Dave Umahi' s Ebubeagu: Ihe Ohaneze kwuru maka Ebubeagu Umahi hiwere

Ebe foto si, George Obiozor,Ebubeagu na Umahi-Facebook
Otu Ohaneze Ndigbo ebunyela Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi ụkpa ekele maka ihiwe otu Ebubeagu na steeti ya.
N'ozi otu ahụ wepụtara n'ụbọchị Tọzde, nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Alex Ogbonnia binyere aka, Ohaneze jara Umahi ike maka 'Ịka obi ,nwee nkwuwa okwu ịkwalite ọdịmma Ebonyi.
Ohaneze kwuru na otu nche " Ebubeagụ nwere ihe jịkọrọ ha na ezinaụlọ, ogbe , ndị isi otu 'town union' na ndị eze ọdịnala obodo niile dị iche iche ebe ha na-arụ".
" Ọ bụ Iiikọ aka ọnụ nke obodo ọbụla bụ ihe mere ka Ebubeagụ bụrụ ọpụrụiche."
Cheta na nsonso a, otu Ohaneze kpọrọ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ọkụ ka ha mezuo nkwa ha kwere ihibe Ebubeagụ tupu abalị ikpeazụ nke ọnwa Disemba, afọ 2021.
Umahi ehiwela Ebubeagụ n'Ebonyi steeti, sị: Ebubeagu ga-azọpụta Ebonyi n'aka ndị Ipob- Umahi

Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi emeela emume nhiwegharị otu nchekwa Ebubeagu n'Abakaliki, isiobodo Ebonyi Steeti n'ụbọchị Wenezde.
Nke a na-eme na-agbanyeghị na ndị otu Ipob dọrọ aka na ntị ka a hapụ ihiwe otu Ebubeagu n'Ọwụwa Anyanwụ.
N'okwu ya na mmemme ahụ, Umahi kọwara na ihe ruru pasentị ndị Gọvanọ iri isii binyere aka were kwado nhiwe Ebubeagụ.

Ebe foto si, Google
Ọ rụtụrụ aka na Ebubeagu ga-azọpụta steeti ahụ nakwa Ọwụwa-Anyanwụ na nkwada akụnaụba nke mkpamkpa ndị Ipob na ndị omekome weterala na steeti ahụ.
O kwukwara sị, " Onye ọ na-amasịghị chọrọ ụzọ pụọ. Ebubeagu ga-erubere ndị uweojii isi, anyị ga-eso iwu na ntuziaka Kọmịshọna ndị Uweojii".
Umahi kwuru na enweghị ihe gbasara Ebubeagu na ndọrọndọrọ ọchịchị.
Umahi kwuru sị, " Maka ndị na0ebute ọgbaaghara na ndị na-atụ Ebubeagu egwu gaa ụlọikpe mee mkpesa ha n'ihi na agaghị akwụsị Ebubeagu".

Ebe foto si, Empics
Umahi sị, "Ihe ndị Ipob na-eme n'Ebonyi steeti akụdala ọnọdụ akụnaụba Ebonyi steet, mana ọ bụ Ebubeagu ga-azọpụta aha anyị ma nye ndị omekome na-akpa ike n'Ọwụwa Anyanwụ ọsọ" .
O kwuru na na-agbanyeghị na ndị Ipob sị na ha akwụsịla mkpamkpa ọbụla mana ndị omekome ka na-akpa ike n'ọwụwa anyawnụ.
Ọ gara n'ihu kwuo sị, "Ndị ọchịchị n'ọwụwa anyanwụ agaghị agbachi nkịtị ihe a na-emebi, ha ekwuola ka ndị ntoroobia nọ n'ime ọhị pụta ka e kpee udo".
Umahi kọwara na ndị Gọvanọ ọwụwa anywnụ ekweela nkwa na ha ga-akwado Ebubeagu nke ọma.

Gọvanọ Umahi, gbara ama na Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-eme njem nleta n'Ebonyi Steeti n'ọnwa Januwarị afọ 2022.

O kwuru sị, "Ọ bụ Ebubeagụ ga-enyere onyeisiala Muhammadu Buahrị aka maka ọrụ ya na nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ".











