Insecurity in the Southeast: Ndi Igbo keenụ nkwucha maka ihe ntụmadị - ADF

Úzódínma Nwala

Ebe foto si, Úzódínma Nwala

Otu dị iche iche na-ekwuchitere ndị Igbo ọnụ ha adọọla ọha na eze aka na ntị ka ha tinye anya na mmiri ma kee nkwụcha maka ịchekwa ndụ ha ma ihe ntụmadị dapụta n'aka ndị ọchịehi.

Nke a bụ mkpebị ndị otu a n'ọgbakọ ha nwere n'Enugu ụnyahụ.

Nke a mechere ka Ohaneze ndị Igbo kpọchara ụdị oku a ụbọchị Fraịde gara aga.

Ọgbakọ a nke Ọkammụta Uzodimma Nwala kpokobara kpebiri ihe ndị a n'akwụkwọ ha binyere aka:

  • Na ha ga-ehibe kọmitii otu niile na-ekwuchitere ndị Igbo nke ọrụ ha ga a bụ ịgwa ndị Igbo niile, ọnọ n'ụzọ na ọnọ n'ama ka ihe siri kwụrụ maka nchekwa dị n'ala Igbo.
  • Ịkpọkụ ndị niile ọnụ n'eru n'ala n'ala Igbo, ndị Eze, ndị gọmenti nakwa ndị ọzọ ka ha gbaa mbọ nwee otu onu n'okwu gbasara ndị Igbo maka ọ dị mma ndị Igbo.
  • Ka ndị Igbo nọ n'ụzọ ma ọnọ n'ama gbaa mbọ sonye otu dị iche iche na-azọ maka mnwere onwe na ọ dị mma ndị Igbo.
  • Ka ndị Igbo na ọgbakọ agbụrụ ndị ọzọ chọọ ezi mmekọ maka nchekwa zuru oke n'aka ndị na-ebu agha ọkwụkwe alakụba.
  • Ka ndị Igbo na-akwado "akụ rụọ ụlọ" mgbe niile site na ọgbakọ ụmụnna na nke obodo.

Ndị tinyere aka n'akwụkwọ a bụ Pof Uzodinma Nwala nke ADF; Chief Emeka Diwe, President Association of South East Town Unions; Professor Elochukwu Amucheazi, Secretary, Igbo Leaders of Thought;

Innocent Amadi of Bilie Human Rights Initiative; Hon Abia Onyike, chairman ADF publicity bureau; Prof. Math Aniekwu, secretary, ADF; Oriakụ Fidelis Chukwu, President Igbo Women Assembly; Prince Tony

Nwakaeze, Ọgbakọ Igbo Traders of Nigeria; Isaac Onyia, ASETU Enugu state na Comrade Uchenna Madu bụ onye nọchite anya Coalition of Pro-Biafra Organizations."

Lee ihe nkiri anyị

Aha onyonyo, Ụmụ Obiligbo: Anyị ejeghị nga na mba ofesi, ọ bụ asịrị

Akụkọ ga-amasị gị