Ukraine tension: Joe Biden agwala ndị America nọ na Ukraine ka ha rie mbombo ọsọ

Russia na agha Ukraine

Ebe foto si, AFP VIA GETTY IMAGES

Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden agwala ụmụ Amerịka nọ na mba Ukraine ha sị ebe ahụ gbara ọsọ pụọ dịka ụjọ na Russia ga-awakpo mba ahụ na-arị elu.

Ọ dọrọ aka na ntị na ya agaghịkwa eziga ndị agha na enyemaka maka ịzọpụta onye ọbụla tọrọ na Ukraine ma ọgụ mechaa daa ebe ahụ.

O kwukwara na "ihe nwereike imebi ngwangwa ebe ahụ ka o si aga".

Russia ka na-egosi ike na o nweghị mgbe ha bụ n'obi ibuso Ukraine agha, n'agbanyeghị na ha ekposala ndị agha karịrị otu puku narị n'okeala ha na Ukraine.

Mana ha na Belarus amalitekwala ọzụzụ ndị agha, ebe Ukraine na-ekwu na Russia anọchiela ụzọ okeosimiri ha.

Russia ekwuola na ya ga-agba mbọ ịhụ na ndị agbataobi ya bụ ndị sobu na Soviet Union abaghị North Atlantic Treaty Organization (NATO) na-ebuso ha agha.

Onyeisiala mba UK bụ Boris Johnson ekwubuola na Tọzde, Febrụwarị 10, 2022, na nke a bụ nnukwu ọnwụnwa kacharala dakwasa ndị Briten kemgbe eri.

Ụlọọrụ n'Amerịka na ahụ maka mba ofesi bụ US State Department agwala ndị be ha nọ na Ukraine ka ha were ọsọ were ije buru ngwongwo ha pụọ ebe ahụ maka ihe nwereike ime.

Biden kwuru na NBC news, "Ụmụ Amerịka kwara lii".

Ndị anyị na ha na-eme ihe bụ ndị agha kacha nnukwu n'ụwa. Nke a abụghị egwu ụmụaka o. Ihe nwereike imebi ngwangwa".

Mgbe a jụrụ ya ma o nwere ihe nwereike ime ka o ziga ndị agha ịzọpụta ụmụ Amerịka n'ebe ahụ, Biden zara "O nweghị. Mgbe Amerịka na Russia malitere ịkwakọrịtara mgbọ, nke ahụ bụ agha mbaụwa. Ụwa anyị nọ ugbua abụghịzị nke ochie".

Ndị isi mbaụwa ka na-agbakwa mbọ ịhụ na nsogbu a na-achọ ịdapụta n'Ukraine dajụrụ.

Ụbọchi Tọzde, Russia na Ukraine apụtala kwuo na ha enweghi ike ikpezi okwu na-esere bụ nke ndị France na Germany gara ikpeziri ha ya bụ okwu dapụtaara ha na ọnwụwa anyanwụ mba Ukraine.

Okwu a mailtere afọ asatọ gara aga mgbe Russia wakporo Crimea dị na Ukraine.