Nigeria news today: Ka ọkụ si wee gba transfọma ndị ụlọ ọgwụ dị n'Umuahia

Ọkụ agbaala n'akụkụ ụlọọgwụ dị n'ime World Bank Housing Estate dị n'ime Umuahia, isiobodo Abia state.
Ya bụ ọkụ malitere ịgba n'isiụtụtụ taa ka ndị hụrụ ya sị na ọ bidoro na igwe ọkụ "Transformer dị n'ime ogige ụlọọgwụ ahụ.
Ya bụ Transformer gbariri, daa ụda ka ogbunigwe bụ nke mere ka ndị mmadụ malie n'ụra.
Ọ malitere gbawa ọkụ nke rịwara elu nke mere ka ebe niile chakee n'abalị ahụ.
Ndị bi nso ebe ahụ malitere ịgbagharị chọwa otu ha ga-esi gbanyụọ ya bụ ọkụ ebe ụfọdụ kpọwara ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ (Fire Service) dị nso n'akụkọ ebe ahụ na Ikpot Ekpene Road, n'akụkụ Orpet filling station.
Ya bụ ọkụ chọwara ịba n'ụlọọgwụ ahụ na ụlọ ndị mmadụ nakwa ụlọahịa dị nso ebe ahụ.
Otu ya bụ ọkụ si agbasiike tinyere ndị bi n'akụkụ ebe ahụ na-agbagharịa nke mere ụfọdị ji bupuwa ngwongwo ha n'ụzọ.
Ụfọdụ n'ime bụ ndị ekpomọkụ dị ebe ahụ apụta ekweghị ruo nso nọpụrụ anọpụ na-akpọ enyemaka ndị ọrụ mgbanyụọkụ.
Ụjọ ekweghị ha rụọ nsọ rụọ mgbe ndị ọrụ mgbanyụọkụ bịara ka nkeji iri abụọ gachara, mgbe ahụ Igweọkụ "transformer" ahụ na eriri ya agbaala pịapịa.
Mgbe agbanyụchara ya bụ ọkụ ka otu nwoke bụ Chiemela Iroha, nwunye ya nwere ụlọahịa n'akụkụ ebe ahụ gwara BBC Igbo ka ya bụ ọkụ siri malite.
Chiemela sị na ha amaghị ihe kpalitere ya bụ ọkụ maka na ọkụ adịghị megbeya bụ ọkụ malitere gbara.
Onye ọzọ bụ Pastọ Nathaniel Barry Maduabuchi Nwosu bụ unye ji ụgbọala ya ga kpọọ ndị ọrụ mmenyụ ọkụ sị na ya bụ okụ malitere mgbe oji ọkara gafee elekere ise nke ụtụtụ site na ya bụ oke ụda sitere na ya bụ Igweọkụ "transformer".
Nwosu sị na "Ọbụrụ na-agbanyụghị ya bụ ọkụ ngwangwa, ọkaara imebi ọtụtụ ihe n'ọgbe a".
Ọ sịkwa na ọnweghị ụbọchị obụla dị n'igwe gara ka ndị ọrụ EEDC ghara ịbịa rụọ ọrụ na ya bụ Igweọkụ nke mere ya jiri rịọwa ha ka ha gbaa mbọ hụkwanụ na ha ruru ya nke ọma ka ọ ghara imebezi.
Ọ gwara ndị ọrụ EEDC ka ha kawazịa ahụ gbanwee ya bụ Igweọkụ ka ọghara igbu mmadụ.

Ụbọchị ncheta ụmụnwaanyị
Otu ụmụnwaayị pụtara n'igwe n'ihu ụlọ omeiwu nke Enugwu na Imo steeti na-arịọ ka ndị ọchịchị donyere ha ukwu n'atụmatụ ọchịchị nakwa na ibelata mmegbu ụmụnwaanyị na Naịjirịa dịka taa bụ ụbọchị ha.
Jeff Mba na-anọchịte oji riva na Enugu gwara BBC Igbo na gọọmentị steeti ahụ na-agba mbọ ịhụ na ndụ ụmụnwaayị dị mfe site na iwu nakwa atụmatụ ndị ọzọ ehibere na ya bụ Steeti.

Ebe foto si, Screenshot
Ikwe nkwụmọtọ maka Oluwabamishe ewuwala
Ndị njem na Legọs steeti jupụtara n'ụzọ dịka enweghi ndị ụgbọala bọọsụ BRT pụtara ọrụ taa bụ Tuzde.

Ebe foto si, Oluwabamise/BRT
Otu onye ọrụ ha na-achọghị ka akpọ aha ya gwara Punch na amachiri ha ọrụ nwa mgbe nta maka ọnwụ Oluwabamise Ayanwole nwata nwaanyị dị afọ 22 a tọrọ n'ụgbọala BRT ma mecha gbuo.
Liverpool na Inter Milan ga-achịpụ ya n'elekere itolu nke abalị Tuzde 8 Maachị n'egwuregwu
Liverpool na Inter Milan ga-achịpụ ya n'elekere itolu nke abalị Tuzde 8 Maachị a n'asọmpị Champions League.
A na-atụ anya na Roberto Firmino, Thiago Alcantara na Joel Matip ga-esonye n'asọmpị taa dịka ha so mee ọzụzụ nke mbụ ha kemgbe ahụ ọkụ mmerụ ahụ gbochiri ha isonye








