Breast pain: 'Ovulation', ara ibu ibu, inye nwa ara na ihe ndị ọzọ nwere ike ibute ara ịfụ nwaanyị ụfụ

Ara nwaanyị

Ebe foto si, @thedorathybachor/Instagram

Ọtụtụ ụmụnwaanyị nwere mgbe ara ha na-afụ ha ụfụ. Ihe na-akpata ya dị iche n'iche n'ebe ụmụnwaanyị nọ.

Ụfọdụ ndị mmadụ na-eche na mgbe ọbụla ara na-afụ nwaanyị ụfụ, na ọ bụ maka ọrịa kansa maọbụ ọrịa ndị ọzọ. Mba! Ara ifụ nwaanyị ụfụ abụghị naanị mgbe o butere ọrịa.

Dịka dọkịnta Udodi Okoli siri kọwa, ihe nwereike ime ka ara na-afụ nwaanyị ụfụ dị ọtụtụ.

O nwereike bụrụ mgbaama ọrịa, maọbụ ihe ọzọ na-abụghị ọrịa dịka ara ibu oke ibu na nwaanyị eyighị akpa ara dị mma nke ndị Bekee na-akpọ bra.

Udodi Kachikwuru OKOLI (MBBS, MSc. Public Health, Registrar, Internal Medicine, Univeristy of Uyo Teaching Hospital)

Ebe foto si, Udodi Kachikwuru OKOLI

2. Nwaagbọghọ Chimamanda Okafor sị na ara ya na-afụkarịrị ya ụfụ mgbe ọbụla ahụ ya nọ n'ihe ndị Bekee na-akpọ 'ovulation'.

Ọ sị na ahụ ya ga na-eme ya ka ọ gakwuru nwoke ka ha nwe aramara.

Nwaanyị na-achọ ka ya na nwoke nwe mmekọ

Ebe foto si, Getty Images

3. Chioma Nkemdilim sị na tupu nsọ ya ebido, ara ya ga-afụrịrị ya ụfụ. Mgbe ahụ, ara ya abụọ ga-ebutu ibu, ma na-afụ ya ụfụ.

4. Chimezie Ucheagbo bụ nwaanyị na-enye nwa ara ugbua sị na mgbe mbụ ọ chọrọ inye nwa ya ara, na ara ya fụrụ ya ụfụ nke ukwu. Mana mgbe nwa ya na-amị ara ya, ụfụ ahụ belatara.

Nwaanyị ara ya na-afụ ya ụfụ

Ebe foto si, Getty Images

O kwukwara na ọ bụrụ na nwa gị etinyeghị ọnụ ya nke ọma n'ọnụ ara gị, ọnụ ara gị nwereike fụọ gị ụfụ maọbụ gbawa. "Mgbe nke a mere m, ọ fụrụ m ụfụ nke ukwuu. Agaghị m akọwalị ụfụ ya."

Ihe a ka nwaada Ucheagbo gwara BBC Igbo maka etu ụfụ ahụ dị.

Nwata na aṅụ ara nne ya

Ebe foto si, Getty Images

Chimezie kwuru sị, "ọ bụrụ na ọnụ ara gị gbawa, ọ ga-aba ọnya nke na-eme ka ụfụ ya ka njọ. Nwaanyị ahụ nwereike ibute ọrịa site n'ọnya ahụ."

Ọ gwara BBC Igbo na ụdịrị ụfụ ọzọ ọ gabigara bụ mgbe nwa ya na-adịghị amịkọwa ara ya, nke a mere ara ya abụọ jiri gbajuo dọrọ, na-afụkwa ya ụfụ ma na-anyịkwa ya arụ.

Nwaanyị ike gwụrụ site n'imegharị ahụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwaanyị ike gwụrụ site n'imegharị ahụ

5. Otu nwaanyị na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru sị na ara ya na-afụ ya ụfụ mgbe ọbụla ọ na-eme egwuregwu mmegharịahụ dịka igba ọsọ, iwuli elu, dgz.

Ka o si kọwaa, "m gbachaa ọsọ, ara m na-afụkarị m ụfụ makana o buru ibu."

Ọ gwara BBC Igbo na ọ na-eyizi uwe akpa ara dị mma iji belata ụfụ ya.

Nwaanyị e bepụrụ otu ara ya maka ọrịa kansa.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwaanyị e bepụrụ otu ara ya maka ọrịa kansa.

6. O nwere ụdịrị ụfụ ara na-egosi mgbaama ọrịa kansa. Juliet Uzoma, onye rịaburu ọrịa kansa ma gbakee, gwara BBC Igbo na ọ dị afọ 34 mgbe ọ chọpụtara na otu ara ya na-afụ ya ụfụ ma na-agbapụta ihe na-acha ụcha.

O kwukwara na mgbe ahụ, okpuru mkpa abụ aka ya na-egbu ya mgbu. Ọ bụ mgbe ọ gara mee nnyocha ka ọ chọpụtara na ọ bụ kansa.

Dọkịnta Okoli kọwara na ihe ndị ọzọ nwereike ịkpata ara ifụ nwaanyị ụfụ bụ abụ dị n'ara nke ndị Bekee na-akpọ abscess.

Maọbụ ọnya mere na-ara nke butere nje ndị Beke na-akpọ 'mastitis'.

Iji gbochie ara ifu nwaanyị ụfụ, dọkịnta Okoli kwuru na ọ dị mkpa ụmụnwaanyị ime ihe ndịa:

  • Iyi akpa ara dị mma.
  • Ka ha na-agbanwe akpa ara ha kwa mgbe.
  • Ka ụmụnwaanyị mara etu ha ga-eji aka ha lele ara ha anya iji mara mgbe ihe na-agbanwe na ya.

A bịa n'ọrịa kansa, dọkịnta na-ahụ maka ahụ mmadụ gwara BBC Igbo na ọ dị mkpa ka ụmụnwaanyị na-abịa ụlọọgwụ maka nnyocha ahụ ha nke ndị Beke na-akpọ 'mammogram'.

Tụmadị ndị rugoro afọ 40 na-agbago elu.

Onye mere akụkọ a bụ Vining Ogu

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: