Anthony Obiagbaoso Enukeme 'Tonimas': Oke mmadụ efulahụla ndị Anambra - Gọvanọ Obiano

Ụgbọala e jiri buru ozu Tonimas

Ebe foto si, Anambra Broadcasting Service

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọ kpọtụrụ akpọtụ n'akwamozu Anthony Obiagbaoso Enukeme bụ onye e ji 'Tonimas' mara dịka ndị nwere agba si ebe dị iche iche bịara Neni, dị n'Anambara steeti maka ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ na nsonso a.

Anyịnya igwe nakwa ikpeozu oke ọnụ ahịa e ji buru ahụ Enukeme, onye nwe ọdọmmanu ụgbọala 'Tonimas' na mpaghara dị icheiche n'ala Igbo, ka bụ ihe ndị mmadụ ji adọrịta ụka na soshal midia.

Etu e si buru akpati ozu Tonimas

Ebe foto si, ABS

Ọtụtụ ndi mmadụ gbara akaebe maka umeala, igba mbọ, inyere ndị ogbenye aka na ọrụ ọma ndị ọzọ ojiegoachuego ahụ biri n'Aba rụrụ oge ọ dị ndụ.

Ụlọụka juru eju n'akwamozu Tonimas

Ebe foto si, ABS

Nkọwa foto, Ụlọụka juru eju n'akwamozu Tonimas

Aka na-achị Anambara steeti bụ Willie Obiano, akwaara arịrị ma ruo uju maka ọnwụ Anthony Enukeme.

Obiano gosiri mwute ya site n'ozi o zipuru site n'akara Facebook ya.

Anthony Enukeme

Ebe foto si, Facebook/Willie Obiano

Nkọwa foto, Mazi Anthony Enukeme (Tonimas)

O kwuru na ọnwụ Enukeme gbara ya ka akpị n'ihi na ọ bụ mmadụ udo ma bụrụkwa onye o ji ego achụ ego ma ihe ọ na-eme.

Obiano kọwakwara Enukeme dịka ide nke otu pati APGA.

Ọ gara n'ihu kwuo na ihe a ga-eji cheta ya bụ ihe ọma o meere obodo ya, ụka nakwa steeti Anambara.

Onowu Enukeme (Tonimas)

Ebe foto si, ABSTV

Chi ji ụtụtụ jie mgbe akụkọ pụtara na Anthony Obiagboso Enukeme, onyeisi ụlọọrụ Tonimas Group nwụrụ n'ụbọchị Tuzde.

Akụkọ apụtabeghi maka ihe kpatara ọnwụ ya dịka ndị ezinaụla ekwubeghi ihe ọbụla.

Aha onyonyo, Robert Mugabe: Ihe ndị i kwesiri ịma maka ya

Ihe kwesịrị ịma maka Anthony Obiagboso Enukeme (Tonimas)

  • Anthony Obiagboso Enukeme bụ onye obodo Neni dị n'Anambra Steeti.
  • Ọ bụ onye achụntaego na ngalaba mmanụ agbịdị a ma ama na Najirịa, ma bụrụ onyeisi ụlọọrụ Tonimas Group nke nwere ngalaba dị iche iche gụnyere Tonimas Oil, nke a mere e ji akpọ ya Tonimas.
  • O nwere ụlọọrụ a na-esi mmadụ ụgbọala dị n'Aba nwekwaa ọdọ dị iche iche a na-ere mmanụ ụgbọala (Filling Station) na Naịjirịa.
  • E chiri ya echichi dị iche iche nke gụnyere Onowu Neni pụtara 'onye aka nri nke Eze Neni.
  • Ọ bụ onye otu Pati All Progressive Grand Alliance (APGA) nke o so n'otu n'ime ndị hiwere ya.
  • Ndị maara ya sị na ọ bụ 'o mepuru onye ọ na-ara ahụ'. na ọ na-enyere ndị mmadụ aka nke ukwuu.

A sị na ọ rụọla ọtụtụ ụlọ gụnyere ụlọụka n'obodo ya bụ Neni dị n'Anambra Steetị.

Lee foto etu e si kwaa ma lie ya:

Etu e si lie Tonimas

Ebe foto si, ABS

Ndị ụkọchukwu dị iche iche bịara akwamozu a

Ebe foto si, ABS

Nkọwa foto, Ndị ụkọchukwu dị iche iche bịara akwamozu a

Akụkọ ndị ga-amasị gị: