Igbo hairstyles: Ụdịrị isi e ji mara ndị Igbo mgbe gboo

Aha onyonyo, Ụdịrị isi e ji mara ndị Igbo mgbe gboo

Site n'afọ 1900 ruo ugbua, ọtụtụ ihe agbanweela, mana mgbanwe ndị ahụ abụchaghị nke a tụfuru atụfu.

Otu n'ime ihe ndị ahụ gbanwere bụ isi ọkpụkpa ndị mgbe gboo na-akpabu.

A na-akpakwa isi ugbua, mana ọtụtụ ndị amaghị na ụfọdụ isi ndị ahụ bụ ndị a kpara mgbe gboo.

Ihe nkiri a ga-egosi gị ụdịrị isi e jiri mara ndị Igbo mgbe gboo.

Ndị mere ihe nkiri a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru na Chukwunaeme Obiejesi.