Russia and Ukraine conflict: Ihe ị kwesịrị ịma maka Volodymyr Zelensky ụwa kpụ n’ọnụ ugbua

Ebe foto si, Reuters
Aha Zelensky bụ aha ụwa kpu n'ọnụ dịka Russia na-awakpoo mba Ukraine, kedụ ihe ima maka ya?
Volodymyr Zelensky dị afọ 44 bụ onyeisiala mba Ukraine.
O banyere n'oche ọchịchị mba n'ọnwa Mee nke afọ 2019.
O mere ọtụtụ ihe ejije n'oge gara aga nke gụnyere "Servant of the People" nke mechara bụrụ aha pati o ji nwete mmeri na ntuliaka onyeisiala mba ahụ.
Na mbido, Zelensky enweghi atụmatụ ịzọ ọkwa Onyeisiala ma fọdụzie inwete mmeri.
Ugbua anya ụwa niile na-ele ya dịka ihe ọbụla o kwuru maọbụ mee nwereike ịsụnye ọkụ n'ọgbaghara nọ n'etiti mba Ukraine na mba Russia.
Agwa ya egosila na ọ bụghịkwanụ mmanwụ a na-akwa aka dịka ọrụ ya ugbua gụnyere ịzụta obi ọtụtụ mba ndị ga-adọnyere ya ukwu n'oge agha na-ada, idaju ụjọ ji ndị mba ya nakwa ịchọ ụzọ ọ nwereike isi belata ihe a na-eme na mba Ukraine.

Kedụ Ihe Volodymyr Zelensky nọbụ na-eme tupu ndọrọndọrọ ọchịchị akpọrọ ya?
A mụrụ Zelensky n'obodo Kryvyi Rih n'afọ 1978, nne na nna ya bụ ndị Juu nke bụ ya na onwe ya bụ onye Juu.
Ọ natara ọzụzụ ịbụ onye ọkaiwu na mahadaum Kyiv National Economic University mana ọ hapụrụ ụzọ ahụ banye ụzọ ikpa ndị mmadụ ọchị.
Mgbe ọ ka bụ nwaokorobịa, o sonyere mee ọtụtụ asọmpị ịkpa ọchị n'ihe onyoonyo nke mere ya ndị ogbo ya jiri mepee ụlọọrụ ebe a na-akpa ndị mmadụ ọchị na obi ọma akpọrọ Kvartal 95.
Ụlọọrụ ya mere ọtụtụ ejije nke gụnyere ụfọdụ o meere ngalaba magbasazi nke 1 + 1.
Ihor Kolomoisky bụ onye ọgaranye mba ahụ nwee ụlọọrụ 1 + 1 mechara bụrụ otu onye nwere agba kwadoro Zelensky na mmasị ya ịzọta ọkwa onyeisiala mba Ukraine n'afọ 2019.

Etu Zelensky si nwete mmeri
N'afọ 2014 mgbe ọgbaghara dapụtara na mba Ukraine, Zelensky ka nọ na-eme ejije.
Otu ejije o mere mgbe ahụ mechara pụta n'afọ 2015 bụ "Servant of the People".
Servant of the People mechakwara bụrụ aha otu pati ya nke pụtara "Odibo ọha niile"
Ọgbaghara a so ọtụtụ ngagharịiwe dapụtara na mba ahụ mere a chutuo onye bụbu onyeisiala ha bụ Viktor Yanukovych n'ọkwa oche ya.
Otu n'ime ihe ịkwesiri ima maka Yanukovych bụ na ọ kwadoro mba Russia.
Mgbe a chuturu ya n'oche, Russia ji iwe jibodo mpaghara Crimea ma malite ikwado ndị otu na-achọ nwereonwe na mba Ukraine.
Otu ndị a jupụtara n'Ọwụwa Anyanwụ mba ahụ.
Ihe a so na ihe kpara ọgbaghara nọ n'etiti Ukraine na Russia ugbua.
Cheta na Zelensky meriri Petro Poroshenko bụ onye bụbu onyeisiala mba ahụ na ntuliaka ma mecha bụrụ onyeisisala mba ahụ nke isii.
N'oge achụmnta vootu, Petro Poroshenko kwara Zelensky emo nke ukwu ma kwuo na ọ gaghi achita aja n'ihi na ọ bụ onye na-akpa ndị mmadụ ọchị ma bụrụ onye na-enweghi ihe ọma banyere ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ebe foto si, EPA
Etu nsogbu Zelensky na Russia si malite n'uju
N'oge achụmnta vootu maka ntuliaka ọkwa onyeisiala, Zelensky kwere nkwa na ọ ga-adaju ọgbaghara na-ada n'Ọwụwa Anyanwụ mba Ukraine.
Mgbe ọ malitere ịchị, mbọ ndị ọgbara maka nke a mere ke ihe ruru mmadụ 14,000 nwụọ dịka ọtụtụ ọgbaghara dapụtara ebe ahụ.
Na mbụ, ya na ndị isi mba Russia nwere mkparịtaụka kwa mgbe kwa mgbe banyere nkwado Russia na-enye ndị a.
O bipụtara atụmatụ ikpe udo nke a kpọrọ "Minsk agreements" mana nke a achitaghi aja mancha.
Onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin malitere inye ndị bi na mpaghara ahụ akwụkwọ njem nke mba ya nke bụ na ọ nabataghi mkpesa Minsk agreements.
Mba abụọ a kpebiri ịkwụsị ibuso onwe ha agha n'ọnwa Julaị nke afọ 2020 mana obere esemokwu gara n'ihu dị n'etiti ha abụọ.

Ebe foto si, Tass/Getty Images
Kedụ ka agha na-ada ugbua si malite?
Dịka mba abụọ nọ n'esemokwu, ihe gbara ọkpụrụkp tinyere ọkụ n'esemokwu nọ n'etiti ha ugbua bụ na Zelensky kwupụtara atụmatụ ya ibanye otu jịkọrọ ụfọdụ mba n'Europe akpọrọ North Atlantic Treaty Organization (Nato).
Atụmatụ a bụ nke Russia akwadoghi n'ihi Onyeisiala Putin kwuru na Ukraine isonye Nato ga-emetụta nchekwa mba nke ya.
Marakwa na Ukraine na Russia bụ ndị agbataobi. Ya bụ, ihe ọbụla Ukraine mere nwereike ịmetụta Russia.
Ụjọ Putin bụ na Ukraine bụ enyị mba ndị ofesi na-abụghị ndị enyi ya dịka mba Amerịka, mba Briten, Mba France wdgz.
Mba ndị Nato so na mba ndị ya na Putin anaghi akpakọ.
Ugbua, Zelensky onye nọbụ na-eme ejije nakwa na-akpa ndị mmadụ ọchị site n'ihe onyoonyo abụrụla onye Russia na-awakpo mba ya maka mmasị ya isonye Nato.












