Washing privates with soap: Nwaanyị o kwesịrị iji ncha asa ọtụ ya?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chioma Nkemdilim
- Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo Service
Ọtụtụ n'ime anyị chọrọ ịdị ọcha oge niile, na-enweghi nsogbu ọbụla n'ahụ ha.
Mana n'otu aka ahụ, ọtụtụ amaghị na ha ekwesighi iji ncha asa akụkụ ahụ ụfọdụ ndị zoro ezo.
Akụkụ ahụ ndị a gụnyere: mmepe ahụ nwaanyị (vaginal opening), ime ọnụ amụ nwoke (urethral opening), nakwa ebe e si anyụpụta nsị (anal sphincter).
Site na mgbe anyị nọ na nwata, a zụrụ anyị idowe ahụ anyị ọcha.
Ya mere anyị ji nlezianya asacha akụkụ niile dị n'ahụ anyị.
Mana kedụ etu i kwesiri iji saa akụkụ ahụ gị na-egosi ihe i jiri bụrụ nwoke maọbụ nwaanyị?
Ndị ọkacha mara kwuru na ọ bụ site n'iji naanị mmiri, onweghị ihe ọzọ.
Dkt. Udodi Kachikwuru Okoli (MBBS; MSc. Public Health; Registrar, Internal Medicine) kwuru sị na nwaanyị kwesịrị iji naanị mmiri saa akụkụ otu ya, nke ọ na-ahụ anya.
Gịnị kpatara na mmadụ kwesịrị iji sọọsọ mmiri? Ka anyị gwa gị.
Akụkụ ahụ ndị a enweghị mmanụ ahụ (sebum)

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụ nwaanyị, ọnụ amụ nwoke na mmepe ahụ ebe e si anyụpụta nsị enweghi mmanụ ahụ n'ebe ndị ahụ dịka akụkụ ahụ ndị ọzọ.
N'ihi nke a, ọ dịghị mkpa iji ncha sachaa sachaa ha.
Nje na-akpata ọrịa

Ebe foto si, Emma Russell
E nwere ụmụ kịrịkịrị akụrụngwa dị n'akụkụ ahụ ndị a nke na-enye aka ichekwa ya.
Ncha nwere ike ịsachapụ akụrụngwa ndị a.
Ọ bụrụ na akụkụ ahụ ndị a enweghị nchekwa site n'iji ncha sacha ha, ha agaghị enwe ike ịlụso nje ndị anya nkịtị anaghị ahụ agha.
Ọtụtụ ọrịa ụmụ nwaanyị na-ebute n'akụkụ ahụ ha ji bụrụ nwaanyị, bụ ncha butere ihe kpatara ọrịa ndị ahụ.
Ịkpọ nkụ

Ọ bụrụ na i jiri ncha na-asa akụkụ ahụ ndị a zoro ezo, o nwereike ime ka akụkụ ahụ ndị ahụ kpọọ nkụ.
Nke a adịghị mma.
Onwere ike ịbute nsogbu dịka 'inflammation', maọbụ 'anal fissures'.
Kedụ etu ị ga-esi jiri sọọsọ mmiri sachaa ebe ndị a?

Ebe foto si, Getty Images
Ọ ka mma iji mmiri nkịtị dị maọbụ dịtụ ọkụ.
Mana ọ bụrụ na ị chọrọ ịsacha ebe ndị ahụ nke ọma, tinye obere nnu na mmiri ahụ.
Chetakwa na ebe a na-ahụ anya n'ahụ nwaanyị bụ ebe a na-asa, ọ bụghị nke dị n'ime ahụ anaghị ahụ anya.
Dkt. Udodi kwukwara na ndị ji ihe dị iche iche asacha ime ahụ nwaanyị (douching), kwesịrị ịkwụsị ya, maka na ọ dịghị mma ma ncha.
Ọ kwuru sị na ọ nwere ike ibute ọrịa site n'ịtụgharị PH ahụ nwaanyị.
Ozọkwa, dịka chi si kee ọtụ nwaanyị, ọ na-eji aka ya asacha onwe ya.
Naanị mmiri ka i kwesịrị iji saa ya, ka o nwee ike rụọ ọrụ etu o kwesiri.
Dkt. Udodi sị na ikpu nwaanyị kwesịrị inwe isi, na ọ bụ etu ahụ ka Chukwu si kee ya.














