Kidnapped Imo monarch: Atọhapụla Aloy Igwe bụ Eze obodo Umuezeala-Ama dị n'Imo steeti

Njirimara okpuruochichi ahu

Ebe foto si, Ehime Mbano Diaspora/Facebook

Atọhapụla Aloy Igwe bụ Eze obodo Umuezeala-Ama dị n'okpuruọchịchị Ehime Mbano nke Imo steeti, onye atọrọ n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Disemba

Otu onye bụ onye obodo ahụ na-achọghị ka akpọ aha ya gwara BBC Igbo na atọhapụrụ Eze obodo ha bụ Aloy Igwe n'ụbọchị Wenezde, December 22, 2021.

Ka o si kwuo: "Igwe anyị alọta ụlọ ya, atọhapụla ya n'ezie ọ lọghachitere na mgbede ụbọchị Wenezde."

"Ndị obodo anyị gwara ndị ntọ ahụ na anyị enweghi ego mgbapụta, na Igwe anyị ka lichapụrụ nne ya n'ọnwa gara aga."

BBC Igbo nụkwara akụkọ na a kwụrụ nnụkwụ ego tupu atọhapụ Igwe ahụ mana ndị kwuru nke a ekweghi ka akpọọ aha ha ma ha ekweghi kwuo ego ole ha sị akwụrụ.

Cheta na atọọrọ Igwe Aloy ebe ya na ndị otu ya nọ na-akpa nkata n'ahịa Nkwo-Umuezeala n'ụbọchị 14 Disemba.

Nke a mere dịka ụbọchị abụọ gachara ebe a tọọrọ Eze obodo abụọ bụ Acho Ndukwe na Paul Ogbu n'obodo Ihube dị n'Imo steeti. Cheta na agbakwara ụgbọala ha ọkụ.

Ndị ọrụ nchekwa gbapụtara Eze Acho Ndukwe oge ha busoro ndị omekome agha n'Orsu, mana ndị ekperima ahụ Eze Paul Ogbu na otu onyeisi ndị ntorobịa obodo ahụ.

A hụrụ ozu ha abụọ n'ime ndị ọzọ n'olulu ndị omekome ahụ tọgbọrọ ha.

'Obi adịrọ Nnamdi Kanu mma maka ihe na-eme n'Imo steeti ugbua'- Ipob

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Ọnụ na-ekwuru Indigenous People of Biafra bụ Emma Powerful ekwuola na ụmụntorobịa kwuru na Nnamdi Kanu gwara ha gbuo ndị igwe na-achọghị ka Biafra bia, abụghị ndị otu Ipob.

O boro gọvanọ Hope Uzodimma na-achị Imo steeti ebubo na ọ bụ ya kwụrụ ụmu ntoroọbịa ahụ ụgwọ ha kwuo na ọ bụ Ipob na-egbu ndị igwe n'Imo steeti.

N'ọnụ ya, "Ihe gbasara ndị igwe awụghị ọrụ anyị maọbụ ebe anyị gbadoro ụkwụ, obi adịrọ Nnamdi Kanu mma ebe ọ nọ maka ihe na-eme n'Imo steeti."

O kwuru na ụbọchị Kanu kepụtara Eastern Security Network , ebumnuche ya bụ ka ha wakpoo ndị ọchị ehị na-enye ala Igbo nsogbu.

"Nnamdi Kanu si n'ezinụlọ ndị igwe, kedụ ka o ga-esi kwenye n'ogbugbu ndị igwe."

Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta n'ọnụ gọọmenti Imo steeti kpụrụ n'ala makana ekwenti onye mgbasaozi steeti ahụ Nwachukwu Oguike agaghị

'Nnamdi Kanu si anyị gbuo ndị igwe na-achọghị ka Biafra bia'

Onyonyo na-efegharị gosiri ebe ụmụntorobịa na-amaja ndị igwe abụọ

Ebe foto si, Screen grab

Nkọwa foto, Onyonyo na-efegharị gosiri ebe ụmụntorobịa na-amaja ndị igwe abụọ

Ihe onyonyo na-efegharị na-egosi ụmụ ntoroọbịa ebe ha ji egbe e yi ndụ ndị Igwe abụọ si Imo steeti.

Otu n'ime ndị igwe ahụ ka emechara hụ ozu ya n'ahịa ihitte Ihube dị n'Imo steeti.

Otu onye n'ime ndị ntoroọbịa ahụ ji egbe emekpa ndị igwe abụọ ahụ n'ime onyonyo a na-efegharị na soshal midia kwuru na Nnamdi di Kanu si ha gbuo ndị igwe na agbụrụ ha ọbụla na-achọghị ka Biafra bia.

Ha jikwa egbe ha na-adụ ndị igwe ahụ n'ọnụ ma na-amaja ha na ha ga-egbu ha n'ime onyonyo ahụ.

Aha onyonyo, Insecurity: Nwaamadị a sata asịsa otu o si banye ESN

A hụla ozu Igwe obodo Ihitte Ihube a tọrọ

Igwe Paul Ogbu

Ebe foto si, Okigwe TV/Facebook

Ndị omekome egbuola Igwe obodo Ihitte Ihube nke nọ n'okporoọchịchị Okigwe n'Imo steeti Igwe Paul Ogbu na onyeisi ndị ntorobịa obodo ahụ.

Ọ bụ mgbe ndị ọrụ nchekwa gbapụtachara ụfọdụ ndị a tọọrọ n'ọdọ ndị omekome n'Okpuru Ọchịchị Orsu n'ụbọchị Mọnde ka ha gaghachiri ebe ahụ were nyochapụta ozu Igwe ahụ, onyeisi ndị ntorobịa na ndị ọzọ..

Cheta na ndị ojiegbe amabeghi ndị ha bụ tọrọ Igwe Ogbu, Igwe Acho Ndukwe nakwa onyeisi ndị ntorobịa obodo ahụ n'ụbọchịụka.

Ndị obodo ahụ kwuru na taa bụ ụbọchị Tọzde ka e hibere ili ozu Igwe Ogbu dịka ndị ọrụ nchekwa bulatara ozu ya taa.

Dịka ndị ọrụ nchekwa gbara mbọ gbapụta Igwe Ndukwe n'ụbọchị Mọnde n'ogige ndị omekome n'okpuruọchịchị Orsu nakwa na Uli, a hụrụ ọtụtụ ozu ndị mmadụ n'ime olulu.

Otu onye bụ onye obodo ahụ na-achọghị ka akpọọ aha ya gwara BBC Igbo na Igwe Ndukwe nke ndị ọrụ nchekwa gbapụtara n'aka ndị omekome n'ụbọchị Mọnde gbara ama na ndị omekome ahụ gburu Igwe Ogbu na onyeisi ndị ntorobịa obodo ahụ n'ihu ya.

Cheta na mgbe a tọrọ Igwe a n'obi ya n'ụbọchịụka na ndị omekome ahụ gbakwara ụgbọala ya ọkụ.

A tọrọla Igwe ọzọ n'Imo Steetị

Njirimara okpuruochichi ahu

Ebe foto si, Ehime Mbano Diaspora/Facebook

Akụkọ si Imo steeti eru BBC Igbo ntị na-ekwu na atọrọla Igwe nke obodo Umuezeala - Ama dị n'okpuruọchịchị Ehime Mbano nke Imo steetị.

Ndị bi ebe ahụ na-achọghị ka akpọọ aha ha gwara BBC Igbo na ihe a mere na mgbede ụbọchị Tuzde ebe Igwe ahụ na ndị ikwu na ibe ya na akpa nkata n'etiti ahịa Umuezeala.

Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị ji egbe bu ụgbọala mapụtara gwa ya banye ụgbọala ha bu pụta ebe ahụ.

Kemgbe ọ banyere ya bụ ụgbọala ruo ugbua, enwebeghi ihe anụrụ maka ya.

Ugbua, ụjọ ji ndị obodo ahụ maka ihe a mere. Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnụ ọnụ ndị uweojii banyere akụkọ a amitabeghi mkpụrụ ruo ugbua.

Cheta na nke so na ndị Igwe ndị ọzo atọrọla n'Imo steeti dịka ya bụ ntọrọ ndị Igwe na-ezo ka mmiri agharaaghara.

Lee ndị igwe ndị ọzọ atọrọla n'Imo steeti n'oge gara aga n'afọ 2021.

Eze Charles Iroegbu bụ ya nwe ụlọọrụ ụgbọala 'All States Mass Transit'

Ebe foto si, Chibuzor Ekenze

Nkọwa foto, Ọ bụ Eze Charles Iroegbu nwe ụlọọrụ ụgbọala 'All States Mass Transit'

Imo steeti abụrụla chi bọọ a nụ ọzọ ugbua, ọkachasị ebe ọ metụtara ndị eze ọdịnala.

