ndị ojiegbe a na-amabeghi ndị ha bụ wakporo ma tọrọ igwe obodo abụọ dị n'okpuruọchịchị Ọkigwe dị n'Imo steeti, n'ụtụtụ Sọnde, Disemba 12, 2021.
Dịka ndị obodo ahụ si kwuo, ndị ojiegbe ahụ tọrọla Eze Acho Ndukwe nke Amagu, Ihube na Igwe Paul Ogbu nke Ihitte, Ihube, dịka ọ na-eweta aka ebe elekere 12 na elekere mbụ nke isi ụtụtụ Sọnde.
Ha gakwara n'ihu mụnye obi ha na ụgbọala ha ọkụ tupu ha apụọ.
Otu onye hụrụ mgbe ihe mere kwuru sị "Ihe mere n'isi ụtụtụ Sọnde dị egwu. Ha ji ụgbọala Hilux bịa tọrọ eze abụọ a ma gbaa ụlọ ha na ụgbọala ha ọkụ.
Ha tọrọkwara onyeisi ndị ntorobia obodo Ụmụlọlọ-Ọkigwe a na-amabeghi aha ya. Ha gakwara n'ụlọ Fabian Nwosu (bụ otu onyendu obodo) kwasasịa ya."
O kwukwara sị "Eze Ndukwe bụ eze nwere agba. Ọ bụ onyeisioche otu jikọtara ndị eze ọdịnala n'okpuruọchịchị Ọkigwe. Ọ bụkwa onye nwe ụlọ oriri na nkwari dị n'Ọkigwe. Mwakpo a gbara onye ọbụla gharị. Obodo ndị a nọ na mgbagwoju anya."
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Michael Abattam, kwuru na ndị uweojii amalitela ime nnyocha gbasara ihe mere.Cheta na ndị ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ bụ eze Atta dị n'okpuruọchịchị Njaba, tọrọ ma tọhapụ Damian Nwaigwe bụ eze Mbutu, n'izu gara aga.N'ọnwa Nọvemba, a tọrọkwara eze Henry Madumere nke Ezi-Mbieri dị n'okpuruọchịchị Mbaitolu.
Chetakwa na ndị ojiegbe wakporo nzukọ ndị igwe ọdịnala nọ na-eme na Njaba ma gbaa igwe ndị ahụ egbe, nke tara isi ndị eze abụọ ma merụọ abụọ ahụ.








