ABSU Kidnappings: Ọ bụ naanị otu nwata akwụkwọ ka a tọọrọ - Gọọmentị Abia steeti

Uturu Mahadum

Akụkọ si Abia steeti apụta na-akọwa na ọ bụ naanị otu nwata akwụkwọ ka ndị ntọ tọọrọ n'okporoụzọ si Okigwe gawa Uturu n'abalị Wednezde.

Kọmịshọna mgbasaozi Abia steeti bụ John Okiyi kọwara na gọọmentị steeti ahụ amalitela ịgba mbọ ịtọghapụ nwata akwụkwọ ahụ.

O kwukwara na steeti ahụ ezipụla ndị nchekwa na mpaghara ahụ igbochi ụdịrị ihe a ịme ọzọ.

Gọọmentị Abia Steetị ekwuola na anya ha dị na ntọrị a tọọrọ ụmụakwụkwọ mahadum Abia Steetị dị n'Uturu n'ụzọ Okigwe nke Imo Steetị.

N'akwụkwọ ozi kọmishọna mgbasaozi bụ John Okiyi wepụtara, ọ sị na ha na gọọmentị Imo Steetị nakwa ndị ọrụ nchekwa na-arụkọ ọrụ iji gbapụta ụmụakwụkwọ ndị a.

Akụkọ sị na a tọọrọ ụmụakwụkwọ a n'ihe dịka elekere asatọ nke abalị n'ụbọchị 5 nke ọnwa Mee, afọ 2021.

Nke a mere n'ụzọ si Uturu gawa Okigwe mgbe ndị a tọọrọ nọ n'ime ụgbọala ka ndị wakporo ma tọrọ ha.

Mana otu nwata nwaanyị so n'ime ụgbọala ahụ a tọọrọ ndị mmadụ mana ọ gbara ọsọ kọwara etu ha si zute ndị ntọrị a.

Ọ sị na ha banyere ụgbọala otu nwoke aha ya bụ Chris gotere ọhụrụ ka o buru ha si Uturu gawa Okigwe.

Ọ sị na ha dị mmadụ itoolu n'ụgbọala ahụ mgbe ndị ntọrị a ọnụọgụgụ ha karịrị iri wakporo ha n'ebe ụzọ mebiri emebi dị nso na 'Secretariat'.

Nwata nwaanyị sị na ndị mkpọrọ mmadụ asatọ gụnyere onye nwe ụgbọala ahụ ma hapụ ya dịka ọ kpọrọ ekwe nkụ na ọ gaghị eso ha.

Ọ sị na ndị ntọrị a kpọrọ mmadụ asatọ a banye n'ime ọhịa dị n'akụkọ ebe a wakporo ha.

BBC Igbo kpọtụụrụ ndị uweojii Abia Steetị mana ha sị na ọ bụ ndị uweojii Imo ka ọ dị na-aka.

Mgbe a kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo bụ Orlando Ikeokwu ọ naghị aza ekwentị ya.

Otu nwata akwụkwọ gwara BBC Igbo sị na ọ ma otu n'ime ụmụakwụkwọ ahụ a tọọrọ

N'akụkọ ọ kọrọ, ọ sị na ndị a tọọrọ ruru mmadụ iri na ise mana mmadụ atọ n'ime gbara ọsọ.

Ọ sị na ụfọdụ ndị a tọọrọ bụ ụmụakwụkwọ ebe ndị ọzọ bụ ndị na-azụ ahịa nakwa ọrụ na gburugburu mahaduma ahụ.