Ọtụtụ ndị mmadụ ga-anwụ ma Russia wakpoo Ukraine - Joe Biden

Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden
Nkọwa foto, Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden

Onyeisiala mba Amerịka emeela ihe onyonyo ebe o kwuru na mba Russia ka nwereike iwakpo mba Ukraine oge ọbụla ma sị na ọtụtụ ndị mmadụ ga-anwụ ma ya bụ mwakpo mee.

O kwuru sị, "mwakpo ọbụla e mere mba bụ otu North Atlantic Treaty Organization (NATO) bụ mwakpo mee mba ndị niile nọ na NATO".

Biden kwuru na mba Russia akpọkọtala ndị agha ha ruru puku otu narị na iri ise n'oke ala mba Ukraine.

N'aka nke ọzọ ka Minista nchekwa obodo mba Russia na-ekwu na ụfọdụ ndị agha ha ahapụwala okeala mba Ukraine.

Mana Biden kwuru sị, "Russia wepụ ndị agha ha ọ ga-adị mma, mana anyị enweghị ike ikwu ma ọ bụ eziokwu. Ndị nnyocha anyị na-ekwu na ọnọdụ ndị agha Russia n'okeala mba Ukraine ka nyere ha ohere iwakpo mba ahụ".

Mịnịsta agụmakwụkwọ mba Kenya achọghị ka ụmụakwụkwọ ndị 'Gay' biri n'ụlọ akwụkwọ

Ndị na-eme ngagharịiwe maka ikike dịiri onye

Ebe foto si, AFP

Mịnịsta agụm akwụkwọ mba Kenya bụ George Magoha ekwuola na ụmụ akwụkwọ nwoke na edina nwoke ibe ha maọbụ nwaanyị na-edina nwaanyị ibe ndị nke na-emegide ikike dịịrị ụmụ akwụkwọ ibe ha ekwesịghị ibi n'ụlọ akwụkwọ.

Magoha kọwara na nke a ga-enye nne na nna ụmụ akwụkwọ ndị a ohere ịleta ụmụ ha anya nke ọma.

Ụfọdụ ndị mba Kenya na-ekwu na ihe Magoha kwuru na-egosdi ịkpa oke ebe ndị ọzọ dọnyere ya ukwu.

Cheta na ụfọdụ ndị mere ngagharịiwe na mba Kenya mgbe Magoha kwuru na ụmụakwụkwọ ndị dị otu a kwesịrị ịga akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ dị nso ebe ha bi.