Russia Ukraine war: Eji m ego m nyere ndị na-agba ọsọ ndụ na Ukraine aka - Alexander Somto

Aha onyonyo, Eji m ego m nyere ndị na-agba ọsọ ndụ na Ukraine aka - Alexander Somto

Nwa afọ Naịjiria akọwaala etu o si jiri ego nke ya na-enyere ndị na-agba ọsọ ndụ maka agha dị n'etiti mba Russia na Ukraine aka.

Alexander Somto Orah gwara BBC Igbo na o bidoro enyemaka a n'ihi na ihe ọ gabigara n'ụzọ were ya iwe.

Somto gbasara ozi na Twitter sị na onye ọbụla na-achọ enyemaka ọ ga-eji si n'okeala Ukraine gafee mba Poland kpọkuo ya, na ọ ga-eji ego nke ya nyere ha aka nwa mgbe nta ruo mgbe enyemaka mba ha rutere ha aka.

O kwuru na ụfọdụ ndị mmadụ ziteere ya ma ego ma ụgbọala iji nyere ya aka na mbọ ọ na-agba ịkpọpụ ndị mmadụ n'okeala ahụ.

Somto bi na Kyiv bụ isiobodo Ukraine tupu agha a ebido, kwuru na ha amaghị na agha a ga-ebido, na ha gaara ebido n'oge chọwa ụzọ ha.

Mara na ndị Afrịka na ụfọdụ ndị mba ọzọ gụnyere ndị India, kwuputere na a kpasoro ha oke agbụrụ dịka ha na-agba ọsọ ndụ isi na mba Ukraine gbapụ, mgbe Russia wakporo ha n'ụbọchị 24 nke ọnwa Febrụwarị, 2022.

Ihe karịrị otu nde mmadụ agbapụla na Ukraine kemgbe abalị asatọ agha a malitere.

Ọtụtụ mbaụwa anabataghị mwakpo a Russia wakporo Ukraine, nke mere ka ntaramahụhụ a kpọrọ "Sanctions" na Bekee si n'elu si n'ala na-adakwasị ha.