Ụlọọrụ onyeisi ọrụ mba UK dị na 10 Downing street, arịọla Ezenwaanyị mba ahụ mgbaghara maka oringo ha gbara

Boris Johnson

Ebe foto si, EPA

Ndị ọrụ na 10 Downing street arịọla mgbaghara n'aka Ezenwaanyị Briten maka oringo mbọmchi ha gbara n'ọnwa April afọ gara aga.

Ọnụ na-ekwuru onyeisiọrụ mba sị na "anyị kwara ngaramara maka ya bụ agwa anyị kpara ịme oriri mgbe mba a bụ anyammiri n'anya maka ọnwụ Prince Phillip".

Onyeisi gọọmentị ahụ bụ Boris Johnson esoghị na ya bụ oringo mbọmchi mana ihe e ji ata ya ụta bụ maka ịhapụ ya bụ ihe ka ọ mee mgbe a nọ ọnọdụ nnọpụche maka coronavirus.

Ya bụ awantilo ha gbara abalị abụọ na obi gọọmentị so na ihe kọmitii Sue Gray nọ n'isi ya na-etinye anya na ya.

Ka onyeisi ọrụ gọọmentị mba ahụ bụ Boris Johnson rịọchara mgbaghara, Sir Keir Starmer bụ onyeisi ndị Labour Party sị " nke a egosila ka Boris Johnson si kpụọ ugwu oche ọchịchị Prime Minister n'ala".

"Ndị Pati Conservatives akpụọla ugwu ndị Briten n'ala, ịrịọ mgbaghara abụghị naani ihe ga-egbo ya.

Boris Johnson kwesiri ịkwanyere ya onwe ya ugwu tinye akwụkwọ arụkwaghị m".

O doro anya na ya bụ arịrịọ bụ ndị ọrụ gọọmentị rịọrọ ya.

Ihe kacha kpalite ya bụ okwụ bụ foto ndị patị anọghị n'ọchịchị sere ebe Ezenwaanyị na-eru ụjụ naanị ya maka ọnwụ Duke nke Edinburgh maka nnọpụiche coronavirus ebe ndị isi ọrụ ya na-agba oringo.

Ndị pati dịka Labour pati, Liberal Democrats nakwa SNP na-akpọ oku ka Boris Johnson rituo n'ọchịchị maka agwa a mgbe ọ kwetachara na ya gara ya bụ mmeme.