Lionel Messi na Cristiano Ronaldo 'akwakọrọla pụọ' n'asọmpi Iko Mbaụwa
Akụkọ ndị dị mkpa n'ututu a
N'egwuregwu,
Messi na Ronaldo apụọla n'Iko Mbaụwa

Ebe foto si, EPA
N'egwuruegwu Lionel Messi na ogbo ya n'egwubọọlụ bụ Cristiano Ronaldo na ndị otu ha akwakọrọla ngwongwo ha pụọ n'asọmpi Iko Mbaụwa dịka Fransị gbara Argentina ọkpụ anọ asatara atọ.
Uruguay gbakwara Portugal ọkpụ abụọ asatara otu.
Sinetọ na-anọchite ọdịda anyanwu Imo steeti akatọọla bọgeti 2018

Ebe foto si, Benjamin Uwajumogu Facebookpage
Senatọ na-anọchite ọdịda anyanwu Imo steeti bụ Benjamin Uwajumogu, egosila iwe ya maka ọtụtụ ihe o kwuru ebechapụrụ na bọjeti nke 2018.
O kwuru na-ebechapụrụ ego edepụtara maka nhazi ọdọ ugbọelu dị na Akanu Ibiam nakwa ihe ndị ọzọ metụtara ndị Igbo.
Ụfọdụ ndị otu egwuregwu Nollywood akatọọla Gọvanọ Ambode

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ ndị egwuruegwu Nollywood ekwuola na achọghị nani ekpere na aka na-achị Legọsị steeti bụ Akinwunmi Ambode.
Ha kwuru na ihe ha chọrọ bụ ịkwusị ndị ọkwọ ụgbọala bu mmanu ụgbọala ịgba mgbe ndị mmadụ juputere n'ụzọ.
Ha sara Ambode asisa a ka o deputechara n'akara instagram ya etu obi si gbawa ya maka mberede okporo ụzọ lara ụgbọala iri ise na ano niyi ma gbuo mmadụ itoolu n'ụbochị tọzde gara aga.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
N'akụkọ mba ofesi

Ebe foto si, Getty Images
A ga-ebido mbinye aka n'akwụkwọ ị chọta onye ga-anọ n'ọkwa onyeisiala, ndị omeiwu nakwa okpuru ọchịchị na mba Mexico .
Cheta na-enwere ezigbo mwakpo mgbe a na-akwado mbinyeaka a ga-eme taa.
Egbuola ihe ruru mmadụ otu nari na iri atọ kamgbe e bidoro ya bụ mwakpo.
Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a
Ihe nkiri nke taa











