Imo State Attacks: 'Ekperima si ụlọmkpọrọ Owere gbapụta na ndị otu ya butere ọgbaghara n'obodo m'

Eze Kenneth Okereke na ụlọ ya a gbara ọkụ

Ebe foto si, Eze Kenneth Okereke

Igwe obodo Etekwuru dị n'Okpuru Ọchịchị Ohaji-Egbema bụ Eze Kenneth Okereke eboola ebubo na ọ bụ otu ekperịma si ụlọmkpọrọ Owere gbapụta na mmadụ atọ ndị ọzọ bụ ndị gburu onye agha kpalitere ọgbaghara e ji suo obi ya ọkụ.

Okereke kwuru nke a n'akwụkwọ mkpesa o degara Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma ịkọwa etu ndị omekome siri gbuo otu onyeagha ma gbaa ụlọ ya ọkụ n'obodo ahụ na nsonso a.

Ndị omekome wakporo obi Eze Kenneth Okereke n'ụbọchị 21 nke ọnwa Oktoba gbaa ụlọ ya na ụgbọala ya ọkụ, ebe eze ahụ na nwunye ya zọtara isi ha dịka ha gbara ọsọ ndụ.

Eze Okereke kọwara na "abalị 19 nke ọnwa Oktoba afọ 2021 n'ebe Elekere asatọ nke abalị, anụrụ m ka egbe na-ada."

Eze ahụ sị na dịka eze ọdịnala obodo, na ya jụrụ ese ebe ụda egbe ahụ si were nweta ozi n'otu nwoke atụbụrụ mkpọrọ maka iji egbe ezu bụ onye siri mkpọrọ Owere gbapụta oge a wakporo ya na mmadụ atọ ndị ọzọ kpọrọ ndị otu ha ga gbagbuo onye agha nọ ọrụ.

O kwuru na ngwangwa ya nụrụ na e gburu onyeagha, na ya gara nye ndị isi ogige ndị uweojii mpaghara Egbema (DPO & Area Commander) mkpesa.

Eze Kenneth Okereke

Ebe foto si, Kenneth Okereke

O kwuru na dịka ya na ndị isi uweojii kpachara na ha soro ya gaa ebe ya bụ ihe mere.

Ọ gara n'ihu kwuo na dịka ya na ha na-akpa, ndị agha bụ ụgbọala ha bịakwudoro ha, ha na ndị isi uweojii ahụ nwee kparịtara ụka nke ya esonyeghị nke ya na ama ihe ha kpara.

Mana ka ndịagha ahụ pụrụ, ndị otu ha ọzọ bu ụgbọala ha na otu onye ha kwuru na o so na ndị gburu ogbo ha ha nwuchiri n'obodo ọzọ dịka ọ na-agba ọsọ bịa.

Eze Okereke sịrị, "Ha buru ya gaa n'ụlọ ya ga nyochaa ya ma kpụrụkwa ya gaa n'ụlọ n'ụlọ na-agba be ndị mmadụ ọkụ, ikekwe iji gosi iwe ha maka onye otu ha e gburu."

O kwuru na dịka ya lachigharịrị n'ogige ndị uweojii ide akwụkwọ mkpesa na ihe ndị agha mebiri n'obodo ya, ya nwetara mkpesa n'ekwentị ya na ndị agha egbuola nwa okorobịa ahụ ha nwụchiburu.

Eze Okereke onye gọrọ na ọ bụghị ya metara ihe ndị agha jiri bịa sunye ụfọdụ ụlọ dị n'obodo ha ọkụ sịrị: ọ bụ ekperima a na-enyo enyo bụ onye nwanne ya nọ n'ọrụ uweojii gwara ya na ọ bụ bụ eze nyere ndị agha ozi ha jiri gbaa ụlọ na ndị otu ya bịara gbaa obi m ọkụ."

