Sheffield United vs Arsenal FC: Anụmanụ Arsenal che na egbe ha ga-agbagbu eriela ha

Sheffield emeriela ndị Arsenal

Ebe foto si, Getty Images

Sheffield egosila na elelie nwa ite, ọ menyụọ ọkụ.

Arsenal bidoro icha ndị sheffield ọkụ dịka asọmpị a bidoro mana ha amaghị na ogbu oge nwere 'Plans'.

Ọ bụ na nkeji iri na atọ ka Lys Mousset nke Sheffield sụkara netị ndị Arsenal.

Arsenal chọrọ goolu ọnwụ-ọnwụ nke mere ka Bukayo Saka chọrọ i ji aghụghọ nweta Penaltị ma ogbuu bọọlụ hụru arụrala ya were kadị odo odo saa ya ahụ.

Arsenal gbalịrị ike ha ma ndị otu Sheffield ji gwongworo dọchie ọnụ postu ha.

Ka ọ dị ụgbụ a, ndị Arsenal ji akara atọ aga ndị Sheffield kama ha etufuola ohere i so na otu anọ kachasị.

Mmeri a bụ mmerị kacha daa ụda ndị Sheffield meriri kamgbe ha lahachịrị na Premiership.

Sheffield bụzị ndị nke itolu na Premiership dịka ha jị akara anọ agbanagharị ị pụ na Premiership.

Mana otu ihe doro anya bụ na ndị nkwado otu bọolụ Sheffield ka eme ezigbo mmemme taa.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasị gị

Aha onyonyo, Onitsha fire: "Ụlọ m na 'shọp' m gbara ọkụ, ebe ka m ga-agbaje?