Russia and Ukraine conflict 2022: Elon Musk ezigala SpaceX Ukraine dịka Rọshịa mebiri intaneti ha

Elon Musk

Ebe foto si, Reuters

Ide ego bụ Elon Musk ekwuola na ụlọọrụ ya bụ Starlink ezigala "broadband" n'Ukraine inyere ha aka maka intaneti ha ndị Rọshịa mebiri.

Elon Musk sịkwa na ya ga-emekwa ka SpaceX ruo ndị Ọwụwa anyanwụ Uropu aka bụ ndị Rọshịa mebiri ọbanzikọrịta ozi ha.

Ọ dere n'akara Twitter ya sị na, "ọrụ ndị Starlink kwụchim ugbua n'Ukraine. Ọzọ ka na-abịakwa".

Ọ dere nke a na nzaghachi okwu otu onye ọrụ gọọmentị mba Ukraine bụ onye rịọrọ ya ka o gwa ụlọọrụ Starlink ka ọ nyere ha aka.

Praịm Mịnịsta mba Ukraine bụ Mykhailo Fedorov dere sị @elonmusk, dịka ị na-achọ ibi na Mars - lekwa na Rọshịa na-achọ ịkpakọrọ Ukriane! Dịka ụgbọelụ rọketị gị na-achọ ịwuchi n'igwe, - rọketị ndị Rọshịa egbuchalla ndị mmadụ n'Ukraine".

Ọnyanwaudude bụ ịntanetị etipiala n'Ukraine, ọkacha n'ọwụwa anyanwụ nakwa ndịda ya.

Ndị kpọrọ onwe ha Internet Monsters kwuru ụbọchị Satọde na ọ bụ na mpaghara ebe ahụ ka agha kacha njọ.

Ọ bụ eziokwu na itinye "satellite" n'igwe abụghị egwụ achị ụtaba n'aka agba, onwereike ịme ka ịntanetị rụọ imerime obodo niile.

Onwekwaraike ịnye aka mgbe oke ikuku maọbụ ihe mberede ndị ọzọ mebiri ịntaneti.

Musk kwuru na ụlọọrụ SpaceX nwere "satellite" ruru 1,469 na-arụ ọrụ ka a chọrọ ma nwekwa 272 ọzọ ga-abanye n'ọrụ mgbe adịghị anya.

Nke a na-eme ka Moscow ji ogbuigwe na-ebuso Ukraine agha na mpaghara niile nke gụnyere Kyiv.