Boris Johnson news: Ọ rịọla mgbaghara

Boris Johnson kwuru na ọ chọrọ ịrịọ mgbaghara
Nkọwa foto, Boris Johnson kwuru na ọ chọrọ ịrịọ mgbaghara ka Sue Gray biputachara akwụkwọ etu o si rie mperi

Boris Johnson bụ Praịm Minista mba Briten arịọla mgbaghara maka oringo a gbara na 10 Downing Street bụ ụlọọrụ ya, n'oge a machiri ọgbakọ n'ihi ọrịa covid-19, n'afọ 2020.

O kwuru sị "Gbaghara m maka ihe ndị anyị emeghị ọfụma na etu anyị si so okwu a".

Johnson gara n'ihu kwuo na ọ ga-ahụ na agbanwere ụfọdụ ihe n'etu e si arụ ọrụ na Downing Street nakwa Cabinet Office.

O kwuru na ọ ga-eme nke a ka e nwee ike rụrụ ọrụ gọọmentị gaa n'ihu.

O kwuru na ọ ga-ekewapụta "ụlọọrụ nke Praịm Minista", ma kwuo na oge eruola iṅogharị iwu na-echekwa ndị ọrụ oyibo.

Ọ sị "Aghọtara m, m ga-emezi ya".

Mbiputa akwụkwọ ihe mere na 10 Downing Street

Sue Gray bụ onye ọrụ na 10 Downing Street biputara nnyocha o mere maka emume 16 e mere n'ụlọọrụ ahụ na ụlọọrụ gọọmentị ndị ọzọ n'ime ọnwa 20, mgbe mba ahụ nọ na mmachi ọgbakọ.

N'ime 16 ahụ, ndị uweojii na-enyocha 12 - mere n'ụbọchị asatọ dị iche iche - maka ịda iwu covid-19.

Mana ndị uweojii gwara Gray ka ọ ghara ikwupute ihe niile mere dịka ha na-eme nnyocha, ha sị na ọ ga-eme ka ịjụ ndị mmadụ ihe mere ụbọchị oringo ahụ ratu ahụ, na ha ga-achọ ka ndị mmadụ "nwee ike ịkọ ihe ha chetara n'onwe nke ha".

Ọnụ na-ekwuru Johnson biputere akwụkwọ ebe o kwuru na ọ ga-ebiputa ihe Gray kwuru n'uju.

O kwuru sị "Ekwesịghị ime mkpebi n'okwu a ka na-eme nnyocha na ya, ebe Praịm Minista gbadoro anya ugbua bụ n'ikwu okwu gbasara ihe niile a ga-achọpụta."

Johnson ekwebughi ekwu ebe ọ kwụ n'okwu ibiputa akwụkwọ ahụ oge a jụrụ ya n'ụlọomeiwu, mana o kwugharịrị ọnụ ya mgbe ọ pụrụ.

Cheta na ndị uweojii kwuru taa na nnyocha ha agaghị akarị otu afọ, mana ha ekwughi kpọm kwem mgbe ha ga-emecha ya bụ nnyocha.

Boris Johnson zarala ọnụ ya n'ụbọchị Wenezde, Jenụwarị 26

Boris Johnson ekwuola na ọ ga-azara ọnụ ya ma mpụtara nnyocha ndị uweojii mere n'isi ya ruo ndị omeiwu aka
Nkọwa foto, Boris Johnson ekwuola na ọ ga-azara ọnụ ya ma mpụtara nnyocha ndị uweojii mere n'isi ya ruo ndị omeiwu aka

Ndị mmadụ chịbu obi n'aka dịka a nọ na-eche mpụtara nnyocha ngalaba uweojii pụrụiche na mba Briten a na-akpọ "Met" mere maka okwu nọ n'isi Johnson.

Ụlọomeiwu mba ahụ kpọrọ Johnson oku ka o zara ọnụ ya dịka a nọ na-eche ya bụ akwụkwọ mpụtara so nnyocha a e mere n'ụbọchị Wenezde, Jenụwarị 26.

