Ukraine Crisis: Etu mụ na ezinaụlọ m si gbapụ 'n Ukraine - Obi Ojimadu
Dịka Russia na-awakpo Ukraine ugbua, ọtụtụ ndị mmadụ nke gụnyere ndị mbịarambịara ndị ọzọ agbala ọsọ ndụ ha gbapụ ebe ahụ ma gbaga mba ndị agbataobi ha dịka mba Poland na mba Hungary.
Otu nwafọ Naịjirịa bụ Obi Ojimadu kọwara BBC Igbo etu si kwuru na mba Ukraine tupu ọ gbapụ ọsọ ndụ ya.
Ka o si kwuo, ya na ezinụlọ ya nọ Hungary ugbua.
Ojimadu kwuru na ya na ezinaụlọ ya ebịela n’Ukraine gafee afọ iri na isii dịka ụlọọrụ ya nakwa ebe ahịa ya niile nọ ya bụ mba.
O kwuru na agha a malitere etu ha atụghị anya ma kọwa na mba Russia turu ọtụtụ ogbunigwe na Ukraine nke mere ndị mmadụ ji gbapụ n’ike ebe ahụ.
Mkparịtaụka Ojimadu na BBC rutụrụ aka na mbọ ngalana na-ahụ maka mba na mba nke Naịjirịa na-agba ihu na ndị Naịjirịa tọọrọ na mba Ukraine lọgachitere n'udo.
Ministri na-ahụ maka mba na mba nke Naịjirịa ekwuola na ha ga-amalite n'ụbọchị Wenzde ibubata ndị Naịjirịa mmadụ puku abụọ nọ n'Ukraine dịka Russia na-awakpo mba ahụ/. Ha kwukwara na ndị a ga-abata Naịjirịa kpọmkwem n'ụbọchị Tọọzde
Kirie ihe onyoonyo a ka ịhụ etu ihe siri kwụrụ nye ndị na-agba ọsọ ndụ ha.
