Ọkọ ngada: Gịnị na-ebute 'Ọkọ Junction'?

- Onye dere ya, Chigozie Ohaka
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service
Ọtụtụ mmadụ na-akọ ọkọ na ngada mana ha amaghị ihe na-akpata ya.
O nwere ọtụtụ aha e ji mara ọkọ a nke gụnyere 'ọkọ Junction', 'Ọkọ tee', ' ọkọ achọrọ m ịma', dgz.
Ọrịa ọkọ ngada nke a na-akpọ Jock Itch n'okwu bekee bụ ọrịa ọkọ na-ebute ahụ mgbakasị.
Ọkọ a nwereike ọ bịa mgbe ha chọrọ ime ihe dị mkpa maọbụ mgbe ha nọ n'etiti ndi mmadụ.
Akụkọ a ga-gwa gị ihe na-akpata ọkọ ngada, mgbochi ya na ọgwụgwọ ya.
BBC Igbo kpọtụrụ ọkammụta Uche Ojimma bụ ọkachamara maka ihe gbasara anụahụ mmadụ ma bụrụkwa onye isi Dermatologist Department nke University Of Nigeria Teaching Hospital.
O tinyere ọnụ n'okwu a ma kụwa akụoyibo nsugbe gbasara ya bụ ọrịa ngada.
Gịnị bụ ọrịa ọkọ ngada maọbụ Jock Itch?

Ebe foto si, Getty Images
Dọkịnta Uche Ojimma kọwara na ọ bụ nje a na-akpọ dermatophytes na-ebute ya.
Dermatophytes a sị n'ezinụlọ nje Bekee kpọrọ 'Fungus'.
Ojimma kọwara na aha bekee ya bụ Jock Itch sitere ma bido dịka ndị na-eji ịnyịnya eme asọmpị a na-akpọ Jockeys na-ebute karị ya site n'ahụ ịnyịnya.
Ya bụ ọkọ na-emekarị na ngada nwoke ma na-eme kwa ụfọdụ ụmunwaanyị.
Ọ kọwara na ihe na-amasị nje Dermatophytes n'ahụ mmadụ bụ ceratin nke na-adị n'anụ ahụ, mbọ aka na ntụntụ isi.
Ọ bụ ceratin a ka nje a na-eri.
Kedụ ihe na-ebute ọkọ ngada?
E nwere ọtụtụ ụzọ mmadụ si ebute ya bụ ọkọ ngada, kama otu ihe mmadụ kwesiri ịma bụ na ọdịda Afrịka ebe a na adịkarị ọkụ ma ikuku na-adị kwa mmiri mmiri nke a kpọrọ Humid na Bekee socha n'ihe na enyere aka ebute ọkọ ngada.
Ọ bụ Dkt Ojimma kwuru nke a ma kọwa kwaa na ebe dị etu a na-eme ka ngada mmadụ nwee ọsụsụ ma di ọkụ.
Ọ kọwara na ọ bụ ebe dị etu na-amasị nje Fungus nke na-ebute ọkọ ngada.
Ọkọ ngada na-eme ka ahụ mmadụ na ekpecha ekpecha, ọ ga-akpọ nkụ ma na-acha kwa uhie uhie n'etiti ngada.
Ojimma kwukwara na ọkọ a nwereike site na mbọ mmadụ ma fee na ebe ndị ọzo n'ahụ mmadụ.
Ọ na-ebute oke ịkọ ọkọ na ngada, o nwereike site na ngada gafee n'ike mmadụ.
Kedu etu esi egbochi ọkọ ngada
1) Ụgbọrọ ole ka ị na-eyi obante gị tupu ị saa ya?