O kwuru na ọ bụ n'abalị 21 nke ọnwa Oktoba nke bụ abalị abụọ e jiri gbucha onyeagha ka a gbara obi ya ọkụ nakwa ụgbọala ya.

Etu ndị omekome si wakpoo ụlọ eze ọdịnala n'Ohaji-Egbema, gbaa ụlọ na ụgbọala ya ọkụ

Ngwuru Eze Kenneth Okereke

Ebe foto si, Eze Kenneth Okereke

Nkọwa foto, Ngwuru Eze Kenneth Okereke

Ndị ekperima awakpoola obi bụ Eze Kenneth Okereke, bụ eze obodo Etekwuru dị n'okpụrụ ọchịchị Ohaji-Egbema nke Imo Steetị, gbaa ụlọ ya na ụgbọala ya ọkụ.

Akụkọ kwuru na mwakpo ahụ mere n'ụzọ ụtụtụ ụbọchị Tọzde, oge ndị a mabeghị ndị ha bụ wakporo obi ya bụ eze.

Ụgbọala Eze Kenneth Okereke a gbara ọkụ

Ebe foto si, Eze Kenneth Okereke

Eze Okereke ji olu akwa gwa BBC Igbo na ọ bụ naanị obante ka o yi mgbe ndị mmadụ gbara gbapụta ya na Ugoeze ya, kpọga ha ụlọọrụ ndị uweojii nọ na Mmahu, Imo Steetị.

Nke a na-abịa dịka ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị agha na ndị ntorobịa obodo ahụ n'ụbọchị Wenezde.

Ụlọ Eze Kenneth Okereke

Ebe foto si, Eze Kenneth Okereke

E kwuru na ọgbaghara a butere ọnwụ otu onye agha Naịjịrịa ma butekwa ịgba ụlọ ole m ole ọkụ n'akụkụ ebe ahụ.

Ndị bi ebe ahụ kwuru na ọ bụ aka ike ndị agha nọ ebe ahụ ji eso ha bụ ikpalitere ya bụ ọgbaghara.

Mkpamkpa dị kpara n'ụbọchị ikpe Nnamdi Kanu n'21/10/2021:

Mwakpo mere n'Arochukwu ataala isi mmadụ anọ

Ndị otu Ipob

Ebe foto si, ABNtv

Ndị ntoroọbịa atọ a na-enyo na ha bụ ndị otu Ipob na otu onye agha anwụọla dịka ha kwarịtara mgbọ n'Arochukwu dị n'Abia steeti.

Ndị bi ebe ahụ ihe mere na-achọghị ka a kpọọ aha ha gwara BBC Igbo na ndịagha na ndị a sị na ha bụ ndị otu Ipob na-amanye ndị mmadụ iwu onye nọrọ n'ụlọ maka ikpe Maazị Kanu ụbọchị Octoba 21, 2021 kwara mgbọ.

Otu onye agha nwụrụ n'ime ọgbaghara, ebe e gburu mmadụ atọ n'ime ndị na-ebuso ha agha.

Ndị a na-enyo na ha bụ ndị Ipob

Ebe foto si, ABNtv

Ndị nọ ebe ihe mere kwukwara na ebe oge elekere abụọ nke ehihe na ha hụrụ ndị ntorobịa ole m ole kpuchiri ihu, nyara ọgbatumtum gbafere be ha nke menyere ha ụjọ.

N'okwu ha, ha kọwara sị: "Ka ndị ntorobia ndị gbafechara, anyị malitere nụwa ụda egbe na-ebe ndị agha na ndị ọrụ nchekwa na-eme nnyocha ụgbọala(checkpoint) na ọgbatumtum n'Oror."

Ndị a na-enyo na ha bụ ndị Ipob

Ebe foto si, ABNTV

Nkọwa foto, Ndị a na-enyo na ha bụ ndị Ipob

Ha gaara n'ihu kwuo na "Ebe nnyocha a nọ n'ihu Obi Eze Aro bụ ebe ya bụ mkpamkpa kpara."

