O doro anyị anya na Russia na-akwado ịwakpo Ukraine nke taa nke echi - Boris Johnson

Boris Johnson na Vladmir Putin

Ebe foto si, Getty Images

Boris Johnson, bụ onyeisi gọọmentị mba United Kingdom, ekwuola na ha ma nke ọma na Russia na-atụ atụmatụ ịwakpo mba Ukraine n'oge adịghị anya.

Johnson kwuru nke a oge o mere njem gaa mba Scotland, ma kpọọ oku ka mba Russia ghara ime nke a.

"Anyị ahụla ihe akaebe doro anya gosiri na Russia na-akwado ịwakpo Ukraine," Johnson kwuru.

"Ihe niile anyị hụrụla gosiri n'ezie na ha na-akwadosi nke a ike."

"Ọnọdụ a jọgburu onwe ya na njọ ma sikwaa nnukwu ike, mana oge ka dịịrị Onyeisiala Vladmir Putin ịkwụsị mwakpo a."

Cheta na gọọmentị mba UK agwala ndị mba ha niile nọ na Ukraine ka ha si na mba ahụ pụọ n'ihi ụjọ na Russia nwere ike ibuso mba ahụ agha.

N'ụbọchị Sọnde, ụlọọrụ ụgbọelu KLM kwuru na agaghịzị na-aga mba Ukraine.

Ka ọ dị ugbua, mba Russia akpọkọọla ndị agha ha ruru 100,000 dobe ha na nso okeala ha na Ukraine.

Ndị agha Russuia karịrị 30,000 nọkwa na-eme nkwado ọgụ na mba Belarus, n'agbanyeghị na Russia kwuru na ha achọghị ịwakpo Ukraine.

Onyeisiala mba Germany bụ Olaf Scholz na Vladmir Putin ga-enwe nzukọ n'ụbọchị Tuzde, Febrụwarị 15, iji kpaa etu a ga-esi mee ka udo chịa.

Isi sekpụ ntị n'esemokwu a bụ na Russia achọghị ka a nabata Ukraine n'otu NATO, nke bụ otu jikọrọ ndị agha mba niile dị na Europe.

Mana ọtụtụ mba Europe ndị ọzọ akwadoghị ihe Russia na-ekwu. Ha ekwuola na ha ga-enye mba Russia ntaramahụhụ siri ike ma ha wakpoo Ukraine.