Kemgbe ọnwa ole na ole, ụzụ na-atụ n'Imo steeti bụ ntọrọ ndị eze ọdịnala ndị a; ụfọdụ oge ọ bụrụ maka ogbugbu e gburu ha.

Otu ihe jikọtara ntọrọ na ogbugbu ndị eze a, bụ ndị ojiegbe na-akpa mkpamkpa na steeti ahụ a kpọrọ 'unknown gunmen' na Bekee.

Ụfọdụ oge, ọ naghị ebi naanị n'ịtọrọ ndị eze a, ha na-agakwa n'ihu mụnye ma ụlọ ma ụgbọala ha ọkụ.

Lee ndị eze ole a tọrọla ma tọhapụ maọbụ gbuo n'Imo steeti na 2021

Igwe Damian Nwigwe

A tọrọla Igwe Damian Nwigwe bụ igwe Mbutu dị n'okpuruọchịchị Abọh Mbaise, n'abalị itoolu nke ọnwa Disemba 2021, mana e mechara tọhapụ ya n'ụbọchị 11.

Dịka nwa ya nwoke gwara BBC Igbo, ha kwụrụ ụgwọ ntọhapụ tupu ndị omekome a atọhapụ ya.

Eze Edwin Azike

Ndị omekome tọrọla Eze Edwin Azike bụ eze ndị Atta dị n'okpuruọchịchị Njaba, n'abalị itoolu nke ọnwa Disemba, mana e mechara chọta ozu ya echi ya.

A chọtara ozu Eze Azike n'ime ahịa obodo ha ebe ndị gburu ya tọgbọrọ ya.

Ruo mgbe e dere akụkọ a, enwebeghi onye a nwụchiri maka ọnwụ Eze Azike.

Eze Acho Ndukwe

A tọrọla Eze Acho Ndukwe nke Amagu, Ihube, dị n'okpuruọchịchị Okigwe n'ụtụtụ Sọnde, Disemba 12, 2021.

Ndị obodo ahụ kwuru na ndị ojiegbe a mụnyekwara obi ya na ụgbọala ya ọkụ.

Igwe Paul Ogbu

A tọrọla Igwe Paul Ogbu nke Ihitte, Ihube, dị n'okpuruọchịchị Okigwe n'ụtụtụ Sọnde, Disemba 12, 2021.

A gbakwara obi ya na ụgbọala ya ọkụ.

Eze Charles Ndubuisi Iroegbu

Eze Charles Iroegbu bụ ya nwe ụlọọrụ ụgbọala 'All States Mass Transit'

Ebe foto si, Chibuzor Ekenze

Nkọwa foto, Ọ bụ Eze Charles Iroegbu nwe ụlọọrụ ụgbọala 'All States Mass Transit'

A tọrọla Eze Charles Ndubuisi Iroegbu bụ eze ndị Umuezie Nguru Autonomous Community, dị n'okpuruọchịchị n'Aboh Mbaise, n'abalị isii nke ọnwa Juun 2021, mana e mechara tọhapụ ya ka abalị anọ gachara.

A tọrọla ya n'ụzọ, dịka ya na ụfọdụ ndị ime obi ya si Mbanọ ebe ha gara agbamnkwụ na-alọta.

E mechara tọhapụ ha mana a maghị ma ha akwụrụ ụgwọ mgbapụta tupu ha apụta.

Eze Henry Madumere

A tọrọla Eze Henry Madumere nke Achi, Ezi-Mbieri dị n'okpuruọchịchị Mbaitolu, n'abalị 19 nke ọnwa Nọvemba, 2021.

Ndị hụrụ ka ihe mere kwuru na a tọrọla ya n'ụzọ mgbe ọ na-aga akwamozu.

E mechara tọhapụ ya ka abalị ise gachara, mana amaghị ma a kwụrụ ụgwọ mgbapụta tupu o nwere onwe ya, maọbụ a kwụghị.

Chetakwa na ndị ojiegbe wakporo nzukọ ndị igwe ọdịnala nọ na-eme na Njaba ma gbaa igwe ndị ahụ egbe, nke tara isi ndị eze abụọ ma merụọ abụọ ahụ.