Mbọ anyị gbara ịnụta olu ndị uweojii Abịa steeti amịtaghị mkpụrụ dịka ọnụ na-ekwuru ha azabeghi ekwentị ya rue mgbe anyị na-ebipụta akụkọ a.

Etu ndị 'Unknown gunmen' si wakpoo ogige ndị uweojii n'Isiala Mbano

Ogige Ndị uweojii Isiala Mbano

Ebe foto si, Nigeria Police

Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ọ bụ ndị omekome ha na-enyo na ha bụ ndị Ipob na ESN wakpporo ogige ha dị na Isiala Mbanọ ma gbaa ya ọkụ n'abalị 21 nke ọnwa Oktoba afọ 2021.

Ndị ekperima wakporo ụlọorụ ndị uweojii dị n'Umuelemai nke Isiala Mbano, Imo Steetị, malite ịgba egbe aghara aghara ma gbaa ya ọkụ ma tọhapụ ndị ndị nọ na nga..

Ndị ka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Michael Abattam si kwuo na akwụkwọ ozi o binyere aka, kwuru na ndị omekome zunyere ebe mgbo egbe tụrụ otu onye otu ha dịka ha na-akwarịta mgbọ.

" N'abalị 211 nke ọnwa Itoolu nke afọ 2021, ndị ekperima bu egbe a na-enyo na ha bụ ndị Ipob/ESN ji ụgbọala ise, na ọgbatumtum abụọ n'ogige Ndị uweojiii Isiala Mbanọ ka ọ fọrọ nkeji iri na isii ka ọ kụọ Elekere asaa nke mgbede were komkom mmanụ ụgbaala tụnye ọkụ n'ogige ahụ."

Abattam sị na ndị ọrụ ha na ndị uweojii ahụ kwarịtara mgbọ ha gbala mana ụgbọ tụrụ otu onye ọrụ ha.

Nke a mere tupu ọ na-akụ ihe dịka elekere asaa nke abalị ụbọchị Tọzde mgbe

Akụkọ sị na ụfọdụ ndị uweojii nọ n'ọrụ gbara ọsọ nke mere ha jiri nwee ohere ịgba ụlọọrụ ahụ ọkụ.

Otu onye obodo ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara onye ntakụkọ anyị na egwu jupụtara onye ọbụla ahụ n'ihi ụda egbe a gbara ebe ahụ.

Ọ sị na ha na-agba mbọ imenyụ ọkụ ahụ ka ọ ghara imerụ onye ọbụla ahụ.

Tupu akụkọ a na-apụta, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steetị bụ Michael Abattam ekwubeghi ihe ọbụla banyere ya.

Cheta ndị ojiegbe gbakwara otu ụlọorụ a ọkụ n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Maachị ma tọrọ onye uweojii nwaanyị nọ n'ọrụ.

Mwakpoo ụgbọala gwongworo na otu ụlọ ahịa n'Enugu

Ụgbọala 'tanker' ndị ekperima gbara ọkụ n'Enugwu
Nkọwa foto, Ụgbọala 'tanker' ndị ekperima gbara ọkụ n'Enugwu

Akụkọ kwuru na agbara otu ụgbọala 'tanker' ọkụ na mphaghara Emene nke Enugu steetị ma gbakwa otu ụlọ ahịa ọkụ na-ebe ahụ.

Daniel Ndukwe bụ ọnụ n'ekwuru ndị uweojii na steetị ahụ gwara BBC Igbo na ya bụ nwakpo mere n'ezie.

O kwuru na ọ bụ n'isi ụtụtụ ụbọchị Tụzde ka ndị omekome wakporo ụgbọala gwongworo 'mack' bu mmanụ 'Diesel' n'Eke-Obinagu Emene Enugu State.

O kwukwara na ha amalịtela nnyocha iji chọpụta ndị mere ya bụ ihe.