Side Effects of Kissing: Lee nje dị icheiche ị na-ekerịkọta oge ị na-esusu ọnụ

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ eziokwu na ịta akị ọnụ bụ ụzọ anyị si egosi ịhụnanya mana ọ bụ gịnị ka mmadụ abụọ na-esusu ọnụ na-ekekọrịta?
Ọtụtụ mgbe egwu ịhụnanya na-akpọrọ anyị laa, anyị anaghị echeta na ọnwere ihe ndị ọzọ Bekee kpọrọ microorganisms anyị na-ekekọrịta.
Agbanyeghị na ọ nwereike ọ gaghị adị ka ya, ọnụ bụ ohere ebe ihe ruru ụdị nje 700 nwere ike ibi.
Ime ọnụ dị mma nje ito maka na asọmmiri, okpomọkụ na ụmụ nri dị na ya na-enyere ụmu nje ohere ito nke ọma.
Ya mere, ọ bụ ebe dị mma maka nje na-eto.
Ebe ọ bụ na ụmụ nje juru n'ime ọnụ, ihe ọ pụtara bụ na ọ dị nfe ikekọrịta ya mgbe anyị na-ata akịọnụ.

Ebe foto si, Getty Images
Na nchọcha onye Dutch ji ụmụakwụkwọ mee, a chọpụtara na akịọnụ gị na onye nke gị ji tinkọm tinkọ iri taa, ụnụ ekeelari ụmụ nje ruru nde iri asatọ (80 million) n'otụ ahịrị.
Onye nọ nso n'asụsụ anyị?
Bekee na-akpọ ụmụ nje bi n'ime ọnụ 'oral microbiota' bụ nke na-eso anyị abịa ụwa.
Ụmụ nje ndị a na-agbanwe kwa mgbe site na ihe anyị na-eri, ọgwụ anyị na-aṅụ, adịm ọcha anyị maọbụ ịse anwụrụ.
Afọ ole anyị dị na mkpụrụ ndụ ihe nketa anyi bụkwa ihe ndị ọzọ na-emetuta microbiota a.

Ebe foto si, Getty Images
Agbanyeghị o, ụmụ nje bi n'ọnụ nwekwara uru ha na-abacha.
Ụmụ nje ndị a anaghị enyere nje ndị ọzọ na-ebu ọrịa ohere ịkpa ike dịka ha na-enyeaka n'ịgbaze nri n'ime afọ nakwa mwulite ndị agha ime ahụ Bekee kpọrọ "immunity".
Na mgbakwunye, ụfọdụ na-emepụta vasodilators bụ nke na-enyere akwara aka ịmeghe ma na-enyekwa aka ịchịkwa ọbara mgbali elu.
Ha bi n'ime n'akụkụ ọnụ dị iche iche ebe ha n -emepụta nke Bekee kọrọ biofilms.
Ha na -emepụta matriks na-arapara n'ahụ nke na-ejikọrọ ha na mkpụrụ ma si otú a na -echebe ha site na ihe dị na gburugburu ebe obibi, dịka ọgwụ mgbochi ọrịa ma ọ bụ ọgwụ nje.

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụ nje ndị a nwere obi ha ebe dị iche iche n'ime ọnụ dịka eze, ukwueze, ha anaghị arụli obi n'ime agba maka na ụmụ nje bi ebe nke ahụ anaghị enye ha ohere ịrụ akwa mkpuchi ha bụ bioflim ebe ahụ.
Mpaghara nke ọ bụla nwere ọnọdụ ikuku oxygen na nri dị iche iche, nke na-eme ka ogbe nje ha na-agbanwe site na mpaghara ruo na mpaghara.
Nke dị n'ihu na azụ ọnụ gị abụghị otu ma ya fọdụzịa, nke bụ na nje microbiota dị n'ire gị nwereike iyite nke onye ọzọ karịa nke dị n'ime ọnụ nke gị.
Nke karịrị ịmị ọnụ

Ebe foto si, Getty Images
Mmekọrịta ahụ dị n'ịta akịọnụ na-eme ka ụmụ nje ndị a si n'ọnụ fere n'ọnụ.
Nke bụ eziokwu bụ na ịchee ya eche na-anwụ akpata onyi mana ọtụtụ n'ime ha anaghị anọte aka n'ime ọnụ tupu anyị eloo ha ma ghara ịma ihe mere.
Nje nwereike ibili n'ime ọnụ maọbụrụ na ọ gaghị-anyakuli ebe abụ.
Na mgbakwunye, usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ anaghị eme ka ọ dịrị ha mfe ebe ọ bụ na asọmmiri na-etinye ụdị ọgwụ mgbochi a kpọrọ IgA, nke "mucous membranes" na emepụta, nke na-egbochi nrapado ụmụ nje ahụ.
Matakwa: ndị nwere oghere karịa n'eze ha enweghị ndị agha a kpọrọ antibodies esichaghị ike.

Ebe foto si, Getty Images
Yabụ, n'agbanyeghị na ọtụtụ nje na-aba anyị n'ọnụ mgbe anyị na-ata akịọnụ, ọtụtụ n'ime ha na-abanye ozugbo n'eriri afọ.
Mana kekwaa nkwucha maka na onwekwara ụfọdị na-ekwechiri n'ime ọnụ jụ na ha agaghị aba n'ime afọ.
Ihe ndị a niile na-akuziri anyị na ọdịghị mfe nje ịtọ n'ọnụ mmadụ mgbe a tachara akịọnụ.
Mana ị ga-akpachara anya maka na ụmụ nje ndị na-adịghị mma nwere ike zoo na microbiota gị.