Otu onye omeiwu nke otu pati ndị "Conservative" aha ya bụ Robert Halfon ekwuola na ya enweghizi ndịdị n'okwu a.

N'okwu ya, o kwuru "Anyị ekwesighị iche nnyocha ndị uweojii ịma na ihe a Boris Johnson mere ezighi ezi"

Ọ gara n'ihu kwuo: "Onye nọ n'ọkwa Johnson nọ na ya ekwesighi ịkpa agwa dị etu a"

Cheta na a na-atụ Johnson aka maka okwu na ọ dara iwu nchekwa ọrịa Covid-19 mba Briten dịka ọ gbara ama na ọ gara emume oringo e mere na "10 Downing street" mba ahụ mgbe iwu megidere ọgbakọ ndị mmadụ.

Boris Johnson

Ebe foto si, Reuters

Gịnị ka anyị ma maka okwu a n'oge gara aga?

Johnson kọwara n'izu abụọ gara aga ụfọdụ ihe gbasara nnyocha a na-eme dịka ọ pụtara ihe na e mere emume ụbọchị ncheta ọmụmụ ya n'oge iwu gọọmentị megidere ọgbakọ karịrị mmadụ abụọ.

Ọ bụ n'ọnwa Jun afọ 2020 oge etinyere mmachị maka ọrịa covid-19 ka ndị ọrụ obi gọọmentị mba Briten gbakọrọ mere ya emume ncheta ọmụmụ ya.

Ndị ntaakụkọ ITV News kwuru na mmadụ iri atọ bịara ya bụ emume ma gụọrọ Johnson egwu ma taa kwa achịcha bekee.

Boris Johnson

Ebe foto si, PA Media

Ndị ọrụ gọọmentị kama na-ekwu na ọ bụ obere oge ka ha gbakọrọ ma kwuo na Boris Johnson anọghị karịa nkeji iri.

Kama ụfọdụ ndị omeiwu na-agbarụ ihu maka emume a.

Ebubo ọzọ ndị omeiwu Briten na-ebo Praịm Mịnịsta Boris Johnson

A na-ebo Boris Johnson ebubo na ọrafụrụ ndị mmadụ na ndị ọrụ omeiwu maka mmemme a ọ mere nke megidere iwu covid-19.

Okwu akpụ n'ọnụ bụ oringo ọ mere na 10 Downing street oge mmachị ọgbakọ na ngagharị maka Covid-19.

Dịka ọ dị ugbua, ọbụghị naanị ndị patị na anọghị n'ọchịchị na-ekwu ka ọ rituo dịka Praịm Mịnịsta, ụfọdụ ndị otu ya egosipụtala na ọbi adịghị ha mma ebe ọchịchị Johnson nọ.

Ndị dịka ndị Omeiwu Conservative na-akwado itinye akwụkwọ gosiri na ha ekwenyeghị n'ọchịchị Johnson dịka ha nwechara mkparịtaụka na Tuzde.

Ihe ọzọ kwa na-echu Boris Johnson ụra bụ nyocha maka ego ole omefuru mgbe ọ rụzigharịrị ebe obibi Praịm Mịnịsta.

Ihe ị kwesịrị ima maka emume a tinyere Boris Johnson na nsogbu

A họpụtala Boris Johnson ka Praim Minista Briten ọhụrụ

Ebe foto si, @BorisJohnsonTwitter

Ọ bụ n'oge udu mmiri afọ 2020 oge mmachị ngagharị covid-19 ka Boris Johnson gara oringo nke onye ọbụla na-eji mmanya nke ya bịa.

Iwu machịrị ngagharị ọbụla oge ahụ maka covid-19.

Iwu machịkwara ndị mmadụ ịgbakọ eme emume ọbụla

Ihe dịka mmadụ iri atọ bịara ya bụ mmemme emere n'obi Praịm Mịnịsta bụ Downing Street.

Foto ọzọ gosikwara Boris Johnson n'ọnwa Mei afọ 2020 ebe ya na ndị ọrụ gọọmentị ọzọ ji mmanya ọkụ na ihe egwuregwu Chess.

Mgbe ajụrụ ya maka nke a oge ahụ, ọ sị na ọ bụ ndị ọrụ mere nzụkọ na ọ bụghị emume.

Ihe Boris Johnson kwuru maka ebubo ndị a

Boris Johnson

Ebe foto si, Reuters

  • Boris Johnson kwuru na o chere na ọ bụ ihe gbasara ọrụ na ọ maghị na ọ bụ emume.
  • O kwuru na o mejọrọ mgbe ọ gwaghị ndị gbakọrọ ka ha laa.
  • Boris Johnson kwuru na ọ bụ nkeji iri abụọ na ise ka ọ nọrọ n'emume ahụ
  • Ọ rịọla mgbahara n'aka ndị omeiwu na ndị mmadụ na-enweghị ike ịhụ ezinụlọ ha na ndị enyi ha maka mmachi Covid-19.

Usoro enwereike iji chụpụ Boris Johnson dịka Praịm Mịnịsta mba Briten.

Boris Johnson

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Boris Johnson sobụ na ndị chọrọ ka Briten si Yurope pụọ

Ndị omeiwu nwereike ịchụpụ Boris Johnson dịka Praịm Mịnịsta Briten.

Ọ bụru na ndị omeiwu ruru iri ise na anọ si na patị Boris Johnson tinye akwụkwọ na ha akwadoghị ọchịchị ya, nke a ga-eme ka e nwee ntụlịaka iji gosi ma ha enwere ntụkwasị obi n'ebe ọchịchị Boris Johnson nọ ka ọ bụ na ha enweghị.

Ọ bụrụ na omerịghị, a ga-eme ntụliaka maka ọkwa Praịm Mịnịsta.

Naanị ndị omeiwu ruru asaa tinyerela akwụkwọ mana otu onye omeiwu gwara BBC na ọ na-eche na ha eruwela ogo ọ ga-ewe iji hụ na enwere ya bụ ntuliaka gbasara onye na-achịnụ.

Onye omeiwu ọzọ kwuru na enweela nkwekọrịta ugbua na ntuliaka gbasara onye na-achị mba Briten ga-abịa ọsịsọ karịa etu ndị mmadụ si eche.

Dịka ọ dị ugbua, ọ bụ naanị omeiwu Sir Graham Brady bụ onyeisi "Conservative backbenchers 1922 committee", na-agụkọ vootu maka nkwado Boris Johnson dịka Praịm Mịnịsta Briten ga-ama ọnụọgụ ndị omeiwu tinyerela akwụkwọ.

Ọtụtụ ndị omeiwu Conservatives ekwuola na ha na-eche ka Sue Gray mechaa nchịkọta nyocha ya maka oringo mere na 10 Downing tupu ha a mara ihe ha ga-eme.

Gịnị ka i kwesịrị ịma maka Boris Johnson

Boris Johnson

Ebe foto si, AFP

Boris Johnson banyere ọchịchị dịka Praịm Mịnịsta mba Briten.

Ọ narala ọchịchị n'aka Theresa May n'ụbọchị iri abụọ na anọ n'ọnwa Julaị n'afọ 2019.

Theresa May
Nkọwa foto, Theresa May, onye bụbu Praịm Minista Briten

Praịm Mịnịsta na mba Briten bụ onyeisi gọọmentị Eze nwaanyị na-ahụ maka ọchịchị gọọmentị mba ahụ.

Tupu ọ bụrụ Praịm Mịnịsta, Johnson ruburu ọrụ dịka odee akwụkwọ mba Briten site n'ọnwa Julaị afọ 2016 ruo ọnwa Julaị afọ 2018.

Ọ bụ ya bụ onye omeiwu Conservative nke mpaghara Uxbridge na South Ruislip n'afọ 2015.