Cerebral Malaria: I ma maka ọrịa iba na-aba n'ụbụrụ

Ebe foto si, Getty Images
Iba bụ ọrịa na-emetụta ọtụtụ ndị mmadụ na mba ụwa.
Ngalaba ahụike mba ụwa bụ World Health Organization (WHO) kwuru na ihe kariri mmadụ nde nari abụọ na puku iri anọ na otu butere ọrịa n'ụwa niile n'afọ 2020.
WHO kwukwara na mmadụ ole ọrịa a dulara mmụọ kariri puku nari isii na ụma n'afọ 2020.

Ebe foto si, Science Photo Library
Gịnị bụ ọrịa iba?
Ọrịa iba bụ ọrịa mmadụ nwereike ibute ma anwụnta taa ya maobụ anụ anwụnta tara taa ya.
Ọrịa a na-aka ememina ụmụnwaanyị dị ime, ụmụaka, ndị okenye na ndị na-arịa ọrịa kụkasịrịla ime ahụ ha dịka ọrịa obirinayaọcha (HIV/AIDS).
Ọrịa iba na-ebute:
* Ahụ ọkụ
* Isi ọwụwa
* Oyi ịtụ mmadụ
* Ahụ mgbụ na ọkpụkpụ igbuji mmadụ
Ọrịa iba nwere ọgwụgwọ, ụfọdụ n'ime ha bụ ọgwụ pụrụiche onye bu ọrịa a nwereike ịṅụ ma gbakee n'abalị atọ maọbụ anọ. Ndị dọkịnta na-akpọ ọgwụ ndị a "Antimalaria Drugs".

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua Ị marala maka ọrịa iba, i ma maka ọrịa iba na-aba n'ụbụrụ?
Ngwa gee ntị ka a kọwara gị maka ya.
Ọrịa iba na-aba n'ụbụrụ na-amalite dịka ọrịa iba nke nkiti, ọ bụkwa anwụnta bụ ihe na-ebunye mmadụ ọrịa a.
Otu nọọsụ gbatagbata na mba Amerịka aha ya bụ Olayinka Akinsanya gwara BBC Igbo etu ọrịa a si aba n'ụbụrụ mmadụ, o kwuru:
"Ọ bụrụ na mmadụ buru ọrịa iba ma hapụ ilebara ya anya ruo oge ole m ole, nje ọrịa nwereike ibuso ihe na-ebu nrị na ikuku agaghari n'ọbara mmadụ nke Bekee na-akpọ'red blood cells'agha.
Ọ bụrụ na nje ọrịa buso ya agha, ọ nwereike ime ka ọ kpachie ụzọ ọbara si abanye n'ụbụrụ mmadụ, nke a ga-akpalite ka ụbụrụ onye ahụ malite iza aza"

Ebe foto si, Getty Images
O kwukwara na ọ bụrụ na nke a mee, a ga-amalite ịhụ ọtụtụ ihe igbaama ga-egosi na ọrịa a abanyela ụbụrụ onye ahụ dịka:
* Mmadụ ịnọ n'etiti ọnwụ na ndụ, ọnọdụ a bụ nke Bekee na-akpọ 'Coma'
* Akwụkwụ ịdọ mmadụ
* Mmadụ ikọgheri akọgherị
Ndị ọrụ ahụike kwuru na ọnọdụ ọrịa nwereike imebi ụbụrụ ụfọdụ ma agwọcha ya bụ ọrịa iba nke bụ na ụbụrụ ndị ahụ aghaghịzị ezu oke ma ha gbakee.
Marakwa na dịka ọrịa iba nke nkiti onye bụ nke a na-aba n'ụbụrụ ga egosi ihe igbama na-ahụ ya dịka ahụ ọkụ, isi ọwụwa, oyi ịtụ mmadụ, ahụ mgbụ wdgz.

Ebe foto si, Getty Images
Kedụ ihe mmadụ ga-eme eji gbochie ọrịa a?
Usoro ọbụla ga-egbochi anwụnta ita mmadụ bụ usoro ga egbochi ọrịa a. Usoro ndị a ka nkụ nke gụnyere:
1. Gba mbọ dobe akụkụ be gị ọcha, sụcha ọhịa niile nọ gị nsọ maọbụ ebe ọbụla anwụnta nwereike ibi
2. Kwuchịe maọbụị bupụ iko mmiri ọbụla ebe anwụnta nwereike ibi maọbụ mmụbawanye
3. Na-agbachi ụzọ be gị na ebe ikuku si abata dịka ebe ndị bụ ebe anwụnta si efebata be mmadụ
4. Gba mbọ zụta akwa pụrụiche na-egbochi anwụnta ita mmadụ nke Bekee nba-akpọ "Mosquito Net"
5. Gba mbọ tinye akwa mgbochi a n'ebe ikuku si abata be gị dịka nke a ga-egbochi anwụnta ifebata be gị
6. Tee ude pụrụiche na-achụ anwụnta, Bekee na-akpọ nke a "mosquito repellent cream"
7. I nwereike igba ọgwụ ikuku nke isi ya na-egbu anwụnta nke a na-akpọ "insecticide" na Bekee

Ebe foto si, Getty Images
Ọrịa a enwere ọgwụgwọ?
Ọrịa iba nwere ọgwụgwọ, a na-eji ọgwụ pụrụiche agwọ ya.
Nwaada Akisanya si na ọ bụrụ na mmadụ bute ọrịa iba ọkachasi nke na-aba n'ụbụrụ, ọ bụ ihe mmadụ kwesiri ilebanyere anya ngwa ngwa dịka ndị Igbo si ekwu "e mee ngwa ngwa emeghara ọdachi".
Ịmalite nataba ọgwụgwụ n'oge dị mkpa maka ị hapụ ọrịa a n'ime ahụ mmadụ ruo oge dị anya nwereike ime ka onye ahụ banye n'ọnọdụ nwereike memina ya maọbụ mebịe ime ahụ ya etu enweghizi ike igbapụta ya ọkachasi ụbụrụisi onye ahụ.
Dịka Nwaada Akisanya si kwuo, echela ka ọrịa ruo ogogo nke ikpalite ọnọdọ mmadụ ịnọ n'etiti ọnwụ na ndụ, ọnọdụ a bụ nke Bekee na-akpọ 'Coma', akwụkwụ ịdọ mmadụ, maọbụ mmadụ ikọgheri akọgherị.








