Onitsha Fire: Peter obi, ụmụ gị na-ebe akwa - Ndị Onitsha

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-azụ ahia na Ọchanja na ụpper Iweka na ekele Peter Obi dịka ọ biatara ha mgbaru maka ọkụ gbara ahịa ha.
Obi kwuru na owepụtala nde naira abụọ iji dozie ebe ọkụ a metụtara.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ndịagha agbagbuola nwaanyị jị ụmụ aka ya dị ọcha

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ ndị otu agha Naịjirịa egbuola ndị ha kwuru kparịrị ọyị nwaanyị otu onye n'ime ha.
Anya hụrụ mgbe ihe a mere Nafiu Muhammad gwara BBC na ya bụ ihe mere n'elekere asọtọ n'ụma na mgbede na Mabera dị na Sokoto.
Muhammad kwuru na okwu kawanyere njọ mgbe ndị otu Nigerian Airforce bidoro gbasasiwa egbe ka igwe mmadụ ghara ibiagbu ha.
Nke a mere ka mgbọ egbe ntụsasi gbata ọtụ nwaanyị dị ime ma mụgọro ụmụ asaa nakwa otu okorobia ma gbuo ha.
Ndị okenye kwuru na ha ga-enyocha ozu ahụ ka ha matakwuo ka ha si nwụọ tupu ha nie ha.
David west ekwetela na o gburu ụmụnwaanyị itolu ahụ

Nwoke a sị na o gburu ụmụnwaanyị itolu na Pọtakụt an n'ebe ndị ọzọ nọrọ n'ụlo ikpe taa si 'Eee egburu m ụmu nwanyi itolu a'.
Nwoke a aha ya bụ David West ga anọ n'ụlọmkpọrọ na pọtakụt tutu ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Novemba afọ a mgbe a ga-ebido ikpe ya n'ụjụ.
Simon Achuba na oche osote Gọvanọ Kogi steeti
Dịka achụpụru Simon Achụba dịka osote Gọvanọ Kogi steeti , ọ kpọro ndị Nkaakụko gwa ha na na-agbanyeghị na ọ ka bụ kwa Osote Gọvanọ Kogi steeti.
Achuba kwuru na anapụrụ ya ụgbọala ya ma wepụ ọkụ ;atrik n'office ya.
O kwukwara na mwepụ ya ezighị ezi ma na ọ ga-aga ụlo ikpe maka nke a.
O kwuru na ihe emere ya bụ ihe ihere na mkpari nye ndị Kogi steeti niile.
Messi ọ ga-amabụrụ Ballon D'or nke afọ 2019

Ebe foto si, Getty Images
Lionel Messi nwere ike ituru ugo ọzọ dịka ọkacha agba bọọlụ n'ụwa niile.
Aha ya so na ndị ahọpụtara maka inweta nturuugo 'Ballon D'or' nke afọ 2019.
Cheta na ọbụ Messi ka e chiri eze bọọlụ nke ndị otu na-elekọta egwuruegwu bọọlụ bụ Fifa.
Ndị ọzọ aha ha so na ndị a na-atule maka nturuugo ahụ bụ Cristiano Ronaldo na Virgil Van Dijk.

Ebe foto si, Getty Images
Ronaldo na-agbara otu egwu bọọlụ Juventus nakwa mba Pọtụgal ebe Van Dijk na-agbara ndị Liverpool nakwa mba Nedalands.
Luca Modric, onye otu egwu bọọlụ Real Madrid, bụ onye tuuru ugo 'Ballon D'or' nke afọ gara aga.
Mana aha ya esoghị chaachaa na ndị nwere ike irite nke afọ a.
Nwaafọ Igbo bu Samuel Chukwueze sokwa na mmadụ iri ahọpụtara aha ha dịka ndị ntorobịa kacha agba bọọlụ n'ụwa.
Na abalị abụọ nke ọnwa Disemba ka a ga-ekwupụta onye tuuru ugo 'Ballon d'or' nke afọ 2019.
Sowore ọ ga enwere onwe ya?

Ebe foto si, Sahara Reporters
Ụlọikpe dị n'Abuja ekwugharịala ihe Omoyele Sowore ga-eme tupu atọhapụ ya na nga ndị DSS ebe e ji ya kamgbe ọnwa Ọgọst.
Ụlọikpe ahụ kwuburu na onye ọbụla ga-agbara Sowore akaebe tupu atọhapụ ya ga-akwụ nde naịra iri ise, mana ugbua ha akụchapụla nke ahụ.
Mana ụlọikpe kwụsịrị ike na mkpebi ya na Sowore agaghị esi Abuja pụọ ma a tọhapụ ya.
Uloikpe ahụ butukwara ego ha kwuru na Olawale Baka re ga-akwụ tupu a tọhapụ ya.
Bakare bụ onye a nwụchiri ya na Sowore otu oge.
A na-ebo ha abụọ ebubo na ha kparịrị onyeisiala Muhammadu Buhari ma na-achọkwa ụzọ ịchutu ya n'ọkwa.
Saraki na EFCC

Ebe foto si, TWITTER/@BUKOLASARAK
Na nke dịka ibe ya, dịka ụlọikpe na Legọs nyere iwu ka gọọmentị etiti weghara ụlọ Bukola Saraki, Saraki na-ekwu na egwu ọbụla adịghị atụ ya.
Saraki kwuru na ọbụ nghọgbu ka ndị EFCC ghọgburu ụlọikpe ahụ n'ihi na ụlọikpe kachasị na Naịjirịa ekwubuola na aka ya dị ọcha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
O kwuru na ya agwala ndị ọkaiwu ya ka ha ga gbaghaa iwu ahụ ụlọikpe Legọs nyere na mgbede Monde.
Na Canada

Ebe foto si, Getty Images
A na atụ anya na otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke onyeisiala mba Canada bụ Justin Trudeau ga-eturu ugo na ntuliaka nke na aga n'ihu na mba ahụ ugbua.
Mana Trudeau ga achọ enyemaka ndị patị nke ọzọ n'ihi na pati ya enwezuchaghị vote ole a tụrụ anya n'aka ha.
Na Syria

Ebe foto si, Reuters
Onyeisiala Turkey bụ recep Erdogan abaala mba na ha ga-ebido ịluso ndi Kurd bi na Syria agha ma ọ bụrụ na ha esighị na oke jikọro ha abụọ pụọ.
Erdogan kwusiri ibuso ha agha izuụka gaara aga mgbe ndị Amerịka kpọro ya ka enwee mkparịta ụka.
N'Egwuregwu

Asọmpị 'Table Tennis'
Naijirịa na mba Ijipt ga anọchịte anya Afrịka n'iko asọmpi Table Tennis a ga-asọ na Japan na Nọvemba afọ a.
Ọ bụ Aruna Quadri, Olajide Omotayo, Bode Abiodun na Azeez Solanke ga-anọchite anya Naijirịa na-asọmpi a.
Arsenal ndị ọnyụpa

Ebe foto si, Getty Images
E lelịa nwa ite ọ gbọnyụọ ọkụ.
Otu a ka ndị egwu bọọlụ Sheffield United si were otu ọkpụ goolu dulaa ndị Arsenal na abalị Mọnde.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:









