Orlu Timber Market: "Ọ bụghị gọọmentị Imo ka ọ dịịrị ịza ajụjụ mmechi 'timber market'

Ọdọahịa Timber dị n'Orlu, Imo Steetị

Kọmịshọna mgbasaozi n'Imo Steetị bụ Declan Emelumba sị na 'ọ bụghị gọọmentị Imo ka ọ dịịrị ịsa ajụjụ mmechi a sị ndị agha mechiri 'timber market' dị n'Orlu.

O kwuru nke a mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ya iji nụrụ ihe gọọmentị nwere ikwu maka mmechi ọdọahịa ahụ kamgbe Tuzde.

Ọ sị ka a jụọ ndị agha ihe mere ha jiri gbachie ụlọahịa ahụ ma ọ bụrụ ha gbachiri ya n'ezie okwu.

Mana cheta onye ntaakụkọ BBC Igbo gaara n'ọdọahịa osisi dị n'Orlu ma chọpụta na ọ ka gbachiri agbachi ruo ugbua dịka ndị agha Naijirịa mechiri ya n'ụbọchị Tuzde.

Ụlọahịa Timba ndị agha Naịjirịa kpọchịrị n'Imo steeti emepebeghị ruo ugbua
Nkọwa foto, Ụlọahịa Timba ndị agha Naịjirịa kpọchịrị n'Imo steeti emepebeghị ruo ugbua

O kwuru na ọ hụrụ ụfọdụ ndị ahịa nọ ebe ahụ ka ha nọ n'ụjọ.

Ndị agha mechiri ọdọ ahịa akụrụngwa eji arụ ụlọ abụọ nọ n'Orlu kama ha mechara nye ndị nke ọzọ ikike imepe mana ha ekweghị ka ndị nke na-ere osisi meepee.

Otu onyeisi ahịa nke ọzọ gwara BBC Igbo na ọ bụ maka ụda egbe a gbara n'ahịa n'ụbọchị Mọnde mere ndị agha jiri gbachie ahịa abụọ a.

Ọ gara n'ihe kwuo na ọ bụ mgbe ndị agha chọpụtara na ọ bụ n'ahịa ndị na-ere osisi ka a gbara ya bụ egbe mere ha jiri nye ha ikike imepe.

Dịka ọ dị ugbua, ahịa ndị a na-ere osisi bụ ọgbọ osisi ka mechiri emechi.

Ndị agha Naijirịa

Ebe foto si, Getty Images

N'aka nke ọzọ, ka akụkọ na-ekwu na ọtụtụ ndị ahịa ekweghị ịmepe ụlọahịa ha n'ụbọchị Mọnde iji kwado Nnamdi Kanu dịka a kpere ikpe ya n'Abuja n'ụbọchị Mọnde ahụ.

Aha onyonyo, Orlu Crisis: Ndị uweojii na ndị agha nọchiri ụzọ esi aba Orlu

Ya bụ akụkọ na-ekwu na ọ bụ ihe ndị ahịa a mere kpasuru ndị agha iwe ha jiri sị ha emepela ahịa n'ụbọchị Tuzde.