O nweghị ntuliaka ABSIEC mere na Bende - Onyeomeiwu na-anọchịte Bende-North

Chijioke Chukwu

Ebe foto si, chijiokechukwu-facebook

Onye omeiwu n'anọchịte Bende North n'ụlọomeiwu Abia steeti bụ Chijioke Chukwu, akpọọla oku ka onyeisioche ngalaba na-ahasị ntuliaka na steeti ahụ bụ Mkpa Agu Mkpa kagbuo ntuliaka e mere na Bende taa bụ Fraide. Chukwu katọrọ ka ntuliaka okpuru ọchịchị siri gaa na Bende, kwuru na ahụghị ndị ọrụ ABSIEC na ndị ọrụ ngo ha na ọnọdụ ntuliaka nile dị na Bende.

Ndị ọrụ ntuliaka

Ọ katọrọ onyeisioche ABSIEC sị na 'onye ọbụla ma na ọgaghị ahazili ntuliaka n'ụzọ kwesịrị ekwesị n'Abịa."

Ndí uweojii nó órú nchekwa na ntulaika Abía Steeti
Nkọwa foto, Ndí uweojii nó órú nchekwa na ntulaika Abía Steeti

Ndị Abia steeti na-eme ntuliaka ịhọpụta ndị ga-achị okpuruọchịchị obodo

Ntuliaka Abia
Nkọwa foto, Ntuliaka amalitela n'Oram/Okwura Ward (13) Ohiya Umuahia South

Ntuliaka ochichi okpuruọchịchị obodo n'Abia steeti na-aga n'ihu taa bụ Fraịde.

Mgbe onye ntaakuko BBC Igbo rutere isi ochichi nke Umuahia North ebe esi egburu ngwa oru maka ntuliaka nke taa, ndị ọrụ ntuliaka Abia steeti a kpọrọ 'Abia State Independent Electoral Commisson' (ABSIEC) n'ịchafụ nakwa ndị otu pati dị iche iche nọkwa na njikere iburu ihe ọrụ ndị ahụ gawa na ebe a ga-eji ha rụọ ọrụ.

Ntuliaka Abia
Nkọwa foto, Uche ọtụtụ mmadụ adịgha na ntuliaka a
Ntuliaka Abia
Ntuliaka Abia
Nkọwa foto, Ndị jere ibute akụrụmgwa eji atụ vootu n'okpuru ọchịchị Ụmụahịa Nọt

Amalitebeghi ikesa ihe ọrụ ntuliaka ndị a na mgbe oji okara gafee ekekere asatọ nke ụtụtụ, n'isi ọchịchị obodo Umuahia na ndị ọzọ.

Abia Ntuliaka
Nkọwa foto, Ndị jere ibute akụrụmgwa eji atụ vootu n'okpuru ọchịchị Ụmụahịa Nọt
Abia ntuliaka
Nkọwa foto, Ndị jere ibute akụrụmgwa eji atụ vootu n'okpuru ọchịchị Ụmụahịa Nọt
Ntuliaka abia
Ntuliaka abia

Anyị na-achọpụta na mgbe ọfọrọ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere iri na otu nke ụtụtụ ngwongwo eji eme ntuliaka erutebeghị Abia North na Abia South agbanyeghị na ọkammụta Mkpa Agu Mkpa bụ onyeisi ụlọọrụ ntuliaka Abịa steeti akpọrọ Abia State Independent Electoral Commission (ABSIEC) na-agwa ndị ntaakụkọ na ngwongwo ndị ahụ ahapụlarị isiụlọọrụ ha gawa ama 292 niile dị na steeti ahụ.

Ntuliaka abia

Onye ntaakụkọ BBC nọ Umuahia na-ekwu na ndị na-azụ ahịa na-azụrụ onwe ha ahịa ha n'agbanyeghi na ntuliaka Okpuru Ọchịchị ime obodo a na-aga n'ihu.

Umuahia
Umuahia