Surrogacy in Nigeria: Ihe mere m jiri kwe ka nwaanyị ọzọ mụọrọ m ụmụejima
Otu nwada bụ Judith Akinwunmi akọwaala ihe mere ya na di ya jiri nwee nkwekọrịta ka nwaanyị ọzọ tụrụ ime ma mụọrọ ha ụmụ ejima site n'atụmatụ a kpọrọ 'surrogacy'.
Nwada a sị na o nwere nsogbu ịtụrụ ime nakwa ime ọpụpụ n'ihi ọrịa a kpọrọ 'lupus' nke na-arịa ya.
Ọ sị na ime ọpụpụ ahụ mere ya ihe dịka ugboro asatọ nke mere di mbụ ọ lụrụ bụ onye karịrịla afọ iri anọ jiri gbaa ya alụkwaghịm.
Akinwunmi sị na o mechara lụọ di ọzọ bụ onye maara ọnọdụ ya ma kwee nkwa ịkwado ya n'ụzọ ọbụla iji hụụ na ha nwetere nwa.
N'okwu ya "dịka m na-akpagharị na-achọ etu m ga-esi nwete nwa, ahụrụ m akwụkwọ ozi banyere atụmatụ 'surrogacy' ya bụ ime ka nwaanyị ọzọ mụọrọ gị nwa."
"Emere m nnyocha ma chọpụta ụlọọgwụ aka anyị ruru iji mee ya bụ 'surrogacy' ma malite ịchọ nwaanyị ga-atụrụ ime mụọrọ anyị nwa".
"Nwaanyị mbụ m chọtara ekweteghi n'ihe anyị kwuru mana nwaanyị nke atọ mechara kwete ma tụrụ ime mụọrọ anyị agadaga ụmụejima abụọ".
Akinwunmi gara n'ihu kwuo na ihe mere ọtụtụ ụmụnwaanyị anaghị ekwe ekwupụta na nwaanyị ọzọ mụụrụ ha nwa bụ maka ọnụ ndị mmadụ ga-akọ ha, ọkachasị na Naịjirịa.
Ọ sị na ihe mere o ji ekwu nke ya bụ n'ihi ihe ọ gabigarala na ndụ ya, tinyekwara na ọ chọrọ iji ịkpalite mmụọ ezinaụlọ nwereịke ịhụta onwe ha n'ọnọdụ a.
"Ihe bụ obi ụtọ m bụ ịhụ ka ụmụaka m na-akpagharị," Akinwumi kwuru.
Gịnị bụ Surrogacy?

Ebe foto si, Getty Images
'Surrogacy' bụ usoro sayensị bụ ọgbaraigbogharịị, nke na-eme ka nwaanyị ọzọ buoro nwaanyị ọzọ afọ ime ma mụọrọ ya nwa.
Nwaanyị na-adị ime ma ọ bụrụ na ughe nwoke (sperm) na akwa nwaanyị (ovary) bịakọọ ọnụ ma ghọọ ihe bekee kpọrọ 'embryo' nke bụ mmadụ.
Nke a na-emekarị ma ọ bụrụ na nwaanyị nọ n'oge iyipụta akwa na nwoke ughe ya zuru oke nwee mmekọ ahụ.
E nwekwara usoro sayensị nke e nwereike iji wepụta akwa nwaanyị, wetakwa ughe nwoke, mekọọ ha ọnụ n'usoro sayensị, na-enweghị mmekọ ọbụla.
Mana n'usoro 'surrogacy', ọ bụrụ na e jikọọ ughe nwoke na akwa nwaanyị ọnụ, a ga-etinyezi 'embryo' ahụ n'afọ nwaanyị ọzọ, onye ga-ebu afọ ime ahụ ma mụọ ya ma oge ruo.
Nwaanyị a buru afọ ime ahụ abụghị nne nwa ahụ o bu n'afọ, n'ihi na ọ bụghị akwa ya ka ụmụaka ahụ si pụta.
Ndị bụ nne na nna nwa ahụ bụ nwaanyị na nwoke e jikọrọ akwa na ughe ha iji mee ka nwa pụta.
'Surrogacy' abụghị ihe a na-ahụ kwadaa na mpaghara Afrịka, mana ọ bụghịzi ihe ọhụrụ na mba ofesi.
Kirie ihe o kwuru n'uju.
Uche Akolisa mere akụkọ a, ebe Vining Ogu sere onyonyo

