Abaribe Governorship Ambition: 'Ọchụchụ ọkwa gọvanọ Abaribe na-achọ agaghị emegharim anya' - Gọvanọ Ikpeazu

Enyinnaya Abaribe

Ebe foto si, @realenyiabaribe

Gọvanọ Abia Steeti bụ Okezie Ikpeazụ ekwuola uche obi ya dịka onye omeiwu Enyinnaya Abaribe kwupụtara uche obi ya na ọ chọrọ ịzọ ọkwa gọvanọ Abia steeti.

Onye odeakwụkwọ ukwu gọvanọ bụ Onyebuchi Ememanka kwuru na Abaribe bịara n'ụlọ Ikpeazu n'ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Disemba afọ a were gwa ya na ọ chọrọ ịzọ ọkwa gọvanọ Abia Steeti.

O kwuru na Ikpeazu nabatara Abaribe kama na-enwere ụfodụ ihe ha chọrọ ka ndị mmadụ ghọta.

Lee ihe gbara ọkpụrụkpụ ha chọrọ ka ndị mmadụ ghọta:

  • O kwuru na Ikpeazu kwenyere na ọ bụ Chineke na-enye mmadụ ike inweta ọchịchị, na ọ bụghị nanị n'aka mmadụ ka ọ dị
  • Na uche Gọvanọ Ikpeazu anọghị n'ebe ọkwa Gọvanọ 2023 nọ kama na ọ bụ ọrụ ya dịka gọvanọ ugbua dị ya n'obi. Ọ kachasị ịrụpụta ụfodụ okporoụzọ n'Abia steeti.
  • Ọ kọwara na Ikpeazụ ịdonyere onye ọbụla ukwu ugbua, ga-ebute mgbagwojuanya n'etiti ndị Abia steeti.
  • O kwukwara na Ikpeazu kwenyere na mgbe oge ruru, na ndị ndọrọndọroọchịchi site n'ike Chineke ga-ahọpụta onye ga-abụ gọvanọ Abia Steeti.

Enyinnaya Abaribe na-ọchụchọ okwa Gọvanọ Abia Steeti

Onye omeiwu na-anọchite Abia South n'Ụlọomeiwu Ukwu na-anọchite anya Abia South bụ Enyinnaya Abaribe ekwuola na ọ ga-azọ ọkwa Gọvanọ Abia steeti oge ntuliaka nke afọ 2023.

Onye enyemaka ya pụrụiche bụ Uche Awom kwuru na Abaribe ga-eso zọọ ya bụ ọkwa Gọvanọ Abia Steeti.

Abaribe onye bụ onye otu Pati People's Democratic Party ma bụrụ kwa onyeisi ndị otu perempe n'ụlo omeiwu nke bụ Minority Leader n'okwu bekee.

Abaribe bụbu onye osote Gọvanọ Abia steeti n'afọ 1999 kama ọ gbara arụkwaghịm n'afọ 2003.

Ọ zọrọ ọkwa Gọvanọ Abia steeti n'afọ 2003 kama Orji Uzor Kalu meriri ya.

O bidoro ịrụ ọrụ dịka onye omeiwu kamgbe afọ 2007 ma ruo taa.

Ihe o kwuru maka ọchụchọ Biafra

Onye omeiwu na-anọchite Abia South n'Ụlọomeiwu Ukwu bụ Enyinnaya Abaribe ekwuola na ihe ọ chọrọ bụ Naijiria ebe mpaghara ọbụla ga-achọ mmepe ka o siri masị ha.

Abaribe kwuru nke a ụbọchị Tọzde n'emume 'Izu Iwu' nke ọgbakọ nke ndị ọkaiwu(NBA) ngalaba nke Ọka nwere n'Ọka, Anambara steeti.

Ọ sịrị na "E kwube okwu nhazigharị Naijiria, ndị omeiwu ndị Ugwu na-asị, 'Ọ bụ maka nweta Biafra?'"

"N'ezie achọrọ m Biafra, mana Biafra m chọrọ bụ Biafra nke mmụọ, ọ bụghị nke ala."

"Ndị rue ha mepewe mpaghara nke ha."

Aha onyonyo, Mkparịtaụka ebe Sinetọ Abaribe kọwapụtara iwe ndị Igbo ebe onyeisiala Muhammadu Buhari nọ.

"Anyị nọ n'Ọwụwa Anyanwụ nwere ike bụrụ mpaghara kachasị nwee ego site n'ike ọrụ ha ma a hazigharịa Naijiria."

"Echeghị m na anyị ga-enweta ihe anyị chọọ site n'ọgbaghara."

Ọkaiwu Ekene Okonkwo na Senetọ Enyinna ya Abaribe

Ebe foto si, NBA Awka

Nkọwa foto, Onyeisi NBA, ngalaba nke Ọka bụ Ọkaiwu Ekene Okonkwo na Senetọ Enyinna ya Abaribe

Abaribe katọrọ ogbugbu a na-egbusisị ndị uweojii na ịgba ogige ha ọkụ n'Ọwụwa Anyanwụ sị na ọ bụ arụ kwọ nwa.

"Anyị nwere ike inweta ihe anyị chọrọ site na ime ihe dị mkpa ka e mee, nke bụ isonye naa nhazigharị Iwu Naijiria."

"Ọ ka mma ka anyị mee ka Naijiria dị mma obibi kama ịkwafu ọbara kwa ụbọchị."

"Ọ bụrụ na ihe anaghị aga ọfụma, aga enwe ndị na-eti mkpu"

Ndí ókaiwu ngalaba nke óka na Abaribe

Ebe foto si, NBA Awka

Abaribe, onye kwuru na ọchịchị Buhari gbakụtara 'iwu Naijiria dịka o siri metụta 'Federal Character' azụ, sịrị na nke a so bute ihe na-afịọ na Naijiria ugbua.

"Dịka anyị na-ekweta na ọ dị mkpa ihazigharị ala anyị, anyị kwesịrị ikweta na ihe butere nsogbu na-afịọ ugbua anyị bụ emeghị onye ka e mere ibe ya nke gọọmentị nọ n'ọkwa ugbua."