E nwere ndị na-asa obanta ha nanị mgbe o si were nsị.
Dọkịnta Ojimma kwuru na ọ bụ nanị otu ugboro ka mmadụ kwesiri iyi obante ya
Ọ kọwara na ọ dị mkpa mmadụ iyi obante nanị otu mgbe ma saa ya mmiri.
Nke a agaghị enye nje dermatophytes ịmubanya n'ahụ mmadụ.
2) Lee kwa ma ọ bụ cotton ka eji mee obante gi

Ebe foto si, Getty Images
Dtk Ojimma si " Anytị na-adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha na-eyi uwe okpuru maọbụ boxer eji cotton mee".
O kwuru na nke a ka mma karịa mmadụ iyi 'Tight' nke na eme ka ọsụsụ na asụ mmadụ na ngada.
Ojimma kwuru na obante eji cotton mee ka mma n'ihi na cotton ga amipụcha ọsụsụ ma nye kwa ohere ka ikuku na abata na ngada.
3) . . . Umunwaanyị kwanu?

Ebe foto si, Getty Images
Dkt Ojimma kwuru sị "Ọ dị mkpa ka ụmụnwaanyị na-eyi ịba nwere ohere ikuku sị apụ ma nke e ji cotton mee".
O kwukwara ka ụmunwaanyị na eyi obante ha nanị otu ugboro.
Ojimma rụtụkwara aka na ọ dị mkpa ka ha na-asa ahụ ha oge niile.
4) Ozughị nanị n'ịsa obante gị
Dkt Uche Ojimma kwuru sị " Onye sachaa obante ya, ya were igwe iron dakpọọ ya".
Ọ kọwara na nke a ga-eme ka ọkụ si n'igwe Iron gbuo nje ọ bụla nwereike ị nọ n'ọbante.
5) ị na-eyi uwe ukwu maọbụ trauza mmadụ?

Ebe foto si, Getty Images
Biko eyizila uwe ukwu mmadụ ọzọ maọbụ trauza ya.
Ojimma kọwara na akpụkpa ahụ onye ahụ nwereike i site na trauza onye ahụ banye na nke onye ọzọ.
Ọ kọwara na nke a bụ otu uzọ ọkọ ngada sị efesa.
6) "Biko, nye m tọwel gị ka m were hichaa ahụ"

Ebe foto si, Getty Images
Biko sị mba!
Dkt Ojimma kwuru na mmadụ iji akwa eji ehicha ahụ nke mmadụ ọzọ bụ etu ọzọ esi ebute ọrịa ọko ngada.
O kwuru ka ọ bụrụ nanị otu onye ga-enwe akwa eji ehicha ahụ ma na sa kwa ya oge o kwesiri.
7) Ị dịna n'otu akwa
Ụfọdụ mgbe, onye nwere ọrịa ọko ngada kọchaa ọko, akpụkpa anụ ahụ ya nke bekee kpọrọ "scales" nwereike dasa n'elu akwa.
Mgbe onye ọzo dịnara na ya bu akwa, akpụkpa anụ ahu a banye ya na ngada, onye ahụ nwereike ibute ọrịa ọko ngada.
8) Aramara!

Eeeeee!
Dkt Ojimma kwuru sị "Onye nwere ọkọ ngada nwereike ibunye onye ọzọ ya bụ ọrịa ma ha abụo nwee mmekọ.
Ọkọ 'junction' na-ara ahụ ịgwọ.
E nwereike iji ntule chọpụta ya kama ọ dị mkpa ka mmadụ gaa ụlo ọgwụ maka nyocha.
Ọkọ ngada o nwere ọgwụgwọ?

Ebe foto si, Getty Images
Dkt Ojimma kwuru na ọgwụgwọ ọrịa ọkọ ngada na-esi ike ma na-akarị kwa otu ọnwa.
E nwere ọtụtụ ọgwụ eji agwọ ya nke a na-akpo anti-fungal.
E nwere nke a na aṅụ aṅụ ma nke a na-ete n'ahụ.
Ndụmọdụ Dkt Ojimma gwara ndị mmadụ bu sị " idị ọcha dị oke mkpa, biko yie ịba gị nanị otu mgbe".
Gbam!











