Enyinnaya Abaribe ekwuola ihe o merela kemgbe afọ 13 ọ malitere ịnọchite Abia-South

Aha onyonyo, Enyinnaya Abaribe ekwuola ihe o merela kemgbe afọ 13 ọ malitere ịnọchite Abia-South

Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchiteanya Abia-South n'ụlọomeiwu Naịjirịa akọwaala ụfọdụ ihe ọ rụrụ kamgbe ọ banyere n'ọkwa Sịnetọ.

Ọ sị na otu n'ime ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ o mere bụ iwepụta atụmatụ ịkwalite ihe ndị a rụpụtara n'Aba nke a kpọrọ 'Made in Aba'.

Ọ sị na ihe mere o jiri malite nke a bụ maka na "ọ na-aka mma isi n'ụlọ mara mma pụwa n'ama".

Abaribe sị na ụfọdụ ihe ndị ha kwadoro gụnyere ịrụpụta akpụkpọ ụkwụ, uwe ndị nchekwa gụnyere ndịagha, ndị uweojii, ndị Civil defence nakwa uwe ndị ji otu afọ efe ala nna ha.dgz.

Ọ sị na ọ bụ maka mbọ a ha gbara mere gọọmentị Naịjirịa ji malite atụmatụ nke ha a kpọrọ 'Made in Nigeria'.

Ihe ndị ọzọ Sịnetọ Abaribe sị ha mere gụnyere ịrụ okporoụzọ, ịgbape mmiri, ịrụ ọkụ latrik izụrụ ndị mmadụ ụgbọala na ọgbatumtum na ihe ndị ọzọ.

Kirie ihe o kwuru n'uju

Ndị mer akụkọ a bụ Chimamaka Ihenacho na Chiemela Peter Mgbeahuru.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: