Orlu Attacks in Imo Steetị: Ihe ndị uweojii kwuru maka ihe mere n'otu ụlọ oriri dị n'obodo ahụ

Ndị e chere na ha bụ ndị wakporo ụlọọrụ ndị uweojii na Njaba nakwa Omuma

Ebe foto si, Imo State Police

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị uweojii Imo Steetị sị na ha gaara n'otu ụlọ oriri dị n'obodo Orlu bụ ebe ha chere na ndị ekperima wakpoo ụlọọrụ ha dị na Njaba zoro we mee mwakpo ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ha bụ Michael Abbattam sị na ọ bụ otu onye n'ime ndị omekome a ha nwuchiri gbaara ha ama.

Ọ sị na ọ bụ n'ụlọ oriri ahụ ka ndị ekperima a nọ kpaa nkata bịa wakpoo ụlọọrụ ha dịka onye ekperima ahụ si kwuo.

Abbattam sị na ọ gbakwara ama na onye nwe ụlọ oriri ahụ na-enye ha nkwado ego na ihe ndị ọzọ.

Ọ sị nke a mere ndị uweojii jiri gaa n'ụlọ oriri ahụ nakwa n'ụlọ nwoke ahụ nwe ya, wee chụsaa ndị nọ ebe ahụ ma nwuchie ndị ekperima nọ ebe ahụ.

Aha onyonyo, Orlu Crisis: Ndị uweojii na ndị agha nọchiri ụzọ esi aba Orlu

Akụrụngwa ndị ha wepụtara n'ụlọ ndị a gụnyere; egbe AK47 na mgbọ ya, egbe 'pump action' ise, egbe 'double barrel' obere abụọ.

Ihe ndị ọzọ bụ egbe 'double barrel' ogologo anọ, egbe 'single barrel' anọ, ọgwụ ọtụmọkpọ, ọkọlọtọ na okpu ndị Biafra, akpa anwụrụike abụọ, na uwe ndịagha anọ.

Cheta na ihe onyonyo si na soshal midia gosiri ka a gbara otu ụlọ oriri na ụlọ ndị ọzọ ọkụ n'Ọrlu n'ụbọchị Sọnde.

Mana site n'ozi ndị uweojii wepụtara, ha ekwughi maọbụ ha wakporo ụlọ oriri ahụ ma gbaa ya ọkụ.

Ebe niile mkpamkpa kpara n'ọwụwa anyanwụ n'izu a gwụchara

Otu ebe a ma ama n'obodo Orlu

Ebenebe gburu n'akụkụ owụwa anywanwụ dị icheiche n'izụuka gwụrụ n'ụbọchi iri atọ nke ọnwa Julai.

Ogbugbu, mwakpo nakwa ịgba ụlọ ọkụ nke malitere n'izu ahu sọkwa bata na ngwụcha ya.

Lee nchịkọta nke BBC Igbo mere gbasara nke a:

Imo steeti

1.Okporo n'Orlu

Imo steeti bụ ebe ọ kacha kpoo ọkụ dịka awakporo otu ụlọ oriri n'obodo Okporo Orlu dị n'ebe ahụ ọkụ.

Nke a mere n'ụzụ ụtụtu ụbọchị Sọnde ka nke a mere dịka ndị amaghị gbara ụgbọala nakwa ọgbatumtum ọkụ.

Ụjọ mekwara ka ndị mmadụ bi n'akụkụ ebe ahụ gbapụ ọsọ ndụ dịka ha chere na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa mere nke a.

O nwebeghi ihe ndị uweojii nke steeti ahụ kwuru maka ihe a mere.

Lee ihe BBC Igbo chọpụtara mgbe anyị agara ebe ahụ n'ihe onyonyo a.

Skip Facebook post, 1

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 1

2. Okwudor - Njaba

Ebe ọzọ akụkọ selitere isi bụ n'obodo akpọrọ Okwudor na Njaba dị n'Imo steeti.

O mere n'okporoụzo si Owerri gawa Orlu dịka a ka na-atụ anya na ndị uweojii ga-ewepụta ozi gbasara ya.

Ọ bụ ebe a na-ekwu na egbupuru otu onye na-akwọrọ onwe ya ụgbọala isi ma gbaa ya ọkụ n'ime ụgbọala ya.

Mgbe BBC Igbo gara ebe ahụ, anyị chọpụtara na ndị na-azụ ahịa mkpụrụ osisi n'okporoụzọ ahụ agbapụla ọsọ.

Ha gbahapụrụ ngwa okpokoro ha ji akpọwa ahịa ha n'ebe ahụ dịka ọ dị n'onyonyo a.

Skip Facebook post, 2

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 2

3. Owerri

Skip Facebook post, 3

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 3

Akụkọ ọzọ mere n'Owerri bụkwa maka nne otu onye enyemaka mgbasaozi gọọmentị Imo steeti bụ Ambrose Nwaogwugwu.

O kwuru na nke a mere n'ụtụtụ ụbọchị Fraịde dịka ndị omekome ji mma bekasịrị nne ya ahụ na be ya dị n'Owerri

Nwaanyị ahụ mechara nwụọ n'ụlọọgwụ ebe a nwara izọ ndụ ya mana azọtaghị ya.

N'ozi nkwanye ugwu o deere nne ya, o kwuru sị "ị lụrụ ọgụ ndụ gị, mana oke ahụ mgbu karịrị akari".

Ebonyi Steeti

Akụkọ kwuru na o nwere otu onye otu nchekwa Ebubeagu agbagburu n'Ebonyi steeti.

Mgbe BBC Igbo kpọturụ ndị uweojii na steeti ahụ, ha kwuru na o nweghi ihe dị etu ahụ